Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

 Ì chere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu? Ọtụtụ ndị nwere olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu n’agbanyeghị nsogbu ndị juru n’ụwa ugbu a. Ma, e lewe otú ihe dị ugbu a, ihe o nwere ike mechaa dị mma? N’eziokwu, ọ ga-emecha dị. Baịbụl kwuru ihe ndị ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

 Olee ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka anyị nwee olileanya?

 Baịbụl kwuru na nsogbu ndị dị n’ụwa taa ga-adị. Ma, o kwuru na nsogbu ndị a agaghị anọgide na-echi anyị ọnụ n’ala ruo mgbe ebighị ebi. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru.

  •   Nsogbu: Enweghị ebe obibi

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ha ga-arụ ụlọ, birikwa na ha.”​—Aịzaya 65:21.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: Onye ọ bụla ga-ebi n’ụlọ ya.

  •   Nsogbu: Ihe isi ike na enweghị ọrụ

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”​—Aịzaya 65:22.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: Onye ọ bụla ga-enwe ọrụ ga-adị ya mma ma na-atọ ya ụtọ.

  •   Nsogbu: Ikpe mkpegbu

     Ihe Baịbụl kwuru: “A ga-enwekwa ndị isi ga na-ekpe ikpe ziri ezi ma ha chịwa.”​—Aịzaya 32:1.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: A gaghịzi na-ekpe ndị mmadụ ikpe mkpegbu n’ihi agbụrụ ha, n’ihi na ha abụghị ndị ọnụ na-eru n’okwu, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha abaghị ọgaranya. A gaghịzi na-ele onye ọ bụla anya n’ihu.

  •   Nsogbu: Erighị nri na-edozi ahụ́ na agụụ

     Ihe Baịbụl kwuru: “Nri ga-eju n’ụwa. Ọ ga-eju eju n’elu ugwu dị iche iche.”​—Abụ Ọma 72:16.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: Nri na-edozi ahụ́ ga-eju ebe niile, ruokwa onye ọ bụla aka. E nweghị onye ga-ebu ọnụ lakpuo ụra, e nweghịkwa onye na-agaghị na-eri nri na-edozi ahụ́.

  •   Nsogbu: Mpụ na tigbuo zọgbuo

     Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.”​—Maịka 4:4.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: E nweghị onye ụjọ ga na-atụ. Obi ga-eru onye ọ bụla ala n’ihi na ndị ajọ omume agaghịzi anọ, ma, “ndị ezi omume ga-enweta ụwa.”​—Abụ Ọma 37:​10, 29.

  •   Nsogbu: Agha

     Ihe Baịbụl kwuru: “Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha. Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.”​—Aịzaya 2:4.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: Udo ga-adị ebe niile n’ụwa. (Abụ Ọma 72:7) E nweghị onye ga na-eru uju maka na e gburu onye ọ hụrụ n’anya n’agha. E nweghịkwa onye ga-achọ ebe ọ ga-agbaga maka na a na-alụ agha n’obodo ha.

  •   Nsogbu: Ọrịa

     Ihe Baịbụl kwuru: “O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ‘Ahụ́ adịghị m.’”​—Aịzaya 33:24.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: Ndị mmadụ agaghịzi na-enwe nkwarụ ma ọ bụ na-arịa ụdị ọrịa ọ bụla. (Aịzaya 35:​5, 6) Baịbụl kwudịrị na “ọnwụ agaghịzi adị.”​—Mkpughe 21:4.

  •   Nsogbu: Imebi ụwa

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”​—Aịzaya 35:1.

     Otú ọ ga-esi mezuo n’ọdịnihu: Ihe Chineke bu n’obi kee ụwa ga-eme. Ụwa niile ga-aghọ paradaịs, ndị mmadụ ebiri na ya.​—Jenesis 2:15; Aịzaya 45:18.

 Ànyị kwesịrị ikwere na ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu ga-eme?

 O nwere ike ịna-eme gị obi abụọ ma ihe ndị a Baịbụl kwuru hà ga-eme. Ma, anyị na-agba gị ume ka i lerukwuo anya n’ihe ndị Baịbụl kwuru. Maka gịnị? Maka na ihe ndị Baịbụl kwuru na ha ga-eme dị iche n’ihe ụmụ mmadụ kwuru na ha ga-eme. Ọ bụ Chineke kwere anyị nkwa ndị dị na Baịbụl. Lee ihe mere nkwa Chineke kwere ji dị iche ná nkwa ụmụ mmadụ kwere:

  •   Chineke na-eme ihe ọ bụla o kwuru. Baịbụl sịrị na Chineke “enweghị ike ịgha ụgha.” (Taịtọs 1:2) Ihe ọzọ bụ na ọ bụ naanị Chineke ga-ekwuli ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Aịzaya 46:10) E nwere ọtụtụ ihe dị na Baịbụl na-egosi na ihe ọ bụla Chineke kwuru na-eme. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe ndị ahụ, lee vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu?

  •   Chineke nwere ike ọ ga-eji akwụsị nsogbu anyị niile. Baịbụl kwuru na Chineke nwere ike o ji ‘eme ihe ọ bụla dị ya mma.’ (Abụ Ọma 135:​5, 6) Ihe ọ pụtara bụ na o nweghị ihe ga-emeli ka Chineke ghara imezu nkwa ọ bụla o kwere. Ihe ọzọ bụ na Chineke chọrọ inyere anyị aka n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya.​—Jọn 3:16.

 I nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke chọrọ inyere anyị aka, nweekwa ike ọ ga-eji nyere anyị aka, oleezi ihe mere anyị ji na-enwe ọtụtụ nsogbu?’ Ị chọọ ịmata azịza ajụjụ a, lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?

 Olee otú ihe a niile Baịbụl kwuru ga-esi emezu?

 Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo nkwa niile o kwere. Alaeze ya bụ ọchịchị dị n’eluigwe. Ọ họpụtala Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Eze Alaeze ahụ, o nyekwala ya ike ịna-elekọta ụwa na ndị bi na ya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwọrọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ ji nri, mee ka ifufe kwụsị, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Mak 4:39; 6:​41-44; Luk 4:40; Jọn 11:​43, 44) O si otú a gosi ihe ndị ọ ga-emere anyị ma Alaeze Chineke chịwa ụwa.

 Ị chọọ ịmatakwu uru Alaeze Chineke ga-abara gị, lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

 Olee mgbe ihe ndị Baịbụl kwuru ga-emezu?

 Ha ga-eme n’oge na-adịghị anya. Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ha ga-eme n’oge na-adịghị anya? Baịbụl kwuru ihe dị iche iche a ga-eji amata na o ruwela mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa. (Luk 21:​10, 11) Anyị na-ahụ ka ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru na-eme n’ụwa ugbu a.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?

 Olee otú ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu ga-esi baara gị uru taa?

 Otu n’ime ndị so dee Baịbụl sịrị na “olileanya a anyị nwere ji ndụ anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri si ejide ụgbọ mmiri.” (Ndị Hibru 6:19) Nko e ji ejide ụgbọ mmiri na-eme ka ụgbọ mmiri kwụrụ chịm ma e nwee ebili mmiri. Otú ahụkwa ka olileanya anyị nwere n’ihe ndị Baịbụl kwuru na-eme ka anyị kwụsie ike n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị nwere. Olileanya a nwere ike ime ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị, obi eruokwa anyị ala. O nwedịrị ike ime ka ahụ́ na-agbasi anyị ike.​—1 Ndị Tesalonaịka 5:8.