Aịzaya 35:1-10

  • Ụwa ga-abụ paradaịs ọzọ (1-7)

    • Ndị ìsì ga-ahụwa ụzọ, ndị ntị chiri anụwakwa ihe (5)

  • Ndị a gbapụtara ebe e ji ha eji ga na-aga n’Ụzọ Dị Nsọ (8-10)

35  Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị.+ Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.+   Okooko osisi ga-ejurịrị na ya.+ Ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ. Ọ ga-adị ebube ka Lebanọn,+Maakwa mma ka Kamel+ na Sharọn.+ Ndị mmadụ ga-ahụ ebube Jehova, ya bụ, otú Chineke anyị si maa mma dị ebube.   Meenụ ka aka na-adịghị ike dị ike,Meekwanụ ka ikpere na-ama jijiji sie ike.+   Sịnụ ndị na-echegbu onwe ha: “Obi sie unu ike. Unu atụla egwu. Chineke unu ga-abịa ịkwụ ndị iro unu ụgwọ. Chineke ga-abịa ịta ha ahụhụ.+ Ọ ga-abịa zọpụta unu.”+   Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì,+Megheekwa ntị ndị ntị chiri.+   Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu ka mgbada.+ Onye ogbi* ga-etikwa mkpu ọṅụ.+ Mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa. Iyi ga na-asọkwa n’ọzara.   Ala kpọrọ nkụ ga-adị ka ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru. Ala mmiri na-adịghị ga-adịkwa ka isi mmiri.+ Ahịhịa ndụ na ahịhịa amị na ahịhịa papaịrọsGa-adị n’ebe nkịta ọhịa na-ebi, n’ebe ha na-anọkwa ezu ike.+   Okporo ụzọ ga-adị ebe ahụ.+ Ọ bụ ụzọ a na-akpọ Ụzọ Dị Nsọ. Onye rụrụ arụ agaghị akpa ụkwụ na ya.+ Ọ bụ naanị ndị kwesịrị ịga n’ụzọ ahụ ga na-aga na ya. E nweghị onye nzuzu ọ bụla ga-azọ ụkwụ na ya.   Ọdụm agaghị anọ ebe ahụ. O nweghịkwa anụ ọhịa ọjọọ ga-abịa na ya. O nweghị nke a ga-ahụ ebe ahụ.+ Naanị ndị ga na-aga n’ụzọ ahụ bụ ndị a gbapụtara ebe e ji ha eji.+ 10  Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta,+ tirikwa mkpu ọṅụ bata na Zayọn.+ Ha agaghị akwụsị ịna-enwe aṅụrị.+ Ha ga na-enwe obi ụtọ, na-enwekwa aṅụrị. Iru uju na ịsụ ude ga-alakwa kpamkpam.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ire onye ogbi.”