Aịzaya 2:1-22

  • E buliri ugwu Jehova elu (1-5)

    • Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè (4)

  • A ga-eweda ndị dị mpako ala n’ụbọchị Jehova (6-22)

2  Ihe a ka Aịzaya nwa Emọz hụrụ n’ọhụụ gbasara Juda na Jeruselem:+   N’oge ikpeazụ,Ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu yaGa-akwụsi ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.+ A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile. Mba niile ga-enurukwa na-agbago na ya.+   Ọtụtụ ndị ga-ejekwa, sị: “Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+ Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya. Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na a ga-esi na Zayọn nye iwu,*Sikwa na Jeruselem kwuo ihe Jehova kwuru.+   Ọ ga-ekpere mba dị iche iche ikpe,Doziekwara ọtụtụ ndị okwu ha. Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+ Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha. Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+   Ndị ezinụlọ Jekọb, bịanụKa anyị jee ije n’ìhè Jehova.+   Chineke, ị hapụla ndị gị, bụ́ ndị ezinụlọ Jekọb,+N’ihi na ha emewela ọtụtụ ihe a na-eme n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ha na-eme anwansi*+ ka ndị Filistia. Ha na ụmụ ndị ala ọzọ bikwa.   Ọlaọcha na ọlaedo juru eju n’obodo ha. Akụ̀ ha anaghịkwa agwụ agwụ. Ịnyịnya juru eju n’obodo ha. Ụgbọ ịnyịnya ha bụkwa agụta agụta.+   Chi dị iche iche na-abaghị uru juru n’obodo ha.+ Ihe ha na-akpọrọ isiala bụ ihe ha ji aka ha rụọ,Ya bụ, ihe mkpịsị aka ha rụrụ.   Otú a ka ha si eweda onwe ha ala, na-emenyekwa onwe ha ihere. Ị gaghịkwa agbaghara ha. 10  Banyenụ n’ọgba nkume, zookwanụ n’ájáN’ihi na ike Jehova na-emenye ụjọ. Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu.+ 11  A ga-eme ka ndị dị mpako dị ala. A ga-ewedakwa ndị dị elu ala. Ọ bụ naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ. 12  N’ihi na ọ bụ ụbọchị Jehova nke ụsụụ ndị agha.+ Ọ ga-abịa n’ihi ndị niile dị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu. Ọ ga-abịakwa n’ihi mmadụ niile, ma onye ukwu ma onye nta.+ 13  Ọ ga-abịa n’ihi osisi sida niile dị na Lebanọn, ma ndị nke dị elu ma ndị nke e buliri elu. Ọ ga-abịakwa n’ihi osisi ook niile dị na Beshan. 14  Ụbọchị ahụ ga-abịakwa n’ihi ugwu ukwu niile dị eluNa ugwu nta niile dị elu. 15  Ọ ga-abịakwa n’ihi ụlọ nche niile dị elu, nakwa n’ihi mgbidi niile a rụsiri ike. 16  Ọ ga-abịakwa n’ihi ụgbọ mmiri niile na-aga Tashish+Nakwa n’ihi ụgbọ epeepe niile mara ezigbo mma. 17  A ga-eme ka ndị dị mpako dị ala. A ga-ewedakwa ndị dị elu ala. Ọ bụ naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ. 18  A gaghị ahụkwa chi dị iche iche na-abaghị uru.+ 19  Mgbe Jehova ga-ebili mee ka ụwa maa jijiji,Ndị mmadụ ga-abanye n’ọgba nkume,Banyekwa n’ime ọnụ ndị dị n’ala,+N’ihi na ike ya na-emenye ụjọ. Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu.+ 20  N’ụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-atụfusị chi ha dị iche iche na-abaghị uru, ma ndị e ji ọlaọcha mee ma ndị e ji ọlaedo mee,Ndị ha meere onwe ha ka ha na-akpọrọ isiala. Ha ga-atụpụrụ ha nkapị na ụsụ,+ 21  Ka ha nwee ike banye n’oghere ndị dị n’oké nkumeNakwa n’ebe ndị gbawara agbawa ná nnukwu nkume,Mgbe Jehova ga-ebili mee ka ụwa maa jijiji,N’ihi na ike ya na-emenye ụjọ. Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu. 22  Maka ọdịmma unu, unu atụkwasịzila mmadụ nkịtị obi,Onye naanị ihe ji ya ndụ bụ ume ọ na-eku.* Gịnị mere a ga-eji jiri ya kpọrọ ihe?

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “kwuo ihe a ga-eme.”
Ma ọ bụ “majik.”
Ma ọ bụ “Onye na-eji imi ya eku ume.”