Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agwa Ibe Ha Okwu Ọjọọ

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agwa Ibe Ha Okwu Ọjọọ

IHE MERE O JI ESI IKE NKWỤSỊ

Ihe e ji mara di na nwunye ụfọdụ bụ ịgwa ibe ha okwu ọjọọ. Ha setụ obere okwu, ha agwakasịa ibe ha okwu ahụ́. Ha enweghị ike imeda obi kparịta ụka.

Ọ bụrụ na ọ bụ otú a ka unu si eme, unu nwere ike ịkwụsị ya. Ma, tupu anyị ekwuo ihe ga-enyere unu aka ịkwụsị ya, unu ga-ebugodị ụzọ chọpụta ihe mere unu ji agwa ibe unu okwu ọjọọ, na ihe mere o ji dị mma ka unu kwụsị ya.

IHE MERE DI NA NWUNYE ỤFỌDỤ JI AGWA IBE HA OKWU ỌJỌỌ

Otú e si zụọ mmadụ. Ọ bụrụ na di na nwunye na-agwakarị ibe ha okwu ọjọọ, ụmụ ha ga-amụta ya. Ha lụọ di ma ọ bụ nwaanyị, ha nwere ike ịna-eme ka papa ha na mama ha.

Ihe ndị a na-eme na fim. Ndị na-eme egwuregwu na-eji okwu ọjọọ eme ihe ọchị. Ha na-eme ka ndị na-ele ha na-eche na okwu ọjọọ abụghị ihe ọjọọ.

Omenala. N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ na-eche na ihe e ji ama onye bụ́ nwoke bụ onye na-achị nwunye ya n’aka ike. O nwekwara ndị nke na-eche na nwaanyị ekwesịghị ịna-emere di ya anya ụra ka ọ ghara ịna-eleda ya anya. Ọ bụrụ na ụdị di na nwunye a esetụ obere okwu, ha amalite gwakasịwa ibe ha okwu ahụ́.

Di na nwunye ekwesịghị ịna-agwa ibe ha okwu ọjọọ n’ihi na o nwere ike ịkpatara ha ọrịa ma ọ bụkwanụ mee ka ha gbaa alụkwaghịm. Ụfọdụ na-ekwu na a kụọ mmadụ ihe, o nwere ike idi ya karịa mgbe a gwara ya okwu ọjọọ. Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwaanyị di ya na-agwakarị okwu ọjọọ, na-etikwa ya ihe. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Di m kụọ m ihe, m na-echefu ya ngwa ngwa. Ma, ya gwa m okwu ọjọọ, ọ na-ara ahụ́ mụ echefuo ya. Ọ kaara m mma ka ọ na-eti m ihe kama ịna-agwa m okwu ọjọọ.”

Olee ihe i nwere ike ime ma ọ bụrụ na unu na-agwakarị ibe unu okwu ọjọọ?

IHE I NWERE IKE IME

Cheta na ihe ị gwara di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ịgbawa ya obi. Were ya na ọ bụ gịnwa ka a gwara okwu ọjọọ ahụ. Ọ bụrụ na obi agaghị adị gị mma, marakwa na ọ gaghị adị yanwa. Gbalịa lee ma ị̀ ga-echetali oge ị gwara di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe wutere ya. I nwere ike iche na ihe ahụ ị gwara ya ekwesịghị ime ka obi jọọ ya njọ. Ma, olee otú obi dị ya mgbe ị gwara ya ihe ahụ? Olee otú i chere ị gaara esi agwa ya ihe ahụ, obi adị ya mma kama ịjọ ya njọ? Baịbụl kwuru, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”—Ilu 15:1.

Mụta ihe n’aka di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ọ bụrụ na ị na-agakwukarị di na nwunye na-agwa ibe ha okwu ọjọọ ka ha na-agwa gị ihe ị ga-eme, ị ga-amụta ịgwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu ọjọọ. N’ihi ya, kama ịna-agakwuru ụdị ndị a, na-agakwuru ndị ga-akụziri gị ihe ọma. Ọ bụrụ na o nwere di na nwunye ị ma na ha anaghị agwakarị ibe ha okwu ọjọọ, gakwuru ha jụọ ha ihe na-enyere ha aka.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 3:17.

Na-emeso di gị ma ọ bụ nwunye gị otú i si emeso ya mgbe ahụ unu lụrụ ọhụrụ. Mmadụ na-eche okwu ọjọọ eche tupu ya ekwupụta ya. N’ihi ya, kawa ahụ́ na-eche ihe ndị dị mma gbasara di gị ma ọ bụ nwunye gị. Gbalịa cheta ihe ụfọdụ ọ na-abụ unu mekọọ ọnụ n’oge gara aga ya atọọ unu ụtọ. Ị nọtụ, were foto ndị unu sere n’oge gara aga lee. Olee ihe ọ na-abụ di gị ma ọ bụ nwunye gị mee n’oge ahụ obi adị gị mma? Olee àgwà ọma ndị o nwere ndị mere ka i kweta na unu ga-alụ?—Amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka: Luk 6:45.

Ị na-agwa ya okwu, asịla, “Ọ bụ otú i si eme.” Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị emee gị ihe na-adịghị gị mma n’obi, kama ịgwa ya okwu ọjọọ, gwa ya otú ihe ahụ o mere dị gị n’obi. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ikwu, sị, “Ọ na-adị m ka o nweghị ihe i ji m kpọrọ mgbe ọ bụla i mere ihe na-ebughị ụzọ gwa m.” Ịgwa ya okwu otú a ga-eme ka o jiri obiọma zaa gị. Ọ dị mma karịa ịsị: “Ọ bụ otú i si eme. Ị naghị akọrọ m ihe ị na-eme.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 4:6.

Mara mgbe i kwesịrị imechi ọnụ. Ị chọpụta na iwe abịala di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụkwanụ na olu ya alawala elu, ọ ga-aka mma ka ị kwụsị okwu ahụ. Ọ bụgḥi ihe ọjọọ ma ị hapụgodị okwu ahụ ruo mgbe obi jụụrụ ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 17:14.

Mmadụ na-eche okwu ọjọọ eche tupu ya ekwupụta ya