Ozi Ọma Jọn Dere 8:12-59

  • Chineke na-agba àmà banyere Jizọs (12-30)

    • Jizọs bụ “ìhè nke ụwa” (12)

  • Ụmụ Ebreham (31-41)

    • ‘Eziokwu ga-eme ka unu nwere onwe unu’ (32)

  • Ụmụ Ekwensu (42-47)

  • Jizọs na Ebreham (48-59)

8  12  Jizọs gwara ha okwu ọzọ, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa.+ Onye ọ bụla na-eso m emekataghị jee ije n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè+ nke ndụ.” 13  N’ihi ya, ndị Farisii sịrị ya: “Ị na-agba àmà banyere onwe gị. Àmà gị abụghị eziokwu.” 14  Jizọs wee sị ha: “Ọ bụrụgodị na m na-agba àmà banyere onwe m, àmà m bụ eziokwu, n’ihi na ama m ebe m si bịa na ebe m na-aga.+ Ma unu amaghị ebe m si bịa na ebe m na-aga. 15  Unu na-ekpe ikpe otú mmadụ si ekpe.+ E nweghị onye ọ bụla m na-ekpe ikpe. 16  Ma ọ bụrụgodị na mụ ekpee ikpe, ikpe m bụ ikpe ziri ezi n’ihi na anọghị m naanị m, kama Nna m nke zitere m nọnyeere m.+ 17  E dekwara n’Iwu unu,* sị: ‘Àmà mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’+ 18  Ọ bụ m na-agba àmà banyere onwe m. Nna m nke zitere m na-agbakwa àmà banyere m.”+ 19  Ha wee jụọ ya, sị: “Olee ebe Nna gị nọ?” Jizọs zara, sị: “Unu amaghị m, unu amaghịkwa Nna m.+ Ọ bụrụ na unu ma m, unu gaara amakwa Nna m.”+ 20  O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-ezi ihe n’ebe a na-edebe ego n’ụlọ nsọ.+ Ma e nweghị onye ọ bụla jidere ya maka na oge ya erubeghị.+ 21  O wee gwa ha ọzọ, sị: “Ana m ala, unu ga-achọkwa m, ma unu ga-anwụ ná mmehie unu.+ Unu agaghị abịali n’ebe m na-aga.”+ 22  Ndị Juu malitere ịsị: “Ọ̀ na-aga igbu onwe ya? N’ihi na ọ na-asị, ‘Unu agaghị abịali n’ebe m na-aga.’” 23  O wee sị ha: “Unu si n’ala, ma esi m n’elu.+ Unu si n’ụwa a, ma esighị m n’ụwa a. 24  Ọ bụ ya mere m ji gwa unu, sị: Unu ga-anwụ ná mmehie unu. N’ihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na ọ bụ m bụ onye ahụ, unu ga-anwụ ná mmehie unu.” 25  N’ihi ya, ha jụwara ya, sị: “Ònye ka ị bụ?” Jizọs sịrị ha: “Gịnịdị mere m ji atụpụrụ unu ọnụ? 26  Enwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu banyere unu nakwa ikpe ndị m ga-ekpebi. N’eziokwu, Onye zitere m na-ekwu eziokwu. Ọ bụkwa ihe ndị m nụrụ n’ọnụ ya ka m na-ekwu n’ụwa.”+ 27  Ha aghọtaghị na ọ na-agwa ha banyere Nna ya. 28  Jizọs wee sị: “Ọ bụ mgbe unu wegoro Nwa nke mmadụ n’elu*+ ka unu ga-amata na ọ bụ m bụ ya,+ nakwa na e nweghị ihe ọ bụla m na-eme bụ́ uche m.+ Kama m na-ekwu ihe ndị a otú Nna m kụziiri m. 29  Onye zitere m nọnyeere m. Ọ hapụghị m ka m nọrọ naanị m n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.”+ 30  Ka ọ nọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ ndị nwere okwukwe na ya. 31  Jizọs wee gwa ndị Juu kweere na ya, sị: “Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru mgbe niile, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’eziokwu. 32  Unu ga-amara eziokwu,+ eziokwu ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”+ 33  Ha gwara ya, sị: “Anyị bụ ụmụ Ebreham. Anyị abụtụbeghị ohu onye ọ bụla. Gịnị mere i ji asị, ‘Unu ga-enwere onwe unu’?” 34  Jizọs zara ha, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-eme mmehie na-agbara mmehie ohu.+ 35  Ohu anaghị anọ n’ụlọ nna ya ukwu ruo mgbe ebighị ebi. Ma, nwa na-anọ ruo mgbe ebighị ebi. 36  N’ihi ya, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’eziokwu. 37  Ama m na unu bụ ụmụ Ebreham. Ma unu na-achọ igbu m maka na unu anaghị anabata okwu m. 38  Ihe m na-ekwu bụ ihe m hụrụ mgbe mụ na Nna m nọ.+ Ma, unu na-eme ihe nna unu gwara unu.” 39  Ha wee gwa ya, sị: “Nna anyị bụ Ebreham.” Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebreham,+ unu ga na-arụ ọrụ Ebreham rụrụ. 40  Ma ugbu a, unu na-achọ igbu m, bụ́ onye gwara unu eziokwu m nụrụ n’ọnụ Chineke.+ Ebreham emeghị otú a. 41  Unu na-arụ ọrụ nna unu.” Ha sịrị ya: “Anyị abụghị ndị a kwatara n’iko.* Anyị nwere otu Nna, ya bụ, Chineke.” 42  Jizọs wee sị ha: “Ọ bụrụ na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m n’anya+ n’ihi na esi m n’ebe Chineke nọ bịa, anọkwa m ebe a. Ọ bụghị m zitere onwe m, kama ọ bụ ya zitere m.+ 43  Gịnị mere na unu aghọtaghị ihe m na-ekwu? Ọ bụ n’ihi na unu enweghị ike ịnabata okwu m. 44  Unu si ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ihe nna unu chọrọ.+ Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere,*+ o guzosighịkwa ike n’eziokwu n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-agha ụgha, ọ na-ekwu ihe bụ́ uche ya, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.+ 45  Ma, unu anaghị ekwere ihe m na-ekwu maka na m na-agwa unu eziokwu. 46  Ònye n’ime unu ga-amali m ikpe na m bụ onye mmehie? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere na unu ekwetaghị ihe m na-ekwu? 47  Onye si na Chineke na-ege ntị n’okwu Chineke.+ Unu anaghị ege ntị n’ihi na unu esighị na Chineke.”+ 48  Ndị Juu wee sị ya: “Ọ̀ kwa anyị kwuru ekwu na ị bụ onye Sameria+ nakwa na mmụọ ọjọọ ji gị?”+ 49  Jizọs zara, sị: “Mmụọ ọjọọ ejighị m, kama m na-asọpụrụ Nna m, unu anaghịkwa asọpụrụ m. 50  Ma anaghị m achọrọ onwe m otuto.+ E nwere Onye na-achọ ka e too m, ọ bụkwa ya bụ onyeikpe. 51  N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme ihe m kwuru, o mekataghị nwụọ.”+ 52  Ndị Juu wee sị ya: “Ugbu a ka anyị matara na mmụọ ọjọọ ji gị. Ebreham nwụrụ, ndị amụma nwụkwara. Ma ị na-asị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme ihe m kwuru, o mekataghị nwụọ.’ 53  Ị̀ ka nna anyị Ebreham onye nwụrụnụ? Ndị amụma nwụkwara. Ònye ka ị na-asị na ị bụ?” 54  Jizọs zara, sị: “Ọ bụrụ na m na-eto onwe m, otuto m enweghị ihe ọ bụ. Ọ bụ Nna m na-eto m,+ bụ́ onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu. 55  Unu amabeghị ya,+ ma ama m ya.+ Ọ bụrụ na mụ asị na amaghị m ya, m ga-abụ onye ụgha dị ka unu. Ma ama m ya, ana m emekwa ihe o kwuru. 56  Obi tọrọ nna unu Ebreham ezigbo ụtọ mgbe ọ nọ na-atụ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya ma ṅụrịa ọṅụ.”+ 57  Ndị Juu wee sị ya: “Ị̀ na-ekwu na ị hụrụ Ebreham ebe ị na-erubeghị afọ iri ise?” 58  Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na tupu a mụọ Ebreham, anọ m ndụ.”+ 59  N’ihi ya, ha buuru nkume ka ha tụọ ya, ma Jizọs zoro wee si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Iwu Mosis.
Ya bụ, kwụwa Jizọs n’osisi.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, mgbe ọ ghara ụgha gbasara Chineke.