Ezikiel 18:1-32

  • Onye ọ bụla ga-aza ajụjụ ihe o mere (1-32)

    • Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie ga-anwụ (4)

    • Nwa agaghị aza ajụjụ maka mmehie nna ya mere (19, 20)

    • Ọnwụ onye ajọ omume anaghị atọ Chineke ụtọ (23)

    • Mmadụ ichegharị ga-eme ka ọ dịrị ndụ (27, 28)

18  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:  “Gịnị ka ihe a unu na-ekwu n’Izrel pụtara? Unu na-asị, ‘Ọ bụ nna nna anyị hà rachara mkpụrụ vaịn na-achaghị acha, ma, ọ bụ ụmụ ha ka ezé na-eri izizi.’+  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Otú ahụ o doro anya na m dị ndụ, ka o doro anya na unu agaghịzi na-ekwu ihe a n’Izrel.  Ọ bụ m nwe mkpụrụ obi* niile, ma mkpụrụ obi nke nna ma mkpụrụ obi nke nwa. Ọ bụ m nwe ha. Mkpụrụ obi* ọ bụla nke na-emehie ga-anwụ.  “‘Mmadụ bụ onye ezi omume ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe dị mma na ihe kwesịrị ekwesị.  Ọ naghị eri ihe e ji chụọrọ arụsị àjà n’elu ugwu.+ Ọ naghị atụkwasị arụsị na-asọ oyi* ndị Izrel na-efe obi. Ya na nwunye onye agbata obi ya anaghị akwa iko.+ Ya na nwaanyị nọ ná nsọ ya anaghị enwe mmekọahụ.+  Ọ naghị emegbu onye ọ bụla,+ kama, ọ na-eweghachiri onye ji ya ụgwọ ihe ibé o nyere ya.+ Ọ naghị anara mmadụ ihe ya n’ike,+ kama, ọ na-enye onye agụụ na-agụ nri,+ na-achịnyekwa onye na-enweghị ákwà uwe ka o yiri.+  Ọ naghị agbazinye mmadụ ego ka o rite uru ma ọ bụ ka ọ nara ọmụrụ nwa.+ Ọ naghị ekpe ikpe na-ezighị ezi,+ kama, ọ na-ekpe ikpe ziri ezi ma o kpewe ikpe gbasara mmadụ na ibe ya.+  Ọ na-edebe iwu m, na-emekwa ihe m chọrọ, si otú a gosi na ọ na-erubere m isi. Onye na-eme ihe ndị a bụ onye ezi omume. Ọ ga-adịrịkwa ndụ na-aga.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 10  “‘Ma, ọ bụrụ na nwa ya na-ezu ohi+ ma ọ bụ na o gburu mmadụ*+ ma ọ bụkwanụ na ọ na-eme nke ọ bụla n’ime ihe ndị ọzọ a: 11  (ọ bụ eziokwu na nna ya anaghị eme nke ọ bụla n’ime ha), ọ na-eri nri e ji chụọrọ arụsị àjà n’elu ugwu, ya na nwunye onye agbata obi ya na-akwa iko, 12  ọ na-emegbu ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ọ na-anara mmadụ ihe ya n’ike, ọ naghị enyeghachi mmadụ ihe ibé o nyere ya,+ ọ na-atụkwasị arụsị dị iche iche na-asọ oyi obi, ọ na-akpa arụ dị iche iche,+ 13  ọ na-agbazinye mmadụ ego ka o rite uru+ ma ọ bụ ka ọ nara ọmụrụ nwa, nwa ya ahụ nke na-eme ihe ndị a agaghị adị ndụ. A ga-egbu ya n’ihi arụ a niile ọ na-akpa. Ọbara ya ga-adị ya n’isi. 14  “Ma, ọ bụrụ na nwa mmadụ na-ahụ mmehie niile nna ya na-eme, ma, ọ naghị eme ha n’agbanyeghị na ọ na-ahụ ka nna ya na-eme ha, 15  ọ naghị eri nri e ji chụọrọ arụsị àjà n’elu ugwu, ọ naghị atụkwasị arụsị dị iche iche na-asọ oyi ndị Izrel na-efe obi, ya na nwunye onye agbata obi ya anaghị akwa iko, 16  ọ naghị emegbu mmadụ, ọ na-enyeghachi mmadụ ihe ibé o nyere ya, ọ naghị anara mmadụ ihe ya n’ike, ọ na-enye onye agụụ na-agụ nri, ọ na-achịnye onye na-enweghị ákwà uwe ka o yiri, 17  ọ naghị emegbu ogbenye, ọ naghị agbazinye mmadụ ego ka o rite uru ma ọ bụ ka ọ nara ọmụrụ nwa, ọ na-eme ihe m chọrọ, na-edebekwa iwu m, nwa na-eme otú a agaghị anwụ n’ihi mmehie nna ya mere. Ọ ga-adịrị ndụ na-aga. 18  Ma, nna ya ga-anwụ ebe ọ bụ na ọ na-egwu ndị mmadụ wayo, na-anara nwanne ya ihe n’ike, na-emekwa ihe na-adịghị mma n’obodo ya. Ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya. 19  “‘Ma, unu ga-asị: “Gịnị mere na nwa mmadụ agaghị aza ajụjụ maka mmehie nna ya?” Ebe ọ bụ na nwa ahụ na-eme ihe dị mma, na-eme ezi omume, na-anabata iwu m niile, na-edebekwa ha, ọ ga-adịrị ndụ na-aga.+ 20  Mkpụrụ obi* ọ bụla nke na-emehie ga-anwụ.+ Nwa agaghị aza ajụjụ maka mmehie nna ya. Nna agaghịkwa aza ajụjụ maka mmehie nwa ya. A ga-akwụ onye ezi omume ụgwọ maka ezi omume ya. A ga-atakwa onye ajọ omume ahụhụ maka ihe ọjọọ ọ na-eme.+ 21  “‘Ọ bụrụ na onye ajọ omume ahapụ mmehie niile ọ na-eme, ma na-edebe iwu m, na-emekwa ihe dị mma na ezi omume, ọ ga-adịrị ndụ na-aga. Ọ gaghị anwụ.+ 22  A gaghị ata ya ahụhụ maka* mmehie ndị o mere n’oge gara aga.+ Ọ ga-adịrị ndụ na-aga n’ihi ezi omume ọ na-emezi.’+ 23  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ọ̀ na-atọ m ụtọ ka onye ajọ omume nwụọ?+ Ihe na-atọ m ụtọ ọ́ bụghị ka ọ hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme wee dịrị ndụ na-aga?’+ 24  “‘Ma, ọ bụrụ na onye ezi omume akwụsị ime ezi omume, mewe ihe ọjọọ, na-akpakwa arụ niile ndị ajọ omume na-akpa, ọ̀ ga-adị ndụ? A gaghịzi echeta nke ọ bụla n’ime ezi omume niile o mere n’oge gara aga.+ Ọ ga-anwụ n’ihi isi o nupụrụ nakwa n’ihi mmehie o mere.+ 25  “‘Unu ga-asịkwa: “Ihe Jehova na-eme adịghị mma.”+ Ndị Izrel, biko nụrụnụ, ọ̀ bụ mụnwa na-eme ihe na-adịghị mma?+ Ọ́ bụghị ununwa na-eme ihe na-adịghị mma?+ 26  “‘Ọ bụrụ na onye ezi omume akwụsị ime ezi omume, mewe ihe ọjọọ ma nwụọ n’ihi ya, ọ nwụrụ n’ihi ihe ọjọọ o mere. 27  “‘Ọ bụrụkwa na onye ajọ omume akwụsị ihe ọjọọ ọ na-eme, mewe ihe ziri ezi na ezi omume, ọ ga-azọ onwe ya* ndụ.+ 28  Ọ bụrụ na ọ ghọta onwe ya ma hapụ ihe ọjọọ ndị ọ na-eme, ọ ga-adịrị ndụ na-aga. Ọ gaghị anwụ. 29  “‘Ndị Izrel ga-asịkwa: “Ihe Jehova na-eme adịghị mma.” Ndị Izrel, ọ̀ bụ mụnwa na-eme ihe na-adịghị mma n’eziokwu?+ Ọ́ bụghị ununwa na-eme ihe na-adịghị mma?’ 30  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ndị Izrel, m ga-akwụ onye ọ bụla n’ime unu ụgwọ ihe o mere.+ Chegharịanụ, hapụkwanụ mmehie niile unu na-eme, ka ha ghara ime ka ikpe maa unu. 31  Ndị Izrel, kwụsịnụ mmehie niile unu na-eme.+ Gbanweenụ ụdị obi unu nwere nakwa otú unu si eche echiche.+ Gịnị mere unu ga-eji anwụ?’+ 32  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ọ naghị atọ m ụtọ ka onye ọ bụla nwụọ.+ N’ihi ya, chegharịanụ ka unu wee dịrị ndụ na-aga.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Onye.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ndụ.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “na ọ wụfuru ọbara.”
Ma ọ bụ “Onye.”
Na Hibru, “A gaghị echeta.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.” Gụọ Nkọwa Okwu.