Aịzaya 48:1-22

  • A baara ndị Izrel mba, meekwa ka ha dị ọcha (1-11)

  • Jehova ga-emesi Babịlọn ike (12-16a)

  • Chineke na-akụzi ihe bara uru (16b-19)

  • “Sinụ na Babịlọn pụọ” (20-22)

48  Nụrụnụ ihe a, ndị ezinụlọ Jekọb,Ndị na-aza aha Izrel,+Ndị si n’ezinụlọ Juda,*Ndị na-eji aha Jehova aṅụ iyi,+Ndị na-eto Chineke Izrel,Ma o sighị ha n’obi. Ha anaghịkwa eme ezi omume.+   Ha na-asị na ha si n’obodo nsọ.+ Ha na-achọkwa ka Chineke Izrel,Onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, nyere ha aka.+   “O teela m gwara unu ihe ndị gara aga.* M ji ọnụ m gwa unu ha. M kwuru ha ka a nụ ha.+ Na mberede ka m mere ihe m kwuru na m ga-eme.+   N’ihi na m ma na unu bụ ekwe ekwe. Unu kpọchiri obi unu,* na-akpọkwa ekwo nkụ.*+   O teela m gwara unu ihe ndị a. Tupu ha emee, m mere ka unu nụ ha,Ka unu ghara ịsị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ihe a. Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ kwuru ka ihe a mee.’   Unu anụla ihe niile, hụkwa ha. Ọ̀ bụ na unu agaghị akọsa ha?+ Si ugbu a gawa, m ga na-akọziri unu ihe ọhụrụ,+Ihe ndị e zoro nke ọma unu na-amaghị.   Ugbu a ka ha na-eme.* O tebeghị aka,Ha bụ ihe unu na-anụtụbeghị tupu taa,Ka unu ghara ịsị, ‘Anyị dị mbụ mara ha.’   N’eziokwu, o nwebeghị mgbe unu chọrọ ịnụ ya.+ Unu aghọtaghịkwa ya,O teekwala ntị unu kpọchiri akpọchi. Ama m na unu na-aghọ ncha n’aghụghọ.+ Unu bụkwa ndị mmehie kemgbe a mụrụ unu.+   Ma n’ihi aha m, m ga-akwụsị iwe m na-ewe.+ M ga-ejide onwe m ka e wee nye m otuto. M gaghịkwa ebibi unu.+ 10  Anụchaala m gị, ma ọ bụghị dị ka e si anụcha ọlaọcha.+ Ahapụrụ m gị ka ị taa ahụhụ, si otú ahụ nụchaa* gị otú e si eji oké ọkụ agbaze ihe.+ 11  N’eziokwu, m na-eme ihe a n’ihi aha m.+ Olee otú m ga-esi kwe ka e mebie aha m?+ Anaghị m enye onye ọzọ otuto e kwesịrị inye m. 12  Jekọb, gee m ntị. Izrel, bụ́ onye m họọrọ, geekwa m ntị. Anaghị m agbanwe agbanwe.+ Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.+ 13  Eji m aka m tọọ ntọala ụwa,+Jirikwa m aka nri m gbasaa eluigwe ka ákwà.+ M na-akpọ ha ka ha pụtakọta ọnụ. 14  Unu niile, zukọtanụ ma gee ntị. Ò nwere chi ọ bụla n’ime ha kwuru gbasara ihe ndị a? Onye* mụnwa bụ́ Jehova hụrụ n’anya+Ga-eme Babịlọn ihe ọ bụla dị mụ mma.+ Ọ ga-ejikwa aka ya dị ike mesie ndị Kaldia ike.+ 15  Ekwuola m ihe m kwuru, akpọọkwala m ya.+ Akpọbatala m ya. M ga-emekwa ka ihe gaziere ya.+ 16  Bịanụ m nso, nụrụ ihe a. Malite ná mbido, m na-ekwu ihe m na-ekwu n’ihu ọha, ọ bụghị na nzuzo.+ Mgbe ihe e kwuru na ọ ga-eme mere, anọ m ya.” Ma ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ezipụla m, nyekwa m* mmụọ ya. 17  Jehova, Onye Mgbapụta gị na Onye Nsọ Izrel, kwuru,+ sị: “Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke gị. Ọ bụ m na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru,+Na-ezikwa gị ụzọ i kwesịrị ịna-eso.+ 18  Biko, na-eme ihe m nyere n’iwu.+ Ọ bụrụ na ị na-eme ya, udo ị ga-enwe ga-aha ka osimiri,+Ị gaghịkwa akwụsị ime ezi omume otú ahụ ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị n’oké osimiri.+ 19  Ụmụ* gị na ndị si n’ezinụlọ gịGa-adị ọtụtụ ka ájá.+ E nweghịkwa ihe ga-eme ka e hichapụ aha ha.” 20  Sinụ na Babịlọn pụọ.+ Sinụ n’obodo ndị Kaldia gbapụ. Na-enwenụ aṅụrị ka unu na-akọsa ya. Kọsaanụ ya.+ Kwuonụ gbasara ya n’ebe ụwa sọtụrụ.+ Kwuonụ, sị: “Jehova agbapụtala Jekọb ohu ya.+ 21  Akpịrị akpọghị ha nkụ mgbe o du ha gafee ọzara.+ O mere ka mmiri si n’oké nkume gbapụtara ha. Ọ gbawara oké nkume, mmiri agbapụtawa.”+ 22  Jehova kwuru, sị: “Udo agaghị adịrị ndị ajọ omume.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ndị si na mmiri Juda pụta.”
Na Hibru, “ihe ndị mbụ.”
Na Hibru, “Olu unu bụ akwara ígwè.”
Na Hibru, “egedege ihu unu bụkwa ọla kọpa.”
Na Hibru, “ka e kere ha.”
Ma ọ bụ “nyochaa.” O nwere ike ịbụ, “họrọ.”
Ya bụ, Saịrọs.
Ma ọ bụ “ezipụla mụ na.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”