Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“O Doola M Anya na Agaghị M Agbanweli Ụwa A”

“O Doola M Anya na Agaghị M Agbanweli Ụwa A”
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1966

  • ABỤ M ONYE: FINLAND

  • NDỤ M BIRI: M NA-AGBA MBỌ KA IHE GBANWEE N’OBODO

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

Kemgbe m bụ nwata, ikiri oké ọhịa, okooko osisi, mmiri, na ihe ndị ọzọ na-amasịkarị m. Ezinụlọ anyị na-agakarị ekiri oké ọhia na ọdọ mmiri ndị mara mma e nwere n’obodo anyị bụ́ Jivaskila. Obodo a dị n’ebe etiti mba Finland. Ejighị m ụmụ anụmanụ egwuri egwu. Mgbe m bụ nwata, m na-achọ ịmakụ nkịta na nwamba ọ bụla m hụrụ. Mgbe m na-eto, otú ndị mmadụ si emesi ụmụ anụmanụ ike na-ewute m. M mechara sonyere òtù na-egbochi ndị mmadụ imesi ụmụ anụmanụ ike na igbuchapụ ha.

Ndị òtù anyị na-aga ebe dị iche iche agwa ọhaneze na otú ndị mmadụ si emesi ụmụ anụmanụ ike adịghị mma. Anyị na-ekesakwa akwụkwọ ndị anyị ji agwa ọhaneze ka ha kwụsị ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala. Anyị na-emekwa ngagharị iwe, na-ekwu ka e mechie ebe ndị a na-ere ihe ndị e ji ajị anụ mee nakwa ebe ndị a na-abọkasị ụmụ anụmanụ jiri ha na-akụzi ihe. Anyị bidodịrị òtù ọhụrụ nke na-ahụ maka ichebe ụmụ anụmanụ. Anyị na ndị gọọmenti na-esekarị okwu maka na anyị na-ada iwu ha mgbe ụfọdụ ka anyị wee hụ na ndị mmadụ mere ihe anyị chọrọ. Ndị uwe ojii nwụchiri m ọtụtụ ugboro ma kpụpụ m n’ụlọikpe.

Ihe na-enye m nsogbu n’obi abụghị naanị ihe gbasara ụmụ anụmanụ, nsogbu ndị e nwere n’ụwa na-ewutekwa m. M mechara rụọrọ òtù dị iche iche ọrụ, dị ka òtù na-ahụ maka ịgbatara ndị a na-emegbu emegbu ọsọ enyemaka na òtù na-agba mbọ ka a kwụsị imetọ ụwa. Eji m ike m niile rụọrọ ha ọrụ. M na-ekwuchite ọnụ ndị ogbenye, ndị agụụ na-agụgbu na ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.

Ma, ọ bịaziri doo m anya na agaghị m emeli ka ụwa dị mma. Ọ bụ eziokwu na òtù ndị ahụ mere ka e gbooro ndị mmadụ mkpa ha ụfọdụ, ma nsogbu ndị mmadụ nwere nọ na-aka njọ. O yiri ka ihe ọjọọ ọ̀ baala ndị mmadụ n’ụmị nke na o nwezighị onye chọrọ ịma ihe na-emenụ. Ihe niile a gwụrụ m ike.

 OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Ebe ọ bụ na m gaghị emeli ka ihe dị mma, m malitere iche echiche banyere Chineke nakwa Baịbụl. Mụ na Ndịàmà Jehova amụbuola Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na m ma na Ndịàmà Jehova dị obiọma ma hụ m n’anya, achọbeghị m ịgbanwe otú m si ebi ndụ n’oge ahụ. Ma ugbu a, ihe agbanweela.

M wepụtara Baịbụl m gụwa. Mgbe m na-agụ ya, o mere ka obi ruo m ala. M gụtara ebe ndị kwuru na anyị ekwesịghị ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala. Dị ka ihe atụ, Ilu 12:10 kwuru na “ezi mmadụ na-elekọta anụ ụlọ ya.” (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) M ghọtakwara na ọ bụghị Chineke kpatara nsogbu ndị juru n’ụwa. Kama, ihe kpatara ha bụ na ọtụtụ ndị anaghị eme ihe Chineke kwuru. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m mụtara na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nakwa na ọ na-enwere anyị ndidi.—Abụ Ọma 103:8-14.

Ọ bụ n’oge ahụ ka m zipụrụ otu mpempe akwụkwọ m ji kwuo ka e zitere m akwụkwọ aha ya bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Mgbe obere oge gafere, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ m gwa m na ha chọrọ ka mụ na ha mụwa Baịbụl, mụ ekweta. M bidokwara ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Nke ahụ mere ka ihe m na-amụta ruo m n’obi.

Baịbụl mere ka m gbanwee ọtụtụ ihe ná ndụ m. M kwụsịrị ịṅụ sịga na ịṅụ oké mmanya. M kwụsịkwara ikwu okwu ọjọọ ma dịwazie mma n’anya. M malitere irubere ndị ọchịchị isi. (Ndị Rom 13:1) M kwụsịkwara ndụ ọjọọ m na-ebi.

Ihe kacha siere m ike bụ ịpụta n’òtù ndị ahụ m nọ ma kwụsị ịrụrụ ha ọrụ. O were m ogologo oge tupu mụ ahapụchaa ha. M cheburu na ọ bụrụ na mụ ahapụ ha, na ha ga-eche na m na-agba ha mgba okpuru. Ma, m bịara ghọta na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dị mma. Ekpebiri m na m ga-eji ike m niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma nyere ndị ọzọ aka ka ha mụta banyere ya.—Matiu 6:33.

URU NDỊ M RITERELA:

N’oge mbụ, m na-ewere ụfọdụ ndị ka ndị ezigbo mmadụ, werekwa ndị ọzọ ka ndị ọjọọ. Anaghịkwa m achọ iji anya ahụ ndị ọ bụla m weere ka ndị ọjọọ. Ma, Baịbụl nyeere m aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. M na-agbalịzi ịhụ mmadụ niile n’anya otú a chọrọ ka Ndị Kraịst na-eme. (Matiu 5:44) Otu n’ime ụzọ ndị m si egosi na m hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Obi na-atọ m ụtọ na ozi ọma a na-eme ka ndị mmadụ na ibe ha dịrị ná mma, na-emekwa ka ha na-enwe obi ụtọ ma nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

Ime uche Jehova emeela ka obi na-eru m ala. Obi siri m ike na Onye kere ihe niile agaghị ekwe ka a na-emegbu ma ụmụ anụmanụ ma ụmụ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghịkwa ekwe ka ndị mmadụ bibie ụwa a mara mma. Kama nke ahụ, n’oge na-adịghị anya, Alaeze ya ga-emezi ihe niile ụmụ mmadụ mebirila n’ụwa. (Aịzaya 11:1-9) Ihe ndị a m mụtara na Baịbụl na-eme m obi ụtọ, ọ na-atọkwa m ụtọ ịkọrọ ya ndị ọzọ. O doola m anya na agaghị m agbanweli ụwa a.