Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Mmadụ Ikiri Ndị Gba Ọtọ Ò Nwere Ihe O Mere?

Mmadụ Ikiri Ndị Gba Ọtọ Ò Nwere Ihe O Mere?

N’ebe niile n’ụwa, e nwere ọtụtụ akwụkwọ, vidio, na foto ndị na-egosi ndị gba ọtọ. * E nwekwara egwú ndị na-ekwu gbasara ndị gba ọtọ. A na-ekiri ndị gba ọtọ na kọmputa, n’ekwentị, televishọn, nakwa n’ebe ndị mmadụ na-edebe foto ha n’Ịntanet. A na-egosikwa ndị gba ọtọ mgbe a na-akpọsa ngwá ahịa na mgbe a na-egosi ejiji ndị na-ewu ewu. Ọtụtụ ndị taa na-ekirizi ndị gba ọtọ. Ndị na-ekiri ndị gba ọtọ adịla ọtụtụ ugbu a karịa ndị kiriri ya n’oge gara aga.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Ihe Ndị Gosiri na Ọtụtụ Ndị Na-ekiri Ndị Gba Ọtọ.”

Ndị gba ọtọ ndị mmadụ na-ekiri ugbu a dị iche n’ụdị nke ha na-ekiribu. Otu ọkachamara aha ya bụ Gail Dines dere, sị: “Ndị gba ọtọ a na-egosi n’oge a ajọgbuola onwe ha nke na onye ukwu na onye nta na-ekirizi ụdị nke ndị mmadụ na-asọ asọ n’oge gara aga.”

Olee otú obi dị gị ugbu a a na-egosi ndị gba ọtọ n’ebe dị iche iche? Ì chere na mmadụ ikiri ndị gba ọtọ  enwetụdịghị ihe o mere, ka ì chere na o nwechaghị ihe o mere? Ka ị̀ ga-asị na ọ jọgburu onwe ya? Jizọs sịrị: “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru.” (Matiu 7:17) Olee nsogbu ndị mmadụ na-enwe n’ihi ikiri ndị gba ọtọ? Ka anyị nwee ike ịmata azịza nke ajụjụ a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gbasara ikiri ndị gba ọtọ.

Olee nsogbu ikiri ndị gba ọtọ na-akpatara ndị na-ekiri ya?

IHE NDỊ ỌKACHAMARA KWURU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eri mmadụ ahụ́. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na ndị dọkịta kwudịrị na ọ na-eri mmadụ ahụ́ otú ahụ ọgwụ ọjọọ a na-akpọ koken na-eme.

E nwere otu nwoke aha ya bụ Brian. * Nwoke a na-ekirikarị ndị gba ọtọ n’Ịntanet. Ọ sịrị: “Mbọ niile m gbara ka m kwụsị ya enweghị isi. Ọ na-adị m ka m̀ mụ anya na-arọ nrọ. M na-efufegide isi ruo mgbe isi wawara m. M gbalịrị ka m kwụsị ya, ma mgbe ọtụtụ afọ gachara, m ka na-ekirikwa ya.”

Ndị na-ekiri ndị gba ọtọ anaghị achọ ka ndị mmadụ mata na ọ bụ ihe ha na-eme. Ha na-ezo ya ezo ma na-emegharị ndị ọzọ anya. Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na ike ụwa na-agwụkarị ha, ha na-ewekarịkwa iwe ma na-achọkarị ịnọrọ onwe ha. Ihe ọzọ bụ na ihere onwe ha na-emekarị ha, ha na-echegbukwa onwe ha. Mgbe ụfọdụ, ha na-achọdị igbu onwe ha. O nwere otu nwoke aha ya bụ Serge. Ọ na-esi n’Ịntanet etinye ndị gba ọtọ n’ekwentị ya ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụbọchị ọ bụla. Ọ sịrị: “M na-anọkarị otu ebe naanị m ka onye ike ụwa gwụrụ, na-eche ụwa m. Obi m na-ama m ikpe mgbe niile, ọ na-adịkwa m ka o nweghị uru m bara. Ọ na-adịkwa m ka m̀ tọrọ atọ. Ihere na ụjọ ekweghị m kọsara onye ọzọ nsogbu m.”

Ọ bụrụgodị na mmadụ amaghị ụma hụpere ndị gba ọtọ, ọ ka nwekwara ike ịkpatara ya nsogbu. Mgbe otu ọkachamara aha ya bụ Judith Reisman na-agwa ndị omeiwu mba Amerịka ihe ọ chọpụtara banyere ikiri ndị gba ọtọ, ọ sịrị: “Ọ na-abụ mmadụ kirie ndị gba ọtọ, ihe o kiriri na-abanye ya n’ụbụrụ ma kpaghasịa ya ụbụrụ. Ọ ga-esikwara ya ezigbo ike iwepụ ya n’obi ya.” Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Susan amaghị ụma hụpere ndị gba ọtọ n’Ịntanet. Ọ sịrị: “Ihe ahụ m hụpeere ekweghị apụ m apụ n’obi. Ọ na-abụ m nọtụ, mụ echeta ya. Ọ na-adị m ka o nweghị mgbe ọ ga-apụcha m n’obi.”

NKE BỤ́ EZIOKWU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eri mmadụ ahụ́, ọ na-akpatakwara ndị na-ekiri ya ọtụtụ nsogbu.—2 Pita 2:19.

Olee nsogbu onye na-ekiri ndị gba ọtọ na-akpatara ndị ezinụlọ ya?

IHE NDỊ ỌKACHAMARA KWURU: “Ikiri ndị gba ọtọ na-ekewa di na nwunye ma na-etisa ezinụlọ.”—Akwụkwọ bụ́ The Porn Trap, nke Wendy na Larry Maltz dere.

Ikiri ndị gba ọtọ na-emebiri di na nwunye ihe, na-emebikwara ndị ezinụlọ ha ihe n’ihi na

  • Ọ na-eme ka di na nwunye ghara ịtụkwasị ibe ha obi, na-emekwa ka ha ghara ịhụ ibe ha n’anya.—Ilu 2:12-17.

  • Ọ na-eme ka di ma ọ bụ nwunye na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru, meekwa ka ọ ghara ịchọ ịma gbasara nwunye ya ma ọ bụ di ya. Ọ na-emekwa  ka di ma ọ bụ nwunye mmadụ ghara izuru ya.—Ndị Efesọs 5:28, 29.

  • Ọ na-eme ka agụụ mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị na-agụ mmadụ.—2 Pita 2:14.

  • Ọ na-eme ka ndị na-ekiri ya na-achọ ka ha na nwunye ha ma ọ bụ di ha nwee ụdị mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị.—Ndị Efesọs 5:3, 4.

  • Ọ na-eme ka obi mmadụ pụọ n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ. Ọ na-emekwa ka onye ahụ kwaa iko.—Matiu 5:28.

Baịbụl gwara ndị lụrụ di na nwunye ka ha ghara ‘ịghọ ibe ha aghụghọ.’ (Malakaị 2:16) Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị akwaa iko, ọ ghọọla nwunye ya ma ọ bụ di ya aghụghọ. Nke a nwere ike ime ka ha kewaa ma ọ bụ gbaa alụkwaghịm. Ọ bụrụ na ha agbaa alụkwaghịm, ọ ga-akpatara ụmụ ha nsogbu.

Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ na-ekiri ndị gba ọtọ, o nwere ike ịkpa ụmụ ha aka ọjọọ. Brian ahụ anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri, m hụrụ magazin e sere ndị gba ọtọ papa m na-ekiri. M hụrụ ya n’oge m na-egwuri egwu n’ụlọ. M bidoziri ikiri ya na nzuzo, amakwanụghị m ihe mere m ji na-ekiri ya. Otú ahụ ka m si kiriwezie ndị gba ọtọ ruo mgbe m ghọrọ dimkpa.” Nchọpụta ndị e mere gosiri na ọ bụrụ na ụmụaka amalite ikiri ndị gba ọtọ,  ọ ga-eme ka ha malite ịkwa iko mgbe ha ka dị obere, meekwa ka ara ịkwa iko na-agba ha. Ọ ga-emekwa ka uche ghara ịkpakọ ha ọnụ.

NKE BỤ́ EZIOKWU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eme ka mmadụ na ibe ya ghara ịdịkwa ná mma. Ọ na-akpatakwara mmadụ obi mgbawa.—Ilu 6:27.

Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ikiri ndị gba ọtọ?

IHE BAỊBỤL KWURU: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.”—Ndị Kọlọsi 3:5.

N’eziokwu, Jehova * Chineke kpọrọ mmadụ ikiri ndị gba ọtọ asị. Nke a apụtaghị na ọ chọghị iji ntị anụ gbasara mmekọahụ. Ọ bụ ya kere ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ihe mere o ji kee ya bụ ka di na nwunye jiri ya na-eme ibe ha obi ụtọ ma dịrị ná mma. Ọ ga-emekwa ka ha nwee ike ịmụ ụmụ.—Jems 1:17.

Gịnị mere anyị ji kwuo hoo haa na Jehova kpọrọ mmadụ ikiri ndị gba ọtọ asị? Ka anyị leba anya n’ihe ole na ole kpatara ya.

  • Jehova ma na ikiri ndị gba ọtọ nwere ike ime ka ndụ mmadụ ghara ịba uru.—Ndị Efesọs 4:17-19.

  • Ọ hụrụ anyị n’anya, ọ chọghịkwa ka ihe ọ bụla mee anyị.—Aịzaya 48:17, 18.

  • Jehova achọghị ka e nwee ihe ga-ekewa di na nwunye ma ọ bụ tisaa ezinụlọ.—Matiu 19:4-6.

  • Ọ chọrọ ka anyị na-akpa àgwà ọma ma na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù.—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-6.

  • Ọ chọghị ka anyị jiri ihe anyị ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-eme ihe iberiibe.—Ndị Hibru 13:4.

  • Jehova ma na ndị na-ekiri ndị gba ọtọ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru otú Setan na-eme. Ha na-ewerekwa mmekọahụ otú Setan si were ya.—Jenesis 6:2; Jud 6, 7.

NKE BỤ́ EZIOKWU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma.—Ndị Rom 1:24.

Jehova na-emetara ndị ikiri ndị gba ọtọ riri ahụ́ ebere, bụ́ ndị chọrọ ịkwụsị ya. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova dị ebere, na-emekwa amara, ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, o nwere obiọma dị ukwuu. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:8, 14) Ọ na-agwa ndị dị umeala n’obi ka ha bịakwute ya ka ‘o wee meere ha ebere, ha enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị.’—Ndị Hibru 4:16; gụọ igbe isiokwu ya bụ  “Ihe Ndị Ga-enyere Mmadụ Aka Ịkwụsị Ikiri Ndị Gba Ọtọ.”

E nweela ọtụtụ ndị Chineke nyeere aka, ha akwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Aka Chineke nyeere ha ọ̀ baara ha uru? Legodị ihe Baịbụl kwuru gbasara ụfọdụ ndị kwụsịrị ihe ọjọọ ha na-eme: ‘Ma a sachawo unu, e dowo unu nsọ, a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:11) Ha nweziri ike ikwu ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.

Susan, bụ́ onye kwụsịrị ikiri ndị gba ọtọ, sịrị: “Ọ bụ naanị Jehova bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ kwụsị ikiri ndị gba ọtọ. Ọ bụrụ na ị rịọ ya ka o nyere gị aka, ọ ga-enyere gị aka, gị na ya adịrị ná mma. Ọ gaghị ajụ inyere gị aka.”

^ para. 3 E kwuwe gbasara ikiri ndị gba ọtọ, ihe a na-ekwu abụghị naanị ndị gba ọtọ e sere ese ma ọ bụ ndị nke a na-egosi na tiivi. Ọ pụtakwara ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ikiri ekiri ma ọ bụ igere egere ma ọ bụ ịgụ n’akwụkwọ nke nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụwa ya.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 25 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.