Mkpughe E Kpugheere Jọn 20:1-15

  • A ga-eke Setan agbụ otu puku afọ (1-3)

  • Ndị ga-eso Kraịst chịa otu puku afọ (4-6)

  • A ga-atọpụ Setan na mkpọrọ, bibizie ya (7-10)

  • E kpere ndị nwụrụ anwụ ikpe n’ihu ocheeze na-acha ọcha (11-15)

20  Ahụkwara m otu mmụọ ozi ka o si n’eluigwe na-agbadata. O ji mkpịsị ugodi nke abis*+ na nnukwu agbụ ígwè n’aka.  O jidekwara dragọn ahụ,+ bụ́ agwọ mbụ ahụ,+ onye a na-akpọ Ekwensu+ na Setan,+ kee ya agbụ otu puku (1,000) afọ.  Ọ tụbakwara ya n’abis,*+ mechie ya ma kaa akara n’elu ya, ka ọ ghara iduhie mba niile ọzọ ruo mgbe otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara. Mgbe ihe a gachara, a ga-ahapụtụ ya.+  Ahụrụ m ocheeze dị iche iche. E nyere ndị nọ ọdụ na ha ike ikpe ikpe. Ahụrụ m ọbara* ndị e gburu* maka na ha gbara àmà banyere Jizọs, gwakwa ndị mmadụ gbasara Chineke. Ndị a efeghị anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ihe yiri ya a kpụrụ akpụ, a kaghịkwa ha akara anụ ọhịa ahụ n’egedege ihu na n’elu aka ha.+ Ha wee dịrị ndụ ma soro Kraịst bụrụ eze,+ chịakwa otu puku (1,000) afọ.  Ọ bụ ya bụ mbilite n’ọnwụ mbụ.+ Ndị fọrọ ná ndị nwụrụ anwụ+ agaghị adị ndụ ruo mgbe otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara.  Ndị a ga-akpọlite ná mbilite n’ọnwụ mbụ ga-enwe obi ụtọ,+ dịrịkwa nsọ. Ha agaghị anwụ+ ọnwụ nke abụọ,*+ kama ha ga-abụ ndị nchụàjà+ Chineke na nke Kraịst. Ha ga-esokwa ya* bụrụ eze, chịakwa otu puku (1,000) afọ.+  Ozugbo otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara, a ga-atọpụ Setan na mkpọrọ.  Ọ ga-agakwa ka o duhie mba ndị dị n’akụkụ anọ nke ụwa, bụ́ Gọg na Megọg, ka ọ kpọkọta ha maka ịlụ agha. Ha dị ọtụtụ ka ájá dị n’oké osimiri.  Ha ga-agakwa ebe niile n’ụwa, gbaa ebe ndị nsọ mara ụlọikwuu gburugburu, gbaakwa obodo ahụ a hụrụ n’anya gburugburu. Ma ọkụ ga-esi n’eluigwe bịa repịa ha.+ 10  A ga-atụbakwa Ekwensu, onye na-eduhie ha, n’ọdọ ọkụ* ahụ sọlfọ na-eme ka ọ na-enwusi ike, ebe anụ ọhịa ahụ+ na onye amụma ụgha ahụ nọ anọ.+ A ga-emekpakwa ha ahụ́* ehihie na abalị ruo mgbe niile ebighị ebi. 11  Ahụrụ m otu nnukwu ocheeze na-acha ọcha, hụkwa Chineke, onye nọ ọdụ na ya.+ Ụwa na eluigwe sikwa n’ihu ya gbapụ,+ a hụghịkwa ha ọzọ. 12  Ahụkwara m ndị nwụrụ anwụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ. E meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ. Ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.+ E jikwa ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe otú ha si kpaa àgwà.+ 13  Oké osimiri hapụrụ ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na ili* hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha. E kpekwara ndị ahụ ikpe otú ha si kpaa àgwà n’otu n’otu.+ 14  A tụbakwara ọnwụ na ili* n’ime ọdọ ọkụ ahụ.+ Ọdọ ọkụ ahụ+ pụtara ọnwụ nke abụọ.+ 15  A tụbakwara onye ọ bụla a na-edeghị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ+ n’ọdọ ọkụ ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”
Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”
Na Grik, “ndị e ji anyụike gbuo.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, Kraịst.
Na Grik, “Ọnwụ nke abụọ enweghị ikike n’ebe ha nọ.”
Ọ pụtara mbibi ebighị ebi. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “A ga-atụkwa ha mkpọrọ.”
Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.