Ilu 8:1-36

  • Ihe amamihe kwuru (1-36)

    • ‘Abụ m nke mbụ n’ime ihe niile Chineke kere’ (22)

    • ‘M nọ n’akụkụ Chineke na-arụ ọrụ’ (30)

    • ‘Ihe gbasara ụmụ mmadụ na-eme m obi ụtọ’ (31)

8  Ọ̀ bụ na amamihe anọghị na-akpọ òkù? Ọ̀ bụ na nghọta anọghịkwa na-eti mkpu?+   Ọ na-eguzo n’ebe ndị dị elu+ n’okporo ụzọ,N’ebe ụzọ gbara mkpị.   Ọ na-anọ n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá e si abanye n’obodo,N’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ dị iche iche,Na-eti mkpu n’oké olu, sị:+   “Ndị mmadụ, ọ bụ unu ka m na-akpọ òkù. Ọ bụ mmadụ niile ka m weliri olu na-agwa okwu.   Unu ndị na-amaghị ihe, maranụ ihe.+ Unu ndị nzuzu, nweenụ uche.   Geenụ ntị, n’ihi na ihe m na-ekwu dị mkpa. Ihe m na-ekwu dị mma.   N’ihi na m weturu olu na-ekwu eziokwu,Ejighịkwa m ọnụ m ekwu ihe ọjọọ.   Ihe niile ọnụ m na-ekwu dị mma. E nweghị nke bụ́ ụgha, e nweghịkwa nke na-eduhie mmadụ.   Ha niile doro onye na-aghọta ihe anya,Ndị ma ihe makwa na ha ziri ezi. 10  Naranụ aka ná ntị m na-adọ unu kama ịnara ọlaọcha,Narakwanụ amamihe kama ịnara ọlaedo kachamma.+ 11  N’ihi na amamihe ka nkume kọral* mma. E nweghị ihe ọ bụla ọzọ bara ezigbo uru a ga-eji tụnyere ya. 12  Abụ m amamihe. Mụ na nghọta bi. M mụtala ihe, m na-echekwa echiche nke ọma.+ 13  Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ M kpọrọ nganga na mmadụ ibuli onwe ya elu asị,+ kpọọkwa ihe ọjọọ na okwu rụrụ arụ asị.+ 14  Enwere m ezigbo ndụmọdụ na ezigbo amamihe.+ M na-aghọta ihe,+ m dịkwa ike.+ 15  Ọ bụ m ka ndị eze ji achị,Ọ bụkwa m ka ndị isi ji eme iwu ndị dị mma.+ 16  Ọ bụ m ka ndị isi ji achị,Ọ bụkwa m ka ndị a ma ama ji ekpe ikpe ziri ezi. 17  M hụrụ ndị hụrụ m n’anya n’anya,Ndị na-achọ m ga-achọtakwa m.+ 18  Akụnụba na ebube dị m n’aka,Akụ̀ na-anaghị agwụ agwụ na ezi omume dịkwa m n’aka. 19  Mkpụrụ m na-amịpụta ka ọlaedo mma. Ọ kadị ọlaedo a nụchara anụcha mma. Ihe m na-emepụta dịkwa mma karịa ọlaọcha kacha mma.+ 20  M na-eje ije n’ụzọ ezi omume,N’etiti okporo ụzọ ikpe ziri ezi. 21  M na-ekenye ndị hụrụ m n’anya nnukwu ihe,M na-emekwa ka ebe ha na-akwasa ihe ju n’ọnụ. 22  Jehova kere m, mụ abụrụ mmalite ụzọ ya.+ Abụ m nke mbụ n’ime ihe niile o kere n’oge dị anya gara aga.+ 23  O mere ka m dịrị malite n’oge ochie,+Ná mbido mbido, malite mgbe ụwa na-adịbeghị.+ 24  A mụrụ m mgbe oké osimiri na-adịbeghị,+Mgbe a na-enwebeghị ebe mmiri na-agbapụta n’ala. 25  A mụrụ m tupu e mee ka ugwu ukwu dịrị,Tupu e nwee ugwu nta, 26  Mgbe ọ na-ekebeghị ụwa na mbara ala yaMa ọ bụ ájá mbụ dị n’ụwa. 27  Mgbe ọ kwadebere eluigwe,+ anọ m ya. Mgbe ọ kpaara mbara igwe na osimiri ókè,+ 28  Mgbe o mere ka ígwé ojii dịrị n’elu,*Mgbe o mere ka oké osimiri ju n’ọnụ, 29  Mgbe o nyere oké osimiri iwuKa mmiri ya ghara ịgafe ókè ọ kpaara ya,+Mgbe ọ tọrọ ntọala ụwa, 30  Mgbe ahụ, m nọ n’akụkụ ya na-arụ ọrụ. Abụkwa m ọkà n’ọrụ.+ Ihe gbasara m na-eme ya ezigbo obi ụtọ+ kwa ụbọchị. M na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.+ 31  M ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ụwa ọ kwadebere ka e biri na ya,Ihe gbasara ụmụ mmadụ na-emekwa m ezigbo obi ụtọ. 32  Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị. Ndị na-eso ụzọ m na-enwe obi ụtọ. 33  Nabatanụ aka ná ntị* a na-adọ unu+ ka unu wee mara ihe. Unu elegharala ya anya. 34  Onye na-ege m ntị na-enwe obi ụtọ. Ọ na-abịa n’ọnụ ụzọ ụlọ m* kwa ụbọchị n’isi ụtụtụ. Ọ na-echere n’akụkụ ọnụ ụzọ m. 35  N’ihi na onye na-achọ m ga-achọta ndụ,+Ihe ya ga-adịkwa Jehova mma. 36  Ma onye na-ejighị m kpọrọ ihe na-emerụ onwe ya ahụ́. Ndị kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ n’anya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “kwụsie ike.”
Na Hibru, “Ṅaanụ ntị n’aka ná ntị.”
Ma ọ bụ “na-amụ anya n’ọnụ ụzọ m.”