Mkpughe E Kpugheere Jọn 16:1-21

  • Efere asaa ihe juru na ha bụ iwe Chineke (1-21)

    • A wụpụrụ ihe dị n’efere ndị ahụ n’ụwa (2), n’oké osimiri (3), n’osimiri na n’isi mmiri dị iche iche (4-7), n’anyanwụ (8, 9), n’elu ocheeze anụ ọhịa (10, 11), n’osimiri Yufretis (12-16), na n’ikuku (17-21)

    • Agha Chineke ga-alụ n’Amagedọn (14, 16)

16  Anụkwara m oké olu nke si n’ebe nsọ ahụ+ gwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ, sị: “Gaanụ n’ụwa wụpụ iwe Chineke nke dị n’efere asaa ahụ.”+  Mmụọ ozi nke mbụ wee gaa n’ụwa wụpụ ihe dị n’efere ya.+ Ọnyá na-afụ ezigbote ụfụ+ wee pụta n’ahụ́ ndị nwere akara anụ ọhịa ahụ+ na ndị na-efe ihe ahụ yiri ya a kpụrụ akpụ.+  Mmụọ ozi nke abụọ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’oké osimiri.+ Ihe ahụ wee ghọọ ọbara+ dị ka nke onye nwụrụ anwụ. Ihe* niile dị ndụ n’oké osimiri nwụkwara.+  Mmụọ ozi nke atọ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’osimiri nakwa n’isi mmiri dị iche iche.+ Ha wee ghọọ ọbara.+  Anụkwara m ka mmụọ ozi nke na-ahụ maka mmiri sịrị: “Ị bụ Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi,+ onye dị adị na onye dịbu adị.+ Ị bụ onye ezi omume n’ihi ihe ndị a i kpebiri.+  Ha gburu* ndị nsọ na ndị amụma.+ Ọ bụ ya mere i ji nye ha ọbara ka ha ṅụọ.+ Ọ bụkwa ihe kwesịịrị ha.”+  Anụkwara m olu si n’ebe ịchụàjà ahụ sị: “Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ikpe gị ziri ezi, e kwesịkwara ịtụkwasị ya obi.”+  Mmụọ ozi nke anọ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’anyanwụ.+ E nyekwara anyanwụ ike ka o jiri ọkụ chagbuo ndị mmadụ.  E jikwa oké okpomọkụ mekpaa ndị mmadụ ahụ́. Ma ha echegharịghị, kama ha kwuluru Chineke.* Ha etoghị Chineke, onye nwere ikike ịta ha ahụhụ ndị a. 10  Mmụọ ozi nke ise wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’elu ocheeze anụ ọhịa ahụ. Alaeze anụ ọhịa ahụ wee gbaa ọchịchịrị,+ ndị mmadụ amalitekwa ịtabi ire ha n’ihi ahụ́ na-egbu ha mgbu. 11  Ma, ha ahapụghị ihe ọjọọ ha na-eme, kama ha kwuluru Chineke nke eluigwe n’ihi ahụ́ na-egbu ha mgbu na ọnyá dị ha n’ahụ́. 12  Mmụọ ozi nke isii wee wụnye ihe dị n’efere ya ná nnukwu osimiri Yufretis,+ mmiri ya atakpọọ+ iji doziere ndị eze+ si n’ebe ọwụwa anyanwụ ụzọ. 13  Ahụkwara m dragọn ahụ+ na anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ ka okwu na-adịghị ọcha* si n’ọnụ nke ọ bụla n’ime ha pụta. Okwu atọ ndị a si n’ọnụ ha pụta yiri mbàrá.* 14  Okwu ndị a si n’aka ndị mmụọ ọjọọ, ndị eze niile nọ n’ụwa nụkwara ha. Okwu ndị a mekwara ihe ndị dị ịtụnanya+ iji kpọkọta ndị eze ahụ maka agha+ a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ 15  Anụkwara m olu sịrị: “Ana m abịa ka onye ohi.+ Onye mụ anya,+ nke a na-anaraghịkwa uwe ya, ga-enwe obi ụtọ, n’ihi na ọ gaghị agba ọtọ na-ejegharị, ndị mmadụ ahụ ya, ihere emee ya.”+ 16  Okwu ndị ahụ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ kpọkọtakwara ndị eze ahụ n’ebe a na-akpọ Amagedọn* n’asụsụ Hibru.+ 17  Mgbe mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị n’efere ya n’ikuku, anụrụ m oké olu si n’ocheeze dị n’ebe nsọ ahụ.+ Ọ sịrị: “Ọ gwụla!” 18  Àmụ̀mà wee gbuo, mụ anụkwa olu dị iche iche, égbè eluigwe agbaakwa, enweekwa oké ala ọma jijiji nke dị egwu, nke a na-enwetụbeghịkwa ụdị ya kemgbe e kere mmadụ n’ụwa.+ 19  Obodo ukwu ahụ+ kewakwara ụzọ atọ, obodo dị iche iche ná mba niile adaakwa. Chineke chetakwara Babịlọn Ukwu ahụ,+ ka o mee ka ọ ṅụọ mmanya dị n’iko nke iwe ya dị ọkụ.+ 20  Agwaetiti niile gbakwara ọsọ. O nweghịkwa ebe a hụrụ ugwu dị iche iche.+ 21  Ọtụtụ nnukwu akụ́ mmiri ígwé, ndị nke ọ bụla n’ime ha dị otu talent n’arọ,* wee si n’eluigwe dakwasị ndị mmadụ.+ Ha kwulukwara Chineke n’ihi akụ́ mmiri ígwé a+ o ji taa ha ahụhụ. Ahụhụ ọ takwara ha enweghị atụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”
Na Grik, “wụfuru ọbara.”
Gụọ A5.
Na Grik, “aha Chineke.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “akịrị.”
Grik, Har Ma·ge·don′. E si n’okwu Hibru pụtara “Ugwu Megido” nweta ya.
Otu talent ndị Grik bụ kilogram 20.4. Gụọ B14.