Ọpụpụ 23:1-33

  • Iwu e nyere ndị Izrel (1-19)

    • Gbasara omume ọma na ịkwụwa aka ọtọ (1-9)

    • Gbasara ụbọchị izu ike na ememme dị iche iche (10-19)

  • Mmụọ ozi ga-edu ndị Izrel (20-26)

  • Ala ndị Izrel ga-ebichi na ókè ha (27-33)

23  “Akọsala akụkọ na-abụghị eziokwu.+ Adụnyerela onye ajọ omume úkwù gaa gbaa akaebe ụgha ka i megide mmadụ.+  Esorola ìgwè mmadụ mee ihe ọjọọ. Agbakwala akaebe ga-eme ka a ghara ikpe ikpe ziri ezi maka na ị chọrọ ime ihe ga-adị ìgwè mmadụ mma.*  Mgbe ị na-eleba anya n’okwu ogbenye, ejila maka na ọ bụ ogbenye kpelaara ya ikpe.+  “Ọ bụrụ na ị hụ ehi ma ọ bụ jakị onye iro gị ka ọ na-akpafu, kpụrụ ya kpụghachiri ya.+  Ọ bụrụ na ị hụ jakị onye kpọrọ gị asị ka ọ dara makpuru n’ala n’ihi ibu o bu, ahapụla ya pụwa. Nyere onye ahụ aka tọtuo ibu anụ ahụ bu.+  “Ekpela ikpe na-ezighị ezi mgbe ị na-ekpe ikpe onye dara ogbenye.+  “Ya enwela ihe ga-ejikọ gị na ebubo* ụgha. Egbukwala onye aka ya dị ọcha na onye ezi omume, n’ihi na agaghị m akpọ onye ajọ omume onye ezi omume.*+  “Anala aka azụ* n’ihi na ịna aka azụ na-emegharị ndị ikpe anya.* O nwekwara ike ime ka ndị bụ́ ezigbo mmadụ gbanwee okwu ha.+  “Emegbula onye mbịarambịa. Unu ma otú ihe na-adịrị onye mbịarambịa n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+ 10  “Afọ isii ka ị ga-agha mkpụrụ n’ala gị, ghọrọkwa mkpụrụ ya.+ 11  Ma n’afọ nke asaa, ị gaghị akọ ya ihe. Ị ga-ahapụ ya ka ọ tọgbọrọ nkịtị. Ndị dara ogbenye ga-eri ihe dị na ya, anụ ọhịa ga-erikwa ihe ha rifọrọ. Ọ bụ ihe ị ga-eme ubi vaịn gị na ubi oliv gị. 12  “Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị. Ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na jakị gị zuo ike, nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa ezuokwa ike.+ 13  “Lezienụ anya mee ihe niile m gwara unu.+ Unu akpọkwala aha chi ọ bụla ọzọ. E kwesịghị ịnụ aha ha n’ọnụ unu.+ 14  “Ugboro atọ n’afọ ka ị ga-emere m ememme.+ 15  Ị ga na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa otú m nyere gị n’iwu, n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,*+ n’ihi na ọ bụ n’oge ahụ ka i si n’Ijipt pụta. E nweghị onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+ 16  Ị ga-emekwa Ememme Owuwe Ihe Ubi* nke mkpụrụ mbụ kara aka ị rụtara ná mkpụrụ ị ghara n’ubi.+ Ị ga-emekwa Ememme Ịchịkọbata Ihe* ná ngwụcha afọ, mgbe i si n’ubi na-ewebata ihe ị rụtara.+ 17  Ugboro atọ n’afọ, ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu ezi Onyenwe unu, bụ́ Jehova.+ 18  “Mgbe i ji anụ na-achụrụ m àjà, achụkọtala ọbara ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha. Abụba ọ bụla e ji chụọrọ m àjà n’oge ememme m ekwesịghị ịdị ruo ụtụtụ. 19  “Ị ga-eweta mkpụrụ kacha mma ná mkpụrụ mbụ kara aka ala gị mepụtara n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị.+ “Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.+ 20  “M na-ezipụ mmụọ ozi ka o butere unu ụzọ,+ ka o chebe unu n’ụzọ ma kpọbata unu n’ebe m kwadebere.+ 21  Geenụ ya ntị, rubekwanụ isi n’ihe o kwuru. Unu enupụrụla ya isi n’ihi na ọ gaghị agbaghara unu mmehie unu,+ maka na ọ ga-abịa n’aha m.* 22  Ma, ọ bụrụ na unu erube nnọọ isi n’ihe o kwuru ma mee ihe niile m kwuru, m ga-ewesa ndị iro unu iwe, mesiekwa ndị na-emesi unu ike ike. 23  N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere unu ụzọ ma kpọbata unu n’ala ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Kenan, ndị Haịvaịt, nakwa n’ala ndị Jebus. M ga-ekpochapụkwa ha.+ 24  Unu akpọrọla chi ha isiala. Unu ekwela ka a rata unu ife ha ofufe. Unu emekwala ihe ndị ha na-eme.+ Kama, unu ga-akwatu chi ha, kụrisịakwa ogidi arụsị ha.+ 25  Feenụ Jehova bụ́ Chineke unu,*+ ọ ga-agọzi nri unu na mmiri unu.+ M ga-ewepụrụ unu ọrịa.+ 26  Ime agaghị na-apụ ụmụ nwaanyị unu, unu agaghịkwa enwe ụmụ nwaanyị aga.+ M ga-eme ka unu dịtee ndụ aka.* 27  “M ga-eme ka ndị niile unu ga-ezute na-atụ m ụjọ tupu unu erute.+ M ga-etinye ha n’ọgba aghara. M ga-emekwa ka ndị iro unu niile gbaara unu ọsọ.*+ 28  Tupu unu erute, m ga-eme ka ụjọ jide ha.+ Ụjọ ga-emekwa ka ndị Haịvaịt, ndị Kenan, na ndị Het gbaara unu ọsọ.+ 29  Agaghị m achụpụrụ unu ha n’otu afọ, ka ala ahụ ghara ịtọgbọrọ nkịtị, anụ ọhịa ewee ju ebe niile tagbuwe unu.+ 30  M ga-eji nke nta nke nta chụpụrụ unu ha, ruo mgbe unu mụrụ ọmụmụ bichie ala ahụ.+ 31  “M ga-eme ka ókè nke ala unu malite n’Oké Osimiri Uhie ruo n’oké osimiri ndị Filistia, malitekwa n’ala ịkpa ruo n’Osimiri Yufretis;+ n’ihi na m ga-enyefe ndị bi n’ala ahụ n’aka unu, unu ga-achụpụkwa ha.+ 32  Unu na ha ma ọ bụ chi ha agbala ndụ.+ 33  Ha ekwesịghị ibi n’ala unu, ka ha ghara ime ka unu mehie m. Ọ bụrụ na unu efee chi ha, ọ ga-abụrụ unu ọnyà.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ga-adị ọtụtụ ndị mma.”
Na Hibru, “okwu.”
Ma ọ bụ “agaghị m ahapụ onye ajọ omume.”
Na Hibru, “na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ nke ọma kpuo ìsì.”
Ma ọ bụ “Erila ngarị.”
Gụọ B15.
A na-akpọkwa ya Ememme Ụlọ Ndò (Ụlọikwuu).
A na-akpọkwa ya Ememme Izu ma ọ bụ Pentikọst.
Na Hibru, “aha m dị n’ime ya.”
Hibru, “Jeerenụ Jehova bụ́ Chineke unu ozi.”
Ma ọ bụ “ụbọchị unu zuo ezuo.”
Ma ọ bụ “tụgharịara unu azụ ha.”