Gaa n'Isiokwu

Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?

Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl kwuru na n’ime ihe niile Chineke kere dị n’ụwa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-aga eluigwe. (Mkpughe 14:​1, 3) Ihe mere ha ji aga eluigwe bụ ka ha soro Jizọs chịa dị ka eze na ndị nchụàjà. (Luk 22:​28-30; Mkpughe 5:​9, 10) A ga-akpọlite imirikiti ụmụ mmadụ ndị ọzọ ka ha biri na paradaịs n’ụwa a.​—Abụ Ọma 37:​11, 29.

 O nweghị ebe ọ bụla na Baịbụl e kwuru okwu eluigwe ebe nkịta ma ọ bụ anụmanụ ndị ọzọ ndị mmadụ ji mere enyi na-aga ma ha nwụọ. E nwekwara ezigbo ihe mere na Baịbụl ekwughị ụdị ihe ahụ. Ụmụ anụmanụ agaghị emeli ihe ndị ga-eme ka ha ruo eruo ịbụ “ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe.” (Ndị Hibru 3:1) Ihe ndị so n’ihe mmadụ ga-eme ka o ruo eruo ịga eluigwe bụ ịmata Chineke na Jizọs nke ọma, inwe okwukwe, na irubere Chineke isi. (Matiu 19:17; Jọn 3:16; 17:3) Ọ bụ naanị ụmụ mmadụ ka Chineke kere ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—Jenesis 2:​16, 17; 3:​22, 23.

 Tupu ihe ọ bụla e kere n’ụwa enwee ike ịga eluigwe, a ga-akpọliterịrị ya n’ọnwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:42) Baịbụl kọrọ otú e si kpọlite ọtụtụ ndị n’ọnwụ. (1 Ndị Eze 17:​17-24; 2 Ndị Eze 4:​32-37; 13:​20, 21; Luk 7:​11-15; 8:​41, 42, 49-56; Jọn 11:​38-44; Ọrụ Ndịozi 9:​36-42; 20:​7-12) Ma e nweghị nke n’ime ha bụ anụmanụ, ha niile bụcha mmadụ.

 Ụmụ anụmanụ hà nwere mkpụrụ obi?

 Mba. Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ nakwa ụmụ anụmanụ bụ mkpụrụ obi. (Ọnụ Ọgụgụ 31:28) Mgbe e kere nwoke mbụ bụ́ Adam, e nyeghị ya mkpụrụ obi kama ọ ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.’ (Jenesis 2:7) Ihe abụọ Chineke ji kee mkpụrụ obi bụ: “ájá si n’ala” na “ume ndụ.”

 Mkpụrụ obi ọ̀ na-anwụ anwụ?

 Ee, Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Levitikọs 21:11; Ezikiel 18:20) Ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ nwụọ, ha na-alaghachi n’ájá. (Ekliziastis 3:​19, 20) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha adịghịzi ndụ. a

 Ụmụ anụmanụ hà na-eme mmehie?

 Mba. Ime mmehie pụtara mmadụ ịda iwu Chineke n’otú o si chee echiche, lee ihe anya, ma ọ bụ mee ihe. Tupu ihe e kere eke emee mmehie, ọ ga-enwerịrị ike ikpebi ime ihe dị mma ma ọ bụ ihe dị njọ, ma ụmụ anụmanụ agaghị emeli ụdị ihe a. Ha anaghị eche echiche, kama ha na-eme ihe ọ bụla batara ha n’obi n’obere oge ha na-adịru ndụ. (2 Pita 2:12) Oge ahụ gwụ, ha anwụọ n’agbanyeghị na ha emeghị mmehie.

 Ọ̀ dị mma ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala?

 Mba. Chineke nyere ụmụ mmadụ ike ịchị na ilekọta ụmụ anụmanụ ma ọ bụghị ịrụsa ha arụrụala. (Jenesis 1:28; Abụ Ọma 8:​6-8) Chineke ji ndụ anụmanụ ọ bụla kpọrọ ihe, ma nke obere ụmụ nnụnụ. (Jona 4:11; Matiu 10:29) Ọ gwara ndị na-efe ya ka ha na-elekọta ụmụ anụmanụ.​—Ọpụpụ 23:12; Diuterọnọmi 25:4; Ilu 12:10.

a Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi nke 6 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?