Ozi Ọma Mak Dere 6:1-56

  • Ndị obodo Jizọs jụrụ ya (1-6)

  • Jizọs gwara ndịozi ya otú ha ga-esi aga ozi ọma (7-13)

  • Jọn Onye Na-eme Baptizim nwụrụ (14-29)

  • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke ise nri (30-44)

  • Jizọs jere ije n’elu mmiri (45-52)

  • Ọ gwọrọ ndị mmadụ na Genesaret (53-56)

6  O si n’ebe ahụ pụọ banye n’obodo ya.+ Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya.  Mgbe Ụbọchị Izu Ike ruru, ọ malitere izi ihe n’ụlọ nzukọ. O jukwara ọtụtụ n’ime ndị nụrụ ihe ọ na-akụzi anya. Ha wee, sị: “Olee ebe nwoke a si mụta ihe ndị a?+ Gịnị mere e ji nye ya amamihe a? Oleekwa otú o si arụli ọrụ ebube ndị ahụ?+  Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà,+ nwa Meri?+ Ọ́ bụghịkwa nwanne Jems,+ Josef, Judas, na Saịmọn?+ Ọ̀ bụ na anyị na ụmụnne ya ndị nwaanyị ebighị n’ebe a?” N’ihi ya, ha anabataghị ya.  Ma Jizọs gwara ha, sị: “A na-asọpụrụ onye amụma ma e wezụga n’obodo ya nakwa n’etiti ndị ikwu ya nakwa n’ụlọ ya.”+  N’ihi ya, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube n’ebe ahụ ma e wepụ ibikwasị mmadụ ole na ole na-arịa ọrịa aka ma gwọọ ha.  N’eziokwu, o juru ya anya na ha enweghị okwukwe. O wee gazuo obodo nta dị iche iche, na-ezi ihe.+  O wee kpọọ ndịozi ya iri na abụọ, bido izipụ ha abụọ abụọ+ ma nye ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.*+  Ọ gwakwara ha ka ha ghara iji ihe ọ bụla gaa, ma e wepụ mkpara. Ọ sịrị ha ejila achịcha, obere akpa nri, na ego* ha ga-etinye n’obere akpa ego ha na-eke n’úkwù.+  Ọ sịkwara ha eyila uwe abụọ,* ma ọ sịrị ha yiri akpụkpọ ụkwụ. 10  Ọ gwakwara ha, sị: “N’ụlọ ọ bụla unu banyere, nọrọnụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu si na ya pụọ.+ 11  N’ebe ọ bụla a na-anabataghị unu ma ọ bụ gee unu ntị, mgbe unu na-apụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu ka ọ bụụrụ ha ihe àmà.”+ 12  Ha wee gaa na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ka ha chegharịa.+ 13  Ha chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ,+ teekwa ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa mmanụ ma gwọọ ha. 14  Eze Herọd nụrụ ihe a n’ihi na a na-anụ aha Jizọs n’ebe niile. Ndị mmadụ nọkwa na-asị: “A kpọlitela Jọn Onye Na-eme Baptizim n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.”+ 15  Ma ụfọdụ ndị nọ na-asị: “Ọ bụ Ịlaịja.” Ndị ọzọ na-asịkwa: “Ọ bụ onye amụma nke dị ka otu n’ime ndị amụma e nwere n’oge ochie.”+ 16  Ma mgbe Herọd nụrụ ya, ọ sịrị: “A kpọlitela Jọn ahụ m gbupụrụ isi n’ọnwụ.” 17  N’ihi na Herọd zipụrụ ndị mmadụ, ha agaa jide Jọn, kee ya agbụ ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya, onye ọ lụrụ.+ 18  N’ihi na Jọn nọ na-agwa Herọd, sị: “Ọ dịghị mma na ị kpọọrọ nwunye nwanne gị nwoke lụwa.”+ 19  N’ihi ya, Herodias buuru Jọn iwe n’obi, chọọkwa igbu ya. Ma, o nweghị ike igbu ya 20  n’ihi na Herọd na-atụ Jọn egwu maka na ọ ma na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ,+ ọ nọkwa na-echebe ya. Mgbe ọ bụla ọ nụrụ ihe Jọn kwuru, ọ naghị ama ihe ọ ga-eme. Ma, ọ na-eji obi ụtọ ege ya ntị. 21  Ọ dabaara Herodias otu ụbọchị na Herọd kpọrọ ndị nọ n’ọkwá ukwu na ndị ọchịagha ya na ndị a ma ama na Galili+ oriri anyasị n’ụbọchị ọ na-eme ememme ncheta ọmụmụ ya.+ 22  Ada Herodias batara gbaa egwú ma mee ka obi dị Herọd na ndị ha na ya nọ na-eri ihe mma. Eze sịrị nwa agbọghọ ahụ: “Rịọ m ihe ọ bụla ị chọrọ. M ga-enye gị ya.” 23  Ọ ṅụụrụ ya iyi, sị: “Ihe ọ bụla ị rịọrọ m, m ga-enye gị ya, ọ bụrụgodị na o ruru ọkara alaeze m.” 24  O wee gaa jụọ nne ya, sị: “Gịnị ka m ga-arịọ?” Nne ya sịrị ya: “Isi Jọn Onye Na-eme Baptizim.” 25  Ọ gakwuuru eze ozugbo kwuo ihe ọ chọrọ. Ọ sịrị: “Achọrọ m ka i bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim ozugbo n’efere mbadamba.”+ 26  Ọ bụ eziokwu na ihe a ọ rịọrọ wutere eze nke ukwuu, ma eze achọghị ileghara ihe ọ rịọrọ ya anya n’ihi iyi ọ ṅụrụ nakwa n’ihi ndị ọbịa ya. 27  Eze zipụrụ otu onye nche ozugbo ma nye ya iwu ka o bute isi Jọn. O wee gaa gbupụ ya isi n’ụlọ mkpọrọ 28  ma bute isi ya n’efere mbadamba. O bunyere ya nwa agbọghọ ahụ, nwa agbọghọ ahụ ebunye ya nne ya. 29  Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ ihe a, ha bịara buru ozu ya, gaa lie n’ebe a na-eli ozu.* 30  Ndịozi iri na abụọ ahụ zukọtara n’ebe Jizọs nọ ma kọọrọ ya ihe niile ha mere na ihe ha kụziiri ndị mmadụ.+ 31  O wee sị ha: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.”+ O kwuru ya maka na ọtụtụ ndị na-abịa ma na-ala, ha enweghịkwa ohere ọ bụla, ma ohere iri nri. 32  Ha wee jiri ụgbọ mmiri gawa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị ka ha nọrọ naanị ha.+ 33  Ma ndị mmadụ hụrụ ka ha na-aga, ọtụtụ ndị matakwara. Ha wee jiri ụkwụ si n’obodo niile buru Jizọs na ndịozi ya ụzọ gbaruo n’ebe ahụ. 34  Mgbe ha si n’ụgbọ pụta, ọ hụrụ ìgwè mmadụ, ya emetere ha ebere+ n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.+ 35  Ugbu a mgbede eruwela. Ndị na-eso ụzọ ya wee bịakwute ya, sị ya: “Ebe a dịpụrụ adịpụ, chi ejiwekwala.+ 36  Gwa ha ka ha lawa, ka ha gaa n’ime obodo nakwa n’obodo nta ndị dị gburugburu ebe a zụrụ ihe ha ga-eri.”+ 37  Ọ sịrị ha: “Nyenụ ha nri ka ha rie.” Ha wee sị ya: “Ọ̀ bụ anyị gaa zụta achịcha ruru narị mkpụrụ ego dinarịọs* abụọ (200) nye ha ka ha rie?”+ 38  Ọ sịrị ha: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtara, ha sịrị: “Achịcha ise na azụ̀ abụọ.”+ 39  O wee gwa mmadụ niile ka ha nọdụ n’ìgwè n’ìgwè n’elu ahịhịa.+ 40  Ha wee nọdụ n’ìgwè n’ìgwè. Ụfọdụ dị otu narị mmadụ, ụfọdụ adịrị iri ise. 41  O weere ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe ma gọzie ha.+ O wee nyawaa ogbe achịcha ndị ahụ malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-enye ìgwè mmadụ ahụ. O kekwaara mmadụ niile azụ̀ abụọ ahụ. 42  Ha niile wee rie, rijuo afọ. 43  Ha tụtụkọtara ibé achịcha ndị e rifọrọ erifọ, ya eju nkata iri na abụọ, n’agụnyeghị azụ̀ ha tụtụkọtara.+ 44  Ndị riri achịcha ahụ dị puku ụmụ nwoke ise (5,000). 45  Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya ozugbo ka ha banye n’ụgbọ ma buru ya ụzọ gawa n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ, n’ebe dị Betsaịda nso. Ma, ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa.+ 46  Ma mgbe ọ sịchara ha gaa nke ọma, ọ gawara n’ugwu ka o kpee ekpere.+ 47  Mgbe chi jiwere, ụgbọ mmiri ahụ nọ n’etiti oké osimiri. Ma, ọ nọ naanị ya n’elu ala.+ 48  Mgbe ọ hụrụ na ọ na-esiri ha ike ịkwọ ụgbọ ahụ n’ihi na ifufe na-efesi ike, ọ bịawara n’ebe ha nọ. Ọ bụ n’ihe dị ka oge nche nke anọ nke abalị.* Ọ nọ na-eje ije n’elu oké osimiri ka ọ na-agakwuru ha. Ma, o mere ka ọ̀ chọrọ ịgafere ha. 49  Mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha na-ahụ. Ha wee tie mkpu, 50  n’ihi na ha niile hụrụ ya, obi amapụ ha. Ma, ọ gwara ha okwu ozugbo, sị: “Nweenụ obi ike. Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”+ 51  O wee banye n’ụgbọ ahụ ha nọ, ifufe ahụ akwụsị. O juru ha ezigbo anya 52  n’ihi na ha aghọtabeghị ihe ha kwesịrị ịghọta n’ọrụ ebube ahụ o ji achịcha rụọ. Kama, ọ ka na-esiri obi ha ike ịghọta ihe. 53  Mgbe ha rutere n’ofe nke ọzọ n’elu ala, ha banyere Genesaret ma kegide ụgbọ ha n’akụkụ mmiri ahụ.+ 54  Ma ozugbo ha pụtara n’ụgbọ ahụ, ndị mmadụ matara onye ọ bụ. 55  Ha wee gbagharịa n’ógbè ahụ niile malite iji ihe e ji edina ala na-ebute ndị ahụ́ na-enye nsogbu n’ebe ha nụrụ na ọ nọ. 56  N’obodo nta ọ bụla ma ọ bụ n’obodo ukwu ọ bụla ọ banyere, ndị mmadụ na-ebusa ndị ọrịa n’ọma ahịa. Ha na-arịọkwa ya ka ha bitụ naanị ọnụ ọnụ uwe elu ya aka.+ Ndị niile bitụrụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka gbakere.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Na Grik, “ego ọla kọpa.”
Ma ọ bụ “ka ha ghara ịchịrị uwe ọzọ.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Gụọ B14.
Ya bụ, malite n’ihe dị ka elekere atọ n’ime abalị ruo mgbe anyanwụ wara n’ihe dị ka elekere isii n’ụtụtụ.