Mkpughe E Kpugheere Jọn 1:1-20

  • Ihe Chineke si n’aka Jizọs kpughee (1-3)

  • Jọn kelere ọgbakọ asaa dị n’Eshia (4-8)

    • “Abụ m Alfa na Omega” (8)

  • Mmụọ nsọ mere ka Jọn nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị (9-11)

  • Jọn hụrụ mgbe Jizọs dị ebube n’ọhụụ (12-20)

1  Ihe ndị a ka Jizọs Kraịst kpughere. Ọ bụ Chineke kpugheere ya ihe ndị a+ ka o gosi ndị ohu ya+ ihe ndị ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya. Jizọs wee ziga mmụọ ozi ya, ya ejiri ihe ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha gosi ya Jọn ohu ya,+  onye gbara àmà banyere ihe niile ọ hụrụ, ya bụ, ihe Chineke na Jizọs Kraịst kwuru.  Onye na-agụpụta okwu amụma a, na onye na-anụ ya ma na-eme ihe ndị e dere na ya,+ na-enwe obi ụtọ, n’ihi na oge ahụ a kara aka dị nso.  Jọn na-edegara ọgbakọ asaa+ dị ná mpaghara Eshia akwụkwọ: Ka “Chineke, onye dị adị na onye dịbu adị na onye na-abịa,”+ nakwa mmụọ asaa+ nọ n’ihu ocheeze ya, meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.  Ka Jizọs Kraịst, “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi,”+ “onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ,”+ na “Onye Na-achị ndị eze nke ụwa,”+ meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu. Jizọs hụrụ anyị n’anya,+ jirikwa ọbara ya napụta anyị n’aka mmehie anyị.+  O mekwara ka anyị bụrụ otu alaeze+ na ndị nchụàjà+ nke Chineke ya, bụ́ Nna ya. Ọ dị ebube, dịrịkwa ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen.  Ọ ga-abịa n’ígwé ojii.+ Anya niile ga-ahụ ya. Ndị mara ya ube ga-ahụkwa ya. Ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, ruokwa uju n’ihi ya.+ N’eziokwu, ihe a ga-emerịrị. Amen.  Jehova* Chineke kwuru, sị: “Abụ m Alfa na Omega,*+ onye dị adị na onye dịbu adị na onye na-abịa, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”+  Abụ m Jọn, nwanna unu, onye a na-akpagbu otú e si akpagbu unu,+ na onye na-atachi obi otú unu si atachi,+ na onye unu na ya ga-abụ eze n’Alaeze Chineke+ n’ihi na anyị na-eso ụzọ Jizọs.+ Anọ m n’agwaetiti a na-akpọ Patmọs n’ihi na m na-ekwu gbasara Chineke, na-agbakwa àmà banyere Jizọs. 10  Mmụọ nsọ mere ka m nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị, m nụkwara olu na-adasi ike ka opi n’azụ m. 11  Olu ahụ sịrị: “Were akwụkwọ mpịakọta dee ihe ị na-ahụ ma zigara ya ọgbakọ asaa ndị dị n’ebe ndị a: Efesọs,+ Smeana,+ Pagamọm,+ Tayataịra,+ Sadis,+ Filadelfịa,+ na Leodisia.”+ 12  M tụgharịrị ka m hụ onye na-agwa m okwu. Mgbe m tụgharịrị, ahụrụ m ihe asaa e ji adọsa ọkụ,* ndị e ji ọlaedo rụọ.+ 13  Ahụkwara m onye yiri nwa nke mmadụ+ n’etiti ihe ndị ahụ e ji adọsa ọkụ.* O yi uwe gbadaruru ya n’ụkwụ, keekwa ájị̀ ọlaedo n’obi. 14  Isi ya na ntutu isi ya na-acha ọcha ka owu ọcha, na-achakwa ka snoo. Anya ya dị ka ọkụ na-enwu enwu.+ 15  Ụkwụ ya dị ka ezigbo ọla kọpa+ nke na-egbuke egbuke n’oké ọkụ. Olu ya na-ada ka mmiri na-asọ ike ike. 16  Ọ chị kpakpando asaa n’aka nri.+ Otu ogologo mma agha dị nkọ, nke nwere ihu abụọ,+ si n’ọnụ ya pụta. Ihu ya dịkwa ka anwụ na-achasi ike.+ 17  Mgbe m hụrụ ya, m dara n’ụkwụ ya ma dị ka onye nwụrụ anwụ. O wee bikwasị m aka nri ya, sị: “Atụla egwu. Abụ m Onye Mbụ+ na Onye Ikpeazụ.+ 18  Abụ m onye dị ndụ.+ Anwụkwara m,+ ma, adịzi m ndụ. M ga-adịkwa ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Achịkwa m mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke ili.*+ 19  N’ihi ya, were akwụkwọ dee ihe ndị ị hụrụ, deekwa ihe ndị dị adị na ihe ndị ga-eme mgbe ihe ndị a gachara. 20  Kpakpando asaa ahụ ị hụrụ n’aka nri m na ihe asaa ahụ e ji adọsa ọkụ,* ndị e ji ọlaedo rụọ, bụ ihe nzuzo dị nsọ. Ihe a ka ọ pụtara: Kpakpando asaa ahụ pụtara ndị mmụọ ozi nke ọgbakọ asaa ahụ. Ihe asaa ahụ e ji adọsa ọkụ* pụtakwara ọgbakọ asaa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ma ọ bụ “A na Z.” Alfa bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ na Grik, Omega abụrụ mkpụrụ akwụkwọ ikpeazụ.
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “oriọna.”