Daniel 2:1-49

  • Eze Nebukadneza rọrọ nrọ nyere ya nsogbu (1-4)

  • E nweghị onye ma ihe nke nwere ike ịkọ nrọ ahụ (5-13)

  • Daniel rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka (14-18)

  • O toro Chineke maka ime ka ọ mata ihe nzuzo ahụ (19-23)

  • Daniel kọọrọ eze nrọ ahụ (24-35)

  • Ihe nrọ ahụ pụtara (36-45)

    • Nkume nke nọchiri anya alaeze ga-egwepịa ihe a kpụrụ akpụ (44, 45)

  • Eze kwanyeere Daniel ùgwù (46-49)

2  N’afọ nke abụọ n’ọchịchị Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ dị iche iche. N’ihi ya, obi ezughị ya ike,+ o nweghịkwa ike ihi ụra.  Eze wee nye iwu ka a kpọọ ndị dibịa anwansi na ndị dibịa afa na ndị mgbaasị na ndị Kaldia* ka ha bịa kọọrọ eze nrọ ọ rọrọ. Ha wee bata guzo n’ihu eze.+  Eze gwaziri ha, sị: “Arọrọ m nrọ. Obi ezubeghịkwa m ike maka na m chọrọ ịmata ihe nrọ m rọrọ pụtara.”  Ndị Kaldia wee gwa eze okwu n’asụsụ Arameik,*+ sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Kọọrọ ndị ohu gị nrọ gị, anyị ga-akọwara gị ihe ọ pụtara.”  Eze gwara ndị Kaldia, sị: “Ihe m kpebiri bụ na ọ bụrụ na unu akọrọghị m nrọ ahụ na ihe ọ pụtara, a ga-abọkasị unu. A ga-ejikwa ụlọ unu mere ebe ọhaneze na-aga mposi.*  Ma ọ bụrụ na unu akọọrọ m nrọ ahụ na ihe ọ pụtara, m ga-enye unu onyinye, kwụọ unu ụgwọ, meekwa ka a na-akwanyere unu ùgwù nke ukwuu.+ Ngwanụ, kọọrọnụ m nrọ ahụ na ihe ọ pụtara.”  Ha gwara eze nke ugboro abụọ, sị: “Ka eze kọọrọ ndị ohu ya nrọ ahụ, anyị ga-akọwara ya ihe ọ pụtara.”  Eze sịrị ha: “Ama m nke ọma na unu kpachaara anya na-egbu oge maka na unu ghọtara ihe m kpebiri.  Ọ bụrụ na unu akọrọghị m nrọ ahụ, ọ bụ otu ihe ka a ga-eme unu niile. Ma unu ekpebiela na unu ga-aghọ m aghụghọ ma ghaara m ụgha ruo mgbe m ga-agbanwe obi m. Ngwanụ, kọọrọnụ m nrọ ahụ. M ga-amatazi na unu ga-akọwali ihe ọ pụtara.” 10  Ndị Kaldia sịrị eze: “E nweghị onye ọ bụla nọ n’ụwa nke nwere ike ime ihe a eze kwuru, n’ihi na e nwebeghị nnukwu eze ma ọ bụ gọvanọ gwatụrụla dibịa anwansi ọ bụla ma ọ bụ dibịa afa ọ bụla ma ọ bụ onye Kaldia ọ bụla ka o mee ụdị ihe a. 11  Ihe a eze kwuru ka anyị mee siri ike. E nweghị onye ọ bụla nwere ike ịkọrọ ya eze ma e wepụ ndị bụ́ chi, ha anọghịkwa ebe a ịkọrọ gị ya.”* 12  Ihe a mere ka eze wee nnukwu iwe ma nye iwu ka e gbuo ndị niile ma ihe na Babịlọn.+ 13  Mgbe o nyechara iwu a, ndị ohu ya gawara ka ha gbuo ndị niile ma ihe. Ha chọkwara Daniel na ndị enyi ya ka e gbuo ha. 14  N’oge ahụ, Daniel ji akọ gwa Arịọk bụ́ onyeisi ndị nche eze okwu, onye e dunyere ka o gbuo ndị ma ihe na Babịlọn. 15  Ọ jụrụ Arịọk bụ́ onyeisi ndị nche eze, sị: “Olee ihe mere eze ji nye ụdị iwu a?” Arịọk wee kọọrọ Daniel ihe na-emenụ.+ 16  N’ihi ya, Daniel gakwuuru eze rịọ ya ka o nyetụ ya oge ka o wee kọọrọ ya ihe nrọ ya pụtara. 17  Daniel laziri n’ụlọ ya ma kọọrọ Hananaya, Mishel, na Azaraya ndị enyi ya ihe na-emenụ. 18  Ọ gwara ha ka ha rịọ Chineke nke eluigwe ka o meere ha ebere ma mee ka ha mata ihe nzuzo a, ka e wee ghara igbu Daniel na ndị enyi ya nakwa ndị ọzọ ma ihe na Babịlọn. 19  N’abalị, e mere ka Daniel mata ihe nzuzo ahụ n’ọhụụ.+ Daniel wee too Chineke nke eluigwe. 20  Daniel sịrị: “Ka e too aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi,*N’ihi na ọ bụ naanị ya na-enye amamihe na ike.+ 21  Ọ na-agbanwe oge na mgbe ihe ga-eme.+ Ọ na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị.+ Ọ na-enye ndị ma ihe amamihe, na-emekwa ka ndị nwere ọgụgụ isi na-aghọta ihe.+ 22  Ọ na-eme ka a mata ihe ndị miri emi nakwa ihe ndị zoro ezo.+ Ọ ma ihe dị n’ọchịchịrị,+Ìhè dịkwa n’ebe ọ nọ.+ 23  Chineke nna nna m hà, ọ bụ gị ka m na-ekele ma na-eto,N’ihi na i meela ka m mara ihe, meekwa ka m dị ike. Ugbu a, i meekwala ka m mata ihe anyị rịọrọ gị. I meela ka anyị mata ihe na-echegbu eze.”+ 24  Daniel wee gakwuru Arịọk, onye eze họpụtara ka o gbuo ndị ma ihe na Babịlọn.+ Ọ gwara ya, sị: “Egbula onye ọ bụla n’ime ndị ma ihe na Babịlọn. Kpọrọ m gaa n’ihu eze ka m kọọrọ eze ihe nrọ ya pụtara.” 25  Arịọk kpọgara Daniel n’ihu eze ozugbo, sị ya: “Ahụla m otu nwoke n’ime ndị Juda a dọtara n’agha,+ onye nwere ike ịkọrọ eze ihe nrọ ya pụtara.” 26  Eze wee jụọ Daniel, onye aha ya bụ Belteshaza,+ sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na i nwere ike ịkọrọ m nrọ m rọrọ na ihe ọ pụtara?”+ 27  Daniel zara eze, sị: “E nweghị onye ma ihe ma ọ bụ dibịa afa ma ọ bụ dibịa anwansi ma ọ bụ onye ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu nke nwere ike ịkọrọ eze ihe nzuzo a eze chọrọ ka a kọọrọ ya.+ 28  Ma, e nwere Chi nọ n’eluigwe, Onye na-eme ka a mata ihe nzuzo.+ O meekwala ka Eze Nebukadneza mara ihe ga-eme n’oge ikpeazụ. Ihe a bụ nrọ ị rọrọ na ọhụụ ị hụrụ mgbe i dina n’àkwà* gị: 29  “Eze, mgbe i dina n’àkwà* gị, ị rọrọ nrọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Onye na-eme ka a mata ihe nzuzo mere ka ị mara ihe ga-eme. 30  Ma ihe mere e ji mee ka m mata ihe nzuzo a abụghị maka na m ma ihe karịa onye ọ bụla ọzọ dị ndụ, kama ọ bụ ka e nwee ike ịkọwara eze ihe nrọ ya pụtara, ka i wee mata ihe ị nọ na-eche n’obi gị.+ 31  “Eze, mgbe ị na-arọ nrọ, ị nọ na-ele anya wee hụ otu nnukwu ihe a kpụrụ akpụ. Ihe ahụ a kpụrụ akpụ guzo n’ihu gị. O buru nnukwu ibu ma na-egbuke egbuke nke ukwuu. Otú ọ dị na-emenye ụjọ. 32  E ji ezigbo ọlaedo kpụọ isi ya,+ jiri ọlaọcha kpụọ obi ya na aka ya,+ jiri ọla kọpa kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya.+ 33  E ji ígwè kpụọ ụkwụ ya,+ jiri ígwè na ụrọ kpụọ ala ala ụkwụ ya.+ 34  Mgbe ị nọ na-ele ihe ahụ a kpụrụ akpụ anya, otu nkume a na-ejighị aka wapụta bịara kụọ ihe ahụ a kpụrụ akpụ n’ala ala ụkwụ ya ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ ma gwerie ya.+ 35  N’oge ahụ, e gweriri ígwè ahụ, ụrọ ahụ, ọla kọpa ahụ, ọlaọcha ahụ, na ọlaedo ahụ. Ha niile wee dịrị ka mkpo ọka* ndị dị n’ebe a na-azọcha ọka n’oge okpomọkụ. Ifufe wee buru ha bufuo, a hụghịzi ha ọzọ. Ma nkume ahụ nke kụriri ihe ahụ a kpụrụ akpụ ghọrọ nnukwu ugwu, gbasaakwa n’ebe niile n’ụwa. 36  “Ọ bụ ya bụ nrọ eze rọrọ. Ugbu a, anyị ga-akọrọ eze ihe ọ pụtara. 37  Eze, ọ bụ gị bụ eze ndị eze, onye Chineke nke eluigwe nyere alaeze a.+ O mere ka ị dị ike, nye gị ume, meekwa ka a na-akwanyere gị ùgwù. 38  O nyefere ndị bi n’ebe dị iche iche n’aka gị, nyefeekwa anụ ọhịa dị iche iche na nnụnụ n’aka gị. O mekwara ka ị na-achị ha niile.+ Ọ bụ gịnwa bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.+ 39  “Ị chịchaa, alaeze ọzọ nke na-erughị ka nke gị ga-amalite ịchị.+ A ga-enwekwa alaeze ọzọ nke ga-achị ụwa niile.+ Ọ bụ ya ga-abụ nke atọ, ya bụ, nke ọla kọpa. 40  “Ma alaeze nke anọ ga-esi ike ka ígwè.+ Ọ ga-akụri alaeze niile a bu ya ụzọ ma gwerie ha otú ígwè si akụri ma na-egweri ihe ọ bụla ọzọ.+ 41  “Ebe ọ bụ na ị hụrụ na ihe e ji kpụọ ala ala ụkwụ ya na mkpịsị ụkwụ ya bụ ụrọ ọkpụite ji akpụ ihe nakwa ígwè, alaeze ahụ ga-ekewa ekewa. Ma ọ ga-esitụ ike ka ígwè otú ahụ ị hụrụ na a gwakọtara ígwè na ụrọ na-esighị ike. 42  Ma ebe ọ bụ na e ji ígwè na ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ya, alaeze ahụ ga-esitụ ike n’ebe ụfọdụ, ma ọ gaghị esi ike n’ebe ụfọdụ. 43  Otú ahụ ị hụrụ na a gwakọtara ígwè na ụrọ na-esighị ike, ha na ndị mmadụ* ga-agwakọta. Ma ha enweghị ike ijikọta aka dị n’otu, otú ahụ ígwè na ụrọ na-anaghị agwakọtali ghọọ otu ihe. 44  “N’oge ndị eze ahụ na-achị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze+ nke a na-agaghị ebibi ebibi+ malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ.+ Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze ndị a niile,+ mee ka ha ghara ịdịkwa, ma naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi,+ 45  otú ahụ ị hụrụ na e si n’ugwu wapụta otu nkume nke a na-ejighị aka wapụta nakwa na nkume ahụ gwepịara ígwè ahụ, ọla kọpa ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ, na ọlaedo ahụ.+ Chineke bụ́ Onye Ukwu emeela ka eze mara ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ Nrọ a bụ eziokwu, ọ ga-emezukwa otú m si kọwaara gị ya.” 46  Eze Nebukadneza wee gbuo ikpere n’ala kpọọrọ Daniel isiala wee kwanyere ya ùgwù. O nyekwara iwu ka e nye Daniel onyinye ma mụọrọ ya insens.* 47  Eze gwara Daniel, sị: “N’eziokwu, Chineke unu bụ Chi kacha chi niile na Onyenwe ndị eze niile nakwa Onye na-eme ka a mata ihe nzuzo, n’ihi na o mere ka i nwee ike ịkọwa ihe nzuzo a.”+ 48  Eze wee bulie Daniel n’ọkwá, nye ya ọtụtụ ọmarịcha onyinye, meekwa ka ọ bụrụ onye na-achị ógbè* niile dị na Babịlọn+ nakwa onyeisi* ndị niile ma ihe na Babịlọn. 49  Eze mekwara ihe Daniel rịọrọ ya wee họpụta Shedrak, Mishak, na Abednego+ ka ha na-elekọta ógbè* dị iche iche dị na Babịlọn. Ma Daniel nọ na-eje ozi n’obí eze.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ndị bụ́ aka ochie n’ịgba afa nakwa n’iji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.
Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee Daniel 2:4b ruo 7:28.
O nwere ike ịbụ, “ebe a na-ekpofu ahịhịa; ikpo nsị.”
N’Arameik, “ha na anụ ahụ́ ebighịkwa.”
Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ụmụ mmadụ,” ya bụ, ndị nkịtị.
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”
N’Arameik, “prifekt.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”