Ozi Ọma Mak Dere 1:1-45

  • Jọn Onye Na-eme Baptizim kwusawara ozi ọma (1-8)

  • E mere Jizọs baptizim (9-11)

  • Setan nwara Jizọs ọnwụnwa (12, 13)

  • Jizọs malitere ikwusa ozi ọma na Galili (14, 15)

  • Jizọs kpọrọ ndị mbụ ga-eso ụzọ ya (16-20)

  • Ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ (21-28)

  • Jizọs gwọrọ ọtụtụ ndị na Kapaniọm (29-34)

  • O kpere ekpere n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị (35-39)

  • Ọ gwọrọ onye ekpenta (40-45)

1  Ihe a bụ otú ozi ọma banyere Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke, si malite:  E dere n’akwụkwọ Aịzaya onye amụma, sị: “(Lee, m na-ezipụ onye ozi m ga-ebu gị ụzọ bịa,* ọ ga-edozikwa ụzọ gị.)*+  E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova!* Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.’”+  N’ihi ya, Jọn Onye Na-eme Baptizim nọ n’ala ịkpa, na-ekwusara ndị mmadụ na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala ka e wee gbaghara ha mmehie ha.+  Ndị si n’ala niile dị na Judia na ndị niile bi na Jeruselem nọ na-agakwuru ya. O wee na-eme ha baptizim* n’Osimiri Jọdan. Ha na-ekwupụtakwa mmehie ha n’ihu ọha.+  Jọn yi uwe e ji ajị kamel mee, keekwa ájị̀ e ji akpụkpọ anụ mee n’úkwù.+ Ihe ọ na-eri bụ igurube na mmanụ aṅụ.+  Ọ na-ekwusakwa, sị: “Onye ka m ike na-abịa n’azụ m. Erughị m eru ihulata tọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+  Eji m mmiri mee unu baptizim. Ma, ọ ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.”+  N’ụbọchị ndị ahụ, Jizọs si Nazaret nke dị na Galili bịa, Jọn wee mee ya baptizim n’Osimiri Jọdan.+ 10  Ozugbo o si na mmiri na-apụta, ọ hụrụ ka e meghere eluigwe, hụkwa mmụọ nsọ n’ụdị nduru ka ọ na-ebekwasị ya.+ 11  Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+ 12  Ozugbo ahụ, mmụọ nsọ mere ka ọ banye n’ala ịkpa. 13  Ọ nọ n’ala ịkpa ruo ụbọchị iri anọ, Setan wee na-anwa ya ọnwụnwa.+ Ya na anụ ọhịa dị iche iche nọ, ma ndị mmụọ ozi nọ na-ejere ya ozi.+ 14  Mgbe e jidechara Jọn tụba ya n’ụlọ mkpọrọ, Jizọs banyere Galili,+ na-ekwusa ozi ọma Chineke,+ 15  sị: “Oge a kara aka eruola, Alaeze Chineke eruokwala nso. Chegharịanụ,+ kwerekwanụ n’ozi ọma.” 16  Ka ọ na-aga n’akụkụ Oké Osimiri Galili,* ọ hụrụ Saịmọn na Andru+ nwanne Saịmọn ka ha na-awụnye ụgbụ ha n’oké osimiri+ n’ihi na ha bụ ndị na-akụ azụ̀.+ 17  Jizọs wee sị ha: “Soronụ m. M ga-eme ka unu bụrụ ndị na-akụta mmadụ.”+ 18  Ha hapụrụ ụgbụ ha ozugbo soro ya.+ 19  Mgbe ọ gatụkwuru ihu, ọ hụrụ Jems nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ka ha nọ n’ụgbọ mmiri ha na-edozi ụgbụ ha.+ 20  Ọ kpọkwara ha n’egbughị oge. Ha wee hapụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ, soro ya gawa. 21  Ha wee banye Kapaniọm. Ozugbo Ụbọchị Izu Ike ruru, ọ banyere n’ụlọ nzukọ malite izi ihe.+ 22  Otú o si ezi ihe juru ha anya n’ihi na ọ nọ na-ezi ha ihe ka onye Chineke nyere ikike, ọ bụghị ka ndị odeakwụkwọ.+ 23  N’oge ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ* ji nọ n’ụlọ nzukọ ha. O tiri mkpu, sị: 24  “Jizọs onye Nazaret, gịnị jikọrọ anyị na gị?+ Ị̀ bịara ibibi anyị? Ama m gị nke ọma, Onye Nsọ nke Chineke.”+ 25  Ma Jizọs baara ya mba, sị: “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta!” 26  Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ* mechara ka ihe ọdụdọ dọọ nwoke ahụ, o tisiri mkpu ike ma si n’ime ya pụta. 27  O juru mmadụ niile anya nke na ha malitere ikwurịta ya, sị: “Gịnị bụ ihe a? Otú o si ezi ihe pụrụ iche. Ọ na-enyedị ndị mmụọ ọjọọ* iwu, ha ana-erubekwara ya isi.” 28  Akụkọ banyere Jizọs wee gbasaa ngwa ngwa n’ebe niile n’ógbè Galili. 29  Ha wee si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ gaa n’ụlọ Saịmọn na Andru. Ha na Jems na Jọn so.+ 30  Ma nne nwunye Saịmọn+ dina ala maka na ahụ́ ọkụ ji ya. Ozugbo ahu, ha kọọrọ Jizọs banyere ya. 31  Jizọs gakwuuru ya, jide ya n’aka ma selite ya. Ahụ́ ọkụ ahụ kwụsịrị, ya amalite ijere ha ozi. 32  Ná mgbede, mgbe anyanwụ darala, ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa na ndị mmụọ ọjọọ ji.+ 33  Obodo ahụ niile gbakọkwara n’ọnụ ụzọ. 34  O wee gwọọ ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa dị iche iche.+ Ọ chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ. Ma, ọ naghị ekwe ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ kwuo okwu n’ihi na ha ma na ọ bụ ya bụ Kraịst.* 35  N’isi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbara, o biliri pụọ n’èzí ma gaa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị. Ọ malitere ikpe ekpere n’ebe ahụ.+ 36  Ma, Saịmọn na ndị ya na ha so chọsiwere ya ike 37  ma chọta ya. Ha wee sị ya: “Mmadụ niile na-achọgharị gị.” 38  Ma, ọ sịrị ha: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo ndị dị nso, ka m kwusaakwa ozi ọma n’ebe ndị ahụ n’ihi na ọ bụ ihe mere m ji bịa.”+ 39  Ọ gazukwara Galili niile, na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ ha dị iche iche ma na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.+ 40  Otu onye ekpenta bịakwutekwara ya. O gburu ikpere n’ala na-arịọ ya arịrịọ, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+ 41  O meteere ya ebere. O wee matịa aka bitụ ya aka, sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.”+ 42  Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya, ya adị ọcha. 43  Tupu nwoke ahụ alawa, Jizọs dọsiri ya aka ná ntị ike, 44  sị ya: “Ya enwekwala onye ị ga-akọrọ ihe ọ bụla. Kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị, nyekwa ihe ndị Mosis kwuru na onye ekpenta ga-enye ma ọ dị ọcha,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”+ 45  Ma mgbe nwoke ahụ lawara, ọ malitere ịkọsa akụkọ ahụ, na-agbasakwa ya n’ebe niile, nke mere na Jizọs enwekwaghị ike ịbanye n’obodo n’ihi otú ndị mmadụ si abịakwute ya n’ìgwè. N’ihi ya, ọ nọdụrụ n’azụ obodo n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị. Ma, ha si ebe dị iche iche na-abịakwute ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “na-ezipụ onye ozi m n’ihu gị.”
Gụọ Malakaị 3:1. Ọ bụ ebe e dere ahịrịokwu a dị n’akara ngebichi.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-emikpu ha.”
Ọ bụ ọdọ mmiri. Baịbụl kpọkwara ya Ọdọ Mmiri Genesaret na Oké Osimiri Taịbirias.
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “mmụọ ahụ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
O nwere ike ịbụ, “ha ma onye ọ bụ.”