Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-erubere Gị Isi

Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-erubere Gị Isi

IHE MERE NA Ọ NAGHỊ ADỊ MFE

Unu nwere ike kpebie otú a ga-esi eme ihe, nwa gị emewe ihe ọzọ. Dị ka ihe atụ, unu kpebiri na ọ kụhaala elekere itoolu nke abalị, onye ọ bụla agbanyụọ ekwentị ya. Ma n’izu a, i jidela nwa gị nwaanyị ugboro abụọ ebe ọ na-ezigara ndị enyi ya ozi n’ime ime abalị. Ị gwara nwa gị nwoke ka ọ na-alọta tupu elekere isii nke abalị. Ma, elekere asaa akụọla tupu ya alọta.

Nke bụ́ eziokwu bụ na nwa gị nwere ike ịgbanwe. Ma, tupu anyị ekwuo ihe ga-enyere ya aka, buru ụzọ mara ihe mere o ji enupụrụ gị isi. I nwere ike ịchọpụta na ihe nwa gị na-eme ajọrughị njọ otú i chere.

IHE MERE ỤMỤAKA JI ENUPỤRỤ NNE NA NNA HA ISI

Ọ bụrụ na e meghị ya ihe a sị na a ga-eme ya. Ụmụaka ụfọdụ na-ama ụma eme ihe papa ha ma ọ bụ mama ha sị ha emela. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ ka ha mara ihe a ga-eme ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị gwa nwa gị ihe ị ga-eme ya ma o mee ihe ị sị ya emela, o nwere ike ịga mee ihe ahụ ka ọ mara ma ị̀ ga-eme ya ihe ahụ i kwuru. Nke a ò gosiri na nwa ahụ agaghị agbanweli? Mba. Nke bụ́ eziokwu bụ na nwa gị nwere ike ịna-eme ihe ị sị ya emela ma ọ bụrụ na i meghị ya ihe ị sị na ị ga-eme ya ma o mee ihe ahụ.

Ọ bụrụ na ị naghị ekwe ya megharịa ahụ́. Ndị nne na nna ụfọdụ anaghị ekwe ka ụmụ ha megharịa ahụ́. Ha na-enye ha ọtụtụ iwu. Iwe na-abịa ha mgbe ọ bụla ụmụ ha na-emeghị ihe ha kwuru. Ha na-abịa nyekwuo ha iwu. Ma, nke a na-emekarị ka ihe ka njọ. Otu akwụkwọ kwuru na ọ bụrụ na ọ na-abụ nwatakịrị mee ihe na-adịghị mma, papa ya na mama ya enyekwuo ya iwu, ọ ga-eme ka nwa ahụ na-enupụkwuru ha isi. Ọ na-adị ka ebe mmadụ na-awụ mmiri n’elu okwute.

Ihe ga-enyere gị aka bụ ịgbazi nwa gị mgbe ọ bụla o mehiere ihe. Ịgbazi nwatakịrị dị iche n’ịta ya ahụhụ. Ịgbazi ya pụtara ịkụziri ya ihe. Olee otú ị ga-esi kụziere nwa gị ka ọ na-eme ihe ị sị ya mee?

IHE Ị GA-EME

Hụ na ọ ghọtara ihe ị sị ya mee. I kwesịrị ịgwa nwa gị ihe ị chọrọ ka o mee otú ọ ga-edo ya anya. I kwesịkwara ịgwa ya ihe ị ga-eme ya ma ọ bụrụ na o meghị ihe ahụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Galeshia 6:7.

Ihe i nwere ike ime: Dee iwu ndị unu tiri n’ezinụlọ unu n’akwụkwọ. Jụzie onwe gị, sị, ‘Iwu ndị a hà karịrị akarị? M̀ kwesịrị inyekwu ụmụ m iwu? Ò nwere iwu ndị na-abaghịzi uru? Ò nwere iwu nke m nwere ike ileghara anya ebe ọ bụ na ha na-erubere anyị isi?’

Hụ na i mere ya ihe ị sị na ị ga-eme ya. Ọ bụrụ na nwa gị mere ihe ọjọọ n’izu gara aga gị ahapụ ya, ma ya emee otu ihe ahụ n’izu a gị ataa ya ahụhụ, o nwere ike ime ka ọ na-enupụrụ gị isi. Ihe mere o nwere ike iji eme otú ahụ bụ na ọ maghị ma ị̀ ga-eme ya ihe ị sị na ị ga-eme ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 5:37.

Ihe i nwere ike ime: Nwa gị mee ihe ị sị ya emela, taa ya ahụhụ gbasara ihe ahụ o mere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị gwara ya ka ọ na-alọta n’elekere asaa, ma ya alọta n’elekere asatọ, i nwere ike ịsị ya na-alọtazi n’elekere isii, kama ịsị ya na ọ gaghị eri nri ọ bụla.

Esila ọnwụ na nwa gị ga-eme ihe i kwuru. Ọ bụrụ na nwa gị na-erubere gị isi, i nwere ike ịhapụ ya ka ọ na-eme ihe ụfọdụ ị na-ekwebughị ka ọ na-eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 4:5.

Ihe i nwere ike ime: Tupu gị enye iwu ụfọdụ n’ezinụlọ, kpọọ nwa gị gwa ya gbasara ya. I nwedịrị ike ịgwa ya ka o kwuo ihe a ga-eme ya ma o mee ihe a sị ya emela. Ọ bụrụ na nwatakịrị anọrọ ya mgbe a na-eti iwu n’ezinụlọ, ọ ga-ara ahụ́ ya enupụ isi n’iwu ahụ.

Nyere ya aka ka ọ na-akpa àgwà ọma. Ọ bụ eziokwu na ị chọrọ ka nwa gị na-erubere gị isi, i kwesịrị inyere ya aka ka o jiri aka ya na-ama ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Gụọ igbe bụ́ “Na-akụziri Nwa Gị Ka Ọ Na-akpa Àgwà Ọma.”)—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 3:16.

Ihe i nwere ike ime: Jiri Baịbụl nyere ya aka. Ọ na-enye “ịdọ aka ná ntị nke na-enye nghọta.” Ihe e kwuru na ya na-emekwa “ka ndị na-enweghị amamihe nwee amamihe, meekwa ka nwa okorobịa [ma ọ bụ nwa agbọghọbịa] nwee ihe ọmụma na ikike iche echiche.”—Ilu 1:1-4.