Mkpughe E Kpugheere Jọn 3:1-22

  • Ihe a gwara ndị Sadis (1-6), ndị Filadelfịa (7-13), na ndị Leodisia (14-22)

3  “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Sadis akwụkwọ, sị: Onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke,+ onye jikwa kpakpando asaa ahụ,+ kwuru ihe ndị a: ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. A na-ele unu anya ka ndị dị ndụ, ma unu nwụrụ anwụ.+  Na-echenụ nche,+ meekwanụ ka ihe ndị na-achọ ịnwụ anwụ dị ike, n’ihi na ahụla m na unu emechabeghị ihe niile Chineke m chọrọ ka unu mee.  N’ihi ya, na-echetanụ otú unu si nụ ozi e ziri unu na otú unu si nabata ya. Na-emenụ ya, chegharịakwanụ.+ N’eziokwu, ọ bụrụ na unu etetaghị, m ga-abịa ka onye ohi,+ unu agaghịkwa ama oge m ga-abịa.+  “‘Ma, unu nwere mmadụ ole na ole na Sadis, ndị na-emerụghị uwe ha.+ Ha ga-eyikwa uwe na-acha ọcha soro m na-eje ije,+ n’ihi na ha ruru eru.  Onye meriri n’agha+ ga-esi otú ahụ yiri uwe na-acha ọcha.+ M gaghịkwa ehichapụ aha ya n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwu n’ihu Nna m na n’ihu ndị mmụọ ozi ya na m ma aha ya.+  Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’  “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Filadelfịa akwụkwọ, sị: Onye dị nsọ,+ onye eziokwu,+ onye ji mkpịsị ugodi Devid,+ onye na-emeghe ụzọ ka onye ọ bụla ghara imechi ya, onye na-emechikwa ya ka onye ọ bụla ghara imeghe ya, kwuru ihe ndị a:  ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. Emegheerela m unu ụzọ ọ na-enweghị onye ga-emechili.+ Amakwa m na unu esichaghị ike, ma unu na-eme ihe m kwuru, unu kwụsikwara ike n’ebe m nọ.  M ga-akpọta ndị nke* Setan, ndị na-ekwu na ha bụ ndị Juu, ma ha abụghị,+ kama ha na-agha ụgha. M ga-eme ka ha bịa kpọọ isiala n’ụkwụ unu, meekwa ka ha mara na ahụrụ m unu n’anya. 10  N’ihi na unu tachiri obi ka m,+ m ga-echebe unu n’oge ule,+ nke a ga-enwe n’ụwa niile, iji lee mmadụ niile ule. 11  Ana m abịa ngwa ngwa.+ Na-emenụ ihe dị mma unu na-eme, ka onye ọ bụla wee ghara iwere okpueze unu.+ 12  “‘M ga-eme ka onye meriri n’agha bụrụ ogidi n’ụlọ nsọ Chineke m. O nweghịkwa ihe ga-eme ka o si ebe ahụ pụọ ọzọ. Ihe m ga-ede n’ahụ́ onye ahụ bụ aha Chineke m+ na aha ọhụrụ m+ na aha obodo ukwu nke Chineke m, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ+ nke si n’eluigwe ebe Chineke m nọ na-agbadata. 13  Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’ 14  “Degara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Leodisia+ akwụkwọ, sị: Onye a na-akpọ Amen,+ ezigbo onye àmà+ a tụkwasịrị obi,+ onye mbụ Chineke kere,+ kwuru ihe ndị a: 15  ‘Ama m ihe ndị unu na-eme. Unu ajụghị oyi, unu ekpoghịkwa ọkụ. Ọ dị m ka ya bụrụ na unu jụrụ oyi ma ọ bụkwanụ na unu na-ekpo ọkụ. 16  Ebe ọ bụ na unu dị ṅaraṅara, unu ekpoghị ọkụ,+ unu ajụghịkwa oyi,+ m ga-agbụpụ unu n’ọnụ m. 17  N’ihi na unu na-asị: “Anyị bara ọgaranya,+ nweekwa akụnụba, ọ dịghịkwa ihe kọrọ anyị.” Ma, unu amaghị na unu na-ahụsi anya, bụrụkwa ndị e kwesịrị imetere ebere. Unu amaghịkwa na unu dara ogbenye, na unu kpuru ìsì, nakwa na unu gba ọtọ. 18  Ana m adụ unu ọdụ ka unu bịa ka m resị unu ọlaedo e ji ọkụ nụchaa, ka unu wee baa ọgaranya. Ka m resịkwa unu uwe na-acha ọcha, ka unu wee yiri uwe, ma ọ́ bụghị ya, ndị ọzọ ga-ahụ ọtọ unu, ihere emee unu.+ Ka m resịkwa unu ọgwụ anya unu ga-ete n’anya unu+ ka unu hụwa ụzọ.+ 19  “‘Ndị niile m hụrụ n’anya ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị.+ N’ihi ya, chegharịanụ,+ jirikwanụ obi unu niile fewe Chineke. 20  Eguzo m n’ọnụ ụzọ na-akụ aka. E nwee onye nụrụ olu m ma meghee ụzọ, m ga-abata n’ụlọ ya, mụ na ya erikọọ nri anyasị. 21  M ga-eme ka onye meriri n’agha+ soro m nọdụ ala n’ocheeze m,+ otú ahụ mụnwa meriri wee soro Nna m nọdụ ala+ n’ocheeze ya. 22  Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “si n’ụlọ nzukọ.”