Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Ihe Baịbụl kwuru

 Okwu Grik e si na ya nweta aha akwụkwọ Baịbụl a a na-akpọ Mkpughe bụ A·po·kaʹly·psis (apọkalips). Ihe ọ pụtara bụ “Imeghe” ma ọ bụ “Ikpughe.” Aha akwụkwọ a gosiri na o meghere ihe ndị e zochiri ezochi, kpugheekwa ihe ndị ga-emenụ ọtụtụ afọ e dechara akwụkwọ a. Ọtụtụ amụma ndị e dere na ya emezubeghị.

Isi ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe

Ihe ndị ga-enyere mmadụ aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe

  1.   Ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe bara uru, ọ bụghị ihe na-emenye ndị na-efe Chineke egwu. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-ekwu na “apọkalips” pụtara oké ọdachi, ma ihe e kwuru ná mmalite akwụkwọ Mkpughe nakwa ná ngwụcha ya bụ na obi ụtọ ga-adịrị onye ọ bụla na-agụ ihe ndị e dere na ya, na-aghọta ha ma na-eme ha eme.​—Mkpughe 1:3; 22:7.

  2.   E nwere ọtụtụ “ihe atụ” ma ọ bụ ihe nnọchianya n’akwụkwọ Mkpughe. E kwesịkwara ịghọta ha ka ihe atụ.​—Mkpughe 1:1.

  3.   E nweela ebe ndị ọzọ na Baịbụl e bu ụzọ dee gbasara ọtụtụ ndị e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe nakwa ọtụtụ ihe atụ e dere na ya:

  4.   Ọhụụ ndị ahụ bụ maka ‘ụbọchị Onyenwe anyị,’ nke malitere mgbe Alaeze Chineke bidoro n’afọ 1914, Jizọs amalitekwa ịchị. (Mkpughe 1:​10) Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịtụ anya na ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe ga-akacha emezu n’oge anyị a.

  5.   Ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe bụkwa ihe ndị na-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ, ya bụ, amamihe sí n’aka Chineke na aka ndị ghọtarala ihe Baịbụl na-ekwu ga-enyere anyị.​—Ọrụ Ndịozi 8:​26-​39; Jems 1:5.