Mkpughe E Kpugheere Jọn 11:1-19

  • Ndị àmà abụọ ndị buru amụma (1-13)

    • Ndị amụma ga-eyi ákwà iru uju buo amụma ụbọchị 1,260 (3)

    • A ga-egbu ndị amụma, a gaghịkwa eli ha (7-10)

    • Ụbọchị atọ na ọkara gafee, Chineke ga-akpọlite ndị amụma n’ọnwụ (11, 12)

  • Ahụhụ nke abụọ agafeela, ahụhụ nke atọ ga-abịakwa (14)

  • A fụrụ opi nke asaa (15-19)

    • Alaeze nke Chineke na nke Kraịst ya (15)

    • Chineke ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa (18)

11  E nyere m okporo ahịhịa amị nke yiri mkpara,*+ sịkwa m: “Bilie, tụọ ebe nsọ nke ụlọ nsọ Chineke na ebe ịchụàjà ya, gụọkwa ndị nọ n’ime ya na-efe Chineke ọnụ.  Ma hapụ ogige nke dị n’èzí ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ. Atụkwala ya atụ̀, n’ihi na e nyela ya ndị mba ọzọ. Ha ga-azọkwasịkwa obodo nsọ+ ụkwụ ruo ọnwa iri anọ na abụọ.+  M ga-emekwa ka ndị àmà m abụọ yiri ákwà iru uju buo amụma ruo otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii (1,260).”  Ọ bụ ha ka osisi oliv abụọ+ na ihe abụọ e ji adọsa ọkụ*+ nọchiri anya ha. Ha guzokwa n’ihu Onyenwe ụwa.+  Ọ bụrụ na ndị iro ha achọọ imerụ ha ahụ́, ọkụ ga-esi n’ọnụ ha pụta repịa ndị iro ha. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla achọọ imerụ ha ahụ́, a ga-esikwa otú a gbuo ya.  Ha nwere ikike imechi eluigwe+ ka mmiri ọ bụla ghara izo+ n’ụbọchị niile ha na-ebu amụma. Ha nwekwara ikike ime ka mmiri ghọọ ọbara,+ nweekwa ikike ime ka e nwee ụdị ihe ọjọọ ọ bụla n’ụwa ugboro ole ha chọrọ.  Mgbe ha buchara amụma, anụ ọhịa nke ga-esi n’abis* gbagote ga-alụso ha agha, meriekwa ha ma gbuo ha.+  Ozu ha ga-atọgbọkwa n’okporo ámá obodo ukwu, ebe e gburu Onyenwe ha n’elu osisi. Obodo a yiri Sọdọm na Ijipt.  Ndị si n’agbụrụ niile na ebo niile na asụsụ niile na mba niile ga na-ele ozu ha ruo ụbọchị atọ na ọkara.+ Ha agaghịkwa ekwe ka e lie ozu ha n’ili. 10  Ndị bi n’ụwa ga-aṅụrị ọṅụ, meekwa oriri maka na ha abụọ nwụrụ. Ha ga-ezigara ibe ha onyinye, n’ihi na ndị amụma abụọ a mekpara ha ahụ́. 11  Mgbe ụbọchị atọ na ọkara ahụ gachara, Chineke nyeghachiri ha abụọ ume ndụ,+ ha eguzoro n’ụkwụ ha. Ezigbo ụjọ jidekwara ndị hụrụ ha. 12  Ha abụọ nụkwara oké olu nke si n’eluigwe sị ha: “Gbagotenụ ebe a.” Ha wee si n’ígwé ojii gbagoo eluigwe. Ndị iro ha hụkwara ha.* 13  N’oge ahụ, e nwere oké ala ọma jijiji. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ahụ wee daa. Ala ọma jijiji ahụ gbukwara puku mmadụ asaa (7,000), ụjọ atụwa ndị fọdụrụ, ha etowe Chineke nke eluigwe. 14  Ahụhụ nke abụọ+ agafeela. Ahụhụ nke atọ ga-abịakwa ọsọ ọsọ. 15  Mgbe mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ya,+ e nwere ndị ji oké olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Alaeze ụwa aghọọla Alaeze nke Chineke+ na nke Kraịst ya.+ Chineke ga na-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”+ 16  Ndị okenye iri abụọ na anọ+ ndị nọ ọdụ n’ocheeze ha n’ihu Chineke wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpọọrọ Chineke isiala, 17  sị: “Anyị na-ekele gị, Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, onye dị adị+ na onye dịbu adị, n’ihi na i jirila ike gị dị ukwuu bụrụ eze ma na-achị.+ 18  Ma mba niile were iwe, gịnwa eweekwa iwe, oge a kara aka eruo ka e kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe, kwụọkwa ndị ohu gị bụ́ ndị amụma+ na ndị nsọ na ndị na-atụ egwu gị* ụgwọ,+ ma ndị nta ma ndị ukwu, bibiekwa ndị na-ebibi ụwa.”+ 19  E wee meghee ebe nsọ nke ụlọ nsọ Chineke dị n’eluigwe, mụ ahụ igbe ọgbụgba ndụ ya n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ya.+ Àmụ̀mà gburu. Anụrụ m olu dị iche iche. Égbè eluigwe gbara. Ala mara jijiji, nnukwu akụ́ mmiri ígwé dakwara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpara e ji atụ̀ ihe.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”
Ma ọ bụ “nọkwa na-ele ha.”
Gụọ A5.
Na Grik, “ndị na-atụ egwu aha gị.”