Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Otú I Kwesịrị Isi Na-agwa Nwa Gị Ihe Ọ Ga-eme na Ihe Ọ Na-agaghị Eme

Otú I Kwesịrị Isi Na-agwa Nwa Gị Ihe Ọ Ga-eme na Ihe Ọ Na-agaghị Eme

IHE MERE NA Ọ NAGHỊ ADỊ MFE

Nwa gị nwere ike ịna-eche na ị naghị ekwe ya megharịa ahụ́. Ma, ị ma na ọ bụghị eziokwu. Ị ma na ọ ga-aba ná nsogbu ma ị hapụ ya ka ọ na-eme ihe ọ bụla masịrị ya.

Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ị gwa nwa gị ihe ọ ga-eme na ihe ọ na-agaghị eme. Ma, ọ ga-adị mma ka i buru ụzọ mata ihe mere nwa gị ji enupụrụ gị isi.

IHE MERE ỤMỤAKA JI ENUPỤRỤ NDỊ MỤRỤ HA ISI

Ụgha: O nweghị nwatakịrị na-anaghị eme isi ike. Ọ bụ ihe e ji mara ndị na-eto eto.

Eziokwu: Ị gwa nwa gị ihe ọ ga-eme, o nwere ike ime ya ma ọ bụrụ na ọ taghị akpụ. O nwekwara ike ime ya ma gị na ya buru ụzọ kwurịta ya.

O nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka nwatakịrị na-enupụrụ mama ya na papa ya isi. Ma, ndị nne na nna nwere ike iso na-akpata ya ma ọ bụrụ na ha na-esi ọnwụ na nwa ha ga-eme ihe ọ bụla ha kwuru. Ha nwekwara ike iso na-akpata ya ma ọ bụrụ na ha na-enye nwa ha iwu ka à ka ku ya n’aka. Ka anyị lebara ihe abụọ a anya:

  • Ọ bụrụ na nne na nna na-esi ọnwụ na nwa ha ga-eme ihe ọ bụla ha kwuru. Ọ bụrụ na nne na nna agwa nwa ha ihe ọ ga-eme, ma ha na ya ebughị ụzọ kwurịta ya, nwa ahụ ga-ewere ya na ha anaghị ekwe ya megharịa ahụ́. Ọ gaghị aghọta na ha bu ọdịmma ya n’obi. Nke a nwere ike ime ka ọ na-eme ihe ọjọọ na nzuzo.

  • Ọ bụrụ na nne na nna na-enye nwa ha iwu ka à ka ku ya n’aka. Ị gwa nwatakịrị mee ihe, ya ajụọ gị ihe mere ọ ga-eji eme ya, o nwere ike ime ihe ahụ ma ọ bụrụ na gị agwa ya na ọ bụ otú ị chọrọ ka o si mee ya. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka onye na-eto eto si eme. Ọ ga-achọ ka ị gwakwuo ya ihe mere i ji sị ya mee ihe ahụ. Nke a abụghị ihe ọjọọ n’ihi na ọ ga-emecha biri naanị ya, na-ekpebikwara onwe ya ihe ọ ga-eme. Ọ ka mma ka ọ mụta otú ọ ga-esi na-echebara ihe echiche ma na-eme mkpebi ndị dị mma ugbu a gị na ya ka nọ.

Ma, olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe ọ bụla ị gwara nwa gị mee na-ewe ya iwe?

IHE I NWERE IKE IME

Ekwola na ihe ị gwara ya na-ewe ya iwe kwụsị ịna-agwa ya ihe ọ ga-eme na ihe ọ na-agaghị eme. Ọ bụ gị kwesịrị ịna-agwa ya ihe ọ ga-eme. Ndị na-eto eto kwesịrị inwe onye ga na-agwa ha ihe ha ga-eme, ọ bụrụgodị na ọ dịghị ha mma. N’ihi ya, ị gwa nwa gị ihe, hụ na ọ ghọtara ihe ị sị ya mee. Otu akwụkwọ kwuru na ọ ga-esi ike nwatakịrị emee ihe na-adịghị mma ma ọ bụrụ na papa ya na mama ya na-agwa ya ihe ọ ga-eme otú ọ ga-edo ya anya. Ọ ga-esikwa ike ya emee ihe na-adịghị mma ma ọ bụrụ na ha amara otú o si na-eme ihe ahụ, gharakwa isi ọnwụ na ọ ga-eme ya otú ha si kwuo ya. Ma, ọ bụrụ na ndị nne na nna ahapụ ụmụ ha ka ha na-eme ihe otú o si masị ha, ihe ha na-agwa ha bụ na ihe ọ bụla ha metara agbasaghị ha. Ọ ga-eme ka ụmụ ha na-enupụrụ ha isi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 29:15.

Olee ihe ị ga-eme ka nwa gị ghara ịna-eche na ị naghị ekwe ya megharịa ahụ́? Tupu gị ekpebie ihe a ga-eme n’ụlọ unu na ihe a na-agaghị eme, jụọ ya ihe o chere gbasara ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere ihe ị sịrị ya emela, ma ya achoọ ka ị gbanwetụ ihe ụfọdụ, gee ya ntị mgbe ọ na-agwa gị ya. Ọ bụrụ na ọ chọpụta na ị na-ege ya ntị, o nwere ike ime ihe i kwuru, ọ bụrụgodị na ọ dịghị ya mma n’obi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jems 1:19.

Tupu gị ekpebie ihe a ga-eme na ihe a na-agaghị eme, o nwere ihe i kwesịrị icheta. Nke mbụ bụ na ndị na-eto eto na-achọkarị ka a hapụ ha ka ha na-eme ihe ọ bụla ha chọrọ. Nke abụọ abụrụ na ndị nne na nna nwere ike ime iwu ga-eme ka o yie ka hà na-akpa nwa ha ahụ́. N’ihi ya, nwa gị kwuo obi ya, chebara ihe ahụ o kwuru echiche. Esila ọnwụ na ọ bụ ihe i kwuru ka ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-emekarị ihe i kwuru. Ekwukwala na ọ ga-emerịrị ihe otú i si kwuo ya ma ọ bụrụ na otú o si chọọ ime ya dị mma.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jenesis 19:17-22.

Ọ bụghị naanị nwa gị kwesịrị ịna-ekwu otú obi dị ya, gịnwa kwesịkwara ịna-agwa ya obi gị. Ị na-agwa ya obi gị, ị na-akụziri ya ka ọ na-echebara ihe ndị ọzọ na-ekwu echiche.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Ndị Kọrịnt 10:24.

N’ikpeazụ, kwuo ihe ọ ga-eme, gwakwa ya ihe mere i ji chọọ ka o mee ya otú ahụ. Ọ bụrụgodị na ihe ahụ i kwuru adịghị ya mma n’obi, obi ga-adị ya mma na papa ya na mama ya na-ege ya ntị ma ya chọọ ịgwa ha otú ihe dị ya n’obi. Cheta na ị na-akụziri ya otú ọ ga-esi na-eme ihe ma ọ ghọọ dimkpa. Ọ bụrụ na ị naghị agwa nwa gị mee ihe tara akpụ, ya bụrụkwa na gị na ya na-ebu ụzọ ekwurịta ya, ihe ị na-akụziri ya bụ otú ọ ga-esi aghọ dimkpa ma ihe.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 22:6.