Ozi Ọma Matiu Dere 20:1-34

  • A kwụrụ ndị rụrụ ọrụ n’ubi vaịn otu ihe (1-16)

  • Jizọs kwukwara ọzọ na a ga-egbu ya (17-19)

  • Nne ụmụ Zebedi rịọrọ Jizọs ka o nye ụmụ ya ọkwá n’Alaeze Chineke (20-28)

    • Jizọs nyere ndụ ya ka a gbapụta ọtụtụ mmadụ (28)

  • Jizọs gwọrọ ndị ìsì abụọ (29-34)

20  “N’ihi na Alaeze eluigwe dị ka onyeisi ezinụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya.+  Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego dinarịọs* maka otu ụbọchị, o zigara ha n’ubi vaịn ya.  Mgbe ọ pụkwara n’ihe dị ka n’awa nke atọ,* ọ hụrụ ndị ọzọ ka ha guzo n’ọma ahịa n’enweghị ihe ha na-arụ.  O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m. M ga-enye unu ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị.’  Ha wee gawa. Ọ pụrụ ọzọ n’ihe dị ka n’awa nke isii* nakwa n’awa nke itoolu* wee mee otu ihe ahụ.  N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’ihe dị ka n’awa nke iri na otu* hụ ka ndị ọzọ guzo, wee sị ha, ‘Gịnị mere unu ji guzo ebe a ụbọchị niile n’enweghị ihe unu na-arụ?’  Ha sịrị ya, ‘N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.’ O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m.’  “Mgbe o ruru uhuruchi, onye nwe ubi vaịn ahụ gwara onye na-elekọtara ya ọrụ, sị, ‘Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha,+ malite n’onye ikpeazụ ruo n’onye mbụ.’  Mgbe ndị awa nke iri na otu bịara, onye ọ bụla n’ime ha natara otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 10  N’ihi ya, mgbe ndị mbụ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka ukwuu. Ma a kwụkwara ha otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 11  Mgbe ha natara ya, ha malitere ịkatọ onyeisi ezinụlọ ahụ 12  wee sị ya, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa. Ma, ị kwụrụ anyị ihe ị kwụrụ ha n’agbanyeghị na anyị nọ n’anwụ na-arụgbu onwe anyị n’ọrụ kemgbe ụtụtụ.’ 13  Ma ọ gwara otu n’ime ha, sị, ‘Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. Ihe mụ na gị kwekọrịtara ọ́ bụghị na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs?*+ 14  Were ego gị lawa. Otu ihe ahụ m nyere gị ka m chọrọ inye onye ikpeazụ a. 15  Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị iji ihe m mee ihe masịrị m? Ka ị̀ na-emere m anyaụfụ* maka na m bụ ezigbo mmadụ?’*+ 16  Otú a ka ndị ikpeazụ ga-esi bụrụ ndị mbụ, ndị mbụ abụrụkwa ndị ikpeazụ.”+ 17  Mgbe Jizọs na-agbago Jeruselem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya iche, wee gwa ha n’okporo ụzọ,+ sị: 18  “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ n’ebe ahụ. Ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ.+ 19  Ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha were ya mee ihe ọchị, pịakwa ya ihe ma kpọgide ya n’osisi.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+ 20  Nne ụmụ Zebedi+ wee bịakwute ya, ya na ụmụ ya ndị nwoke, kpọọrọ ya isiala. Ọ bịara ịrịọ ya ka o meere ya ihe.+ 21  Jizọs sịrị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?” Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Kwuo ka ụmụ m ndị nwoke abụọ a soro gị nọdụ ala n’Alaeze gị, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị.”+ 22  Jizọs wee sị: “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Ùnu ga-aṅụli ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ?”+ Ha asị ya: “Anyị ga-aṅụli ya.” 23  O wee sị ha: “Unu ga-aṅụ ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ,+ ma ọ bụghị m na-ekpebi onye ga-anọ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.”+ 24  Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe a, ha wesoro ụmụnne abụọ ahụ iwe.+ 25  Ma Jizọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Ọ sịrị ha: “Unu ma na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị isi ha na-ejikwa aka ike achị ha.+ 26  O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ.+ Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 27  Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu.+ 28  Otú ahụ ka Nwa nke mmadụ mere. Ọ bịaghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi+ ma nye ndụ* ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.”+ 29  Mgbe ha si Jeriko na-apụ, ìgwè mmadụ sooro ya. 30  Ma, mgbe ndị ìsì abụọ ndị nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ nụrụ na Jizọs na-agafe, ha tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”+ 31  Ma ìgwè mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ. Ma ha tisikwuru mkpu ike, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 32  Jizọs wee kwụsị, kpọọ ha, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33  Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, mee ka anyị hụwa ụzọ.” 34  Jizọs meteere ha ebere, bitụ ha aka n’anya,+ ha ahụwa ụzọ ozugbo wee soro ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B14.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere ise nke mgbede.
Gụọ B14.
Gụọ B14.
Gụọ B14.
Na Grik, “anya gị ọ̀ dị njọ.”
Ma ọ bụ “m na-emesapụ aka.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”