Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Mmadụ Ga-esi Kwụsị Ịna-eti Nwunye Ya Ihe

Otú Mmadụ Ga-esi Kwụsị Ịna-eti Nwunye Ya Ihe

Ihe atụ nke mbụ: Papa na mama Nkechi * bịara ileta ya na di ya. Obi dị ha niile ụtọ. Ha nọ na-akpa nkata na-achị. O nweghị nne na nna na-agaghị achọ ka ụdị onye a lụọ nwa ha. Ha ga-eji ya na-eme ọnụ n’ihi na ọ na-elezi nwa ha nwaanyị anya.

Ihe atụ nke abụọ: Obi adịghị Obinna mma, ezigbo iwe ji ya. Ọ na-abụ iwe bịa ya ya amaa nwunye ya ụra ma ọ bụkwanụ gbaa ya ụkwụ. Ọ na-adọrọkwa ya ná ntutu isi ma ọ bụ na-ebi ya isi n’ahụ́ ájá.

I NWERE ike iche na ọ bụ ụmụ nwoke abụọ ka a kọrọ akụkọ ha ebe a. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ otu onye na nwunye ya.

Ọ na-abụ Obinna hụ papa na mama nwunye ya ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ, ya emewe ka ezigbo mmadụ. Ma, naanị ya na nwunye ya nọrọ, ya ana-emekpọ ya ọnụ.

Ọtụtụ umụ nwoke ndị na-eti nwunye ha ihe mụtara ya n’aka papa ha. Papa ha na-eti mama ha ihe. Ha lụzie nwaanyị, ha echee na mmadụ iti nwunye ya ihe abụghị ihe ọjọọ. Ma, o nweghị otú iti nwaanyị ihe si dị mma. Ọ bụ ya mere o ji awụ ọtụtụ ndị akpata oyi ma ha nụ na nwoke tiri nwunye ya ihe.

Iti ụmụ nwaanyị ihe zuru ụwa ọnụ. Dị ka ihe atụ otu nnyocha e mere n’Amerịka gosiri na kwa ụbọchị, ọtụtụ ndị na-akpọ ụlọ ọrụ na-agwa ụmụ nwaanyị ndị di ha na-eti ihe ihe ha ga-eme. Ihe dị ka ụmụ nwaanyị iri na isii na-akpọ ụlọ ọrụ a ná nkeji ọ bụla. Ọ bụghị naanị n’Amerịka ka a na-echi ụmụ nwaanyị ọnụ n’ala, o zuru ụwa ọnụ. Ọ ga-esi ike ịmata ụmụ nwaanyị ole a na-eme ụdị ihe a n’ihi na ọtụtụ n’ime ha anaghị akọrọ ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị ọchịchị ihe ha na-ahụ. *

Otú ọtụtụ ndị si na-eti nwunye ha ihe emeela ka ndị mmadụ na-ajụ, sị: Gịnị mere mmadụ ga-eji tie nwunye ya ihe, ihe ọ sọkwara nwunye ya mee ya? È nwere ike inyere ndị na-eti nwunye ha ihe aka ịkwụsị àgwà ọjọọ a?

Ịkwụsị àgwà a adịghị mfe. Ma, Ndịàmà Jehova ma na onye ọ bụla malitere ime ihe Baịbụl kwuru nwere ike ịkwụsị ya. Baịbụl enyerela ọtụtụ ndị di na nwunye aka ha akwụsị ya. Ha na-akwanyeziri ibe ha ùgwù, jirikwa obiọma na-emeso ibe ha ihe. (Ndị Kọlọsi 3:8-10) Ka anyị tụlee gbasara Osondu na Adaaku.

Olee otú unu si ebi na mbụ?

Adaaku: Osondu mara m ụra n’abalị ọ gwara m na ya ga-alụ m. O merụrụ m ezigbo ahụ́. O wekwara otu izu tupu ya alachie. Ọ dara n’ala na-arịọ m na ya agaghị anwa ya anwa ọzọ. Ma, ọ ka na-egbu m ilu kemgbe ahụ. Ya gbuchaa m, ya arịọwa m.

Osondu: Obere ihe ọ bụla nwunye m mere na-eme ka m gbuo ya ilu. Dị ka ihe atụ, obi anaghị adị m mma ma ọ bụrụ na o nyeghị m nri n’oge. O nwedịrị ụbọchị m mịịrị égbè m na-akụ ya. O nwekwara ụbọchị m kụrụ ya ihe tinka kụrụ pan. M kụgidere ya ihe chee na ọ nwụọla. Iji mara ma ọ̀ ka dị ndụ, agara m jide nwa anyị nwoke tinye ya mma n’olu na-agwa ya na m ga-egbu ya.

Adaaku: O nweghị mgbe obi na-eru m ala. Ọtụtụ mgbe m na-agbapụrụ ya n’ụlọ. Obi jụrụ ya mụ alọta. Ma, ihe a niile ọ na-eti m anaghị ewute m otú okwu ọjọọ ọ na-agwa m si ewute m.

Osondu, ọ̀ bụ otú a ka i si eme kemgbe ụwa?

Osondu: Ee, amụtara m ya mgbe m dị obere. Papa m na-egbukarị mama m ilu n’ihu mụ na ụmụnne m. Mgbe ọ hapụrụ mama m, mama m kwakwuuru nwoke ọzọ. Nwoke ahụ na-etikwa ya ihe. O nwedịrị mgbe o dinara mụ na nwanne m nwaanyị. Ọ gara mkpọrọ n’ihi ihe a o mere. Ma, ọ bụghị ihe ndị a kwesịrị ime ka m na-eti nwunye m ihe.

Adaaku, gịnị mere na ihe a di gị na-eme gị emeghị ka ị hapụ ya?

Adaaku: Ọ bụ maka na ụjọ ji m. Ụjọ na-atụ m na o nwere ike igbu m ma ọ bụkwanụ gbuo papa m na mama m. Echekwara m na ihe nwere ike ịka njọ ma m gaa kọọrọ ya ndị ọzọ.

Olee mgbe ihe bidoro dịwa mma?

Osondu: Ọ bụ mgbe nwunye m na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl. Ná mmalite, obi adịghị m mma na ya na Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Echere m na Ndịàmà Jehova bụ ndị ọjọọ. N’ihi ya, achọghị m ka o soro ha. O mere ka m jiri obi ọjọọ na-emeso ma yanwa ma Ndịàmà Jehova ihe. Ma otu ụbọchị, nwa anyị nwoke aha ya bụ Nnanna rịawara ọrịa, a kpọga ya ụlọ ọgwụ. Ọ fọrọ obere ka ọ nọruo izu atọ n’ebe ahụ. Oge ahụ ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, Ndịàmà Jehova nyeere anyị ezigbo aka. Ọ bụdị ha lekọtara nwa anyị nwaanyị dị afọ isii. O nwere otu ụbọchị otu onye n’ime ha rụrụ ọrụ abalị. Mgbe chi bọrọ, ya abịa ka ya na Nnanna nọrọ ka nwunye m nwee ike ihitụ ụra. Otú a ha si na-emere anyị ihe ọma n’agbanyeghị na anaghị m achọ iji anya ahụ ha, ruru m n’ahụ́. Ọ bịara doo m anya na ọ bụ ha bụ ezigbo Ndị Kraịst. N’ihi ya, m gwara ha ka ha bịa mụwara m Baịbụl. Ihe ahụ anyị na-amụ nyeere m aka mụ amata otú nwoke kwesịrị isi na-emeso nwunye ya ihe na otú ọ na-ekwesịghị isi emeso ya. N’ihi ya, akwụsịrị m iti nwunye m ihe, kwụsịkwa ịgwa ya okwu ọjọọ. Ka oge na-aga, aghọrọ m Onyeàmà Jehova.

Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru, ndị nyeere gị aka ịgbanwe?

Osondu: Ha dị ọtụtụ. Baịbụl kwuru na 1 Pita 3:7 na m kwesịrị ‘ịna-asọpụrụ’ nwunye m. Ndị Galeshia 5:23 kwuru na m kwesịrị ‘ịdị nwayọọ, na-ejidekwa onwe m.’ Ndị Efesọs 4:31 kwukwara na “okwu mkparị” adịghị mma. Ndị Hibru 4:13 sịrị na ‘ihe niile ghe oghe’ n’anya Chineke. Nke a na-egosi na Chineke na-ahụ otú m si akpa àgwà, ọ bụrụgodị na ndị agbata obi anyị anaghị ahụ m. Amụtakwara m na mụ na ndị ezigbo mmadụ kwesịziri ịna-akpa n’ihi na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị enyi m mgbe ahụ m na-abụbeghị Onyeàmà Jehova so na-eme ka m na-eti nwunye m ihe. Ha na-ekwu na nwoke kwesịrị ịna-eti nwaanyị ihe ka ọ mata na ọ bụ ebe ọ bụla di ya sị ya nọrọ ka ọ ga-anọ.

Olee otú obi dị gị ugbu a?

Adaaku: Di m ghọrọ Onyeàmà Jehova kemgbe iri afọ abụọ na ise. Kemgbe ahụ, ọ hụziri m n’anya. O nweziri obiọma, o jighịkwa m egwu egwu.

Osondu: Ilu ahụ m na-egbu nwunye m n’oge ahụ jọgburu onwe ya. Ekwesịghị m ime ya ụdị ihe ahụ. Ma, m na-atụ anya mgbe ihe e kwuru n’Aịzaya 65:17 ga-eme. Mgbe ahụ, anyị ga-echefu ahụhụ na ihere niile m kpataara ezinụlọ anyị.

Olee ihe unu ga-agwa onye ọ bụla na-emekpọ di ya ma ọ bụ nwunye ya ọnụ?

Osondu: Ọ bụrụ na ị na-eti di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ma ọ bụkwanụ na-agwa ya okwu ọjọọ, e kwesịrị inyere gị aka. E nyere gị ya, gbalịa nabata ya. O nwere ọtụtụ ihe nwere ike inyere gị aka. Ihe nyeere mụnwa aka bụ na mụ na Ndịàmà Jehova bịara mụwa Baịbụl, mụ na ha ana-akpakwa.

Adaaku: Ejila onwe gị atụnyere onye ọzọ. Ọtụtụ ndị ga na-eche na ha ma ihe ga-enyere gị aka. Ha nwere ike ịgwa gị hapụ di gị, egekwala ha ntị. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ụmụ nwoke niile na-eme ụdị ihe a ga-agbanwe, obi dị m ụtọ na ahapụghị m di m. Mụ na ya na-ebizi n’udo.

IHE GA-ENYERE MMADỤ AKA ỊKWỤSỊ ÀGWÀ ỌJỌỌ A

Ịmụ Baịbụl enyerela ọtụtụ ụmụ nwoke aka ịgbanwe

Baịbụl kwuru, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie.” (2 Timoti 3:16) Ná mmalite isiokwu a, anyị kọrọ gbasara Obinna. O mechara mụọ Baịbụl, ya enyere ya aka ịgbanwe. Ọtụtụ ndị di na nwunye na-agwabu ibe ha okwu ọjọọ ma ọ bụ na-eti ibe ha ihe emeela udị ihe a o mere. Baịbụl enyerela ha aka, ha agbanwee otú ha si eche echiche na otú ha si akpa àgwà.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Baịbul ga-esi enyere gị na di gị ma ọ bụ gị na nwunye gị aka, gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ebe i bi. I nwekwara ike ịga n’adres bụ́ www.pr418.com.www.pr418.com.

^ para. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 7 Ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-etikwa di ha ihe. Ma, ọ bụ ụmụ nwoke ka ụmụ nwaanyị akpa àgwà ọjọọ a.