Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NKE 3

Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe

Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe

GỊNỊ KA MMADỤ IDI IHE PỤTARA?

Ọ naghị esiri onye na-edi ihe ike inwetaghachi onwe ya ma o nwee nsogbu. Mmadụ na-esi n’ihe ndị mere ya amụta àgwà a. Otú ahụ nwatakịrị na-ada ada mgbe ụfọdụ tupu ya amụta ịga ije, ka onye ahụ ga-enwekwa nsogbu mgbe ụfọdụ tupu ihe agaara ya nke ọma ná ndụ.

GỊNỊ MERE IDI IHE JI DỊ MKPA?

Ụmụaka ụfọdụ na-ada mbà n’obi ma ihe siere ha ike, ma ihe ha na-eme agaghị nke ọma, ma ọ bụ ma mmadụ nye ha ndụmọdụ n’ihe ahụ. Ndị ọzọ na-ahapụdị ihe ahụ kpamkpam. Ma, ha kwesịrị ịghọta na:

  • Ọ bụghị mgbe niile ka ihe mmadụ na-eme na-aga nke ọma.—Jems 3:2.

  • O nweghị onye na-agaghị enwe nsogbu mgbe ụfọdụ ná ndụ ya. —Ekliziastis 9:11.

  • Ihe ga-eme ka mmadụ na-emekwu nke ọma bụ ma a na-agwa ya ebe ndị ọ na-anaghị emeta. —Ilu 9:9.

Nwa gị mụta ịna-edi ihe, ọ ga-enyere ya aka ịma na ọ ga-emerili nsogbu ndị ga-abịara ya.

OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊNA-EDI IHE

Mgbe nwa gị na-emeghị nke ọma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” —Ilu 24:16.

Nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme ka ọ ghara inwe nsogbu ahụ o nweburu. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ọ ga-eme ma ọ daa ule n’ụlọ akwụkwọ? O nwere ike ịda mbà n’obi, chee na o nweghịzi ihe ọ dị mma ya.

Nyere nwa gị aka ịmata ụzọ ọ ga-esi mewe nke ọma. Ọ ga-eme ka ọ gbalịwa imezi ihe ahụ o mehiere, kama ịnọ na-enwe mwute.

Ma, ejikwala aka gị emeziri ya ihe o mehiere. Kama, nyere ya aka ka ọ chọta ụzọ ọ ga-esi mezie ya n’onwe ya. I nwere ike ịjụ ya, sị: “Olee ihe ị ga-eme ka ị na-aghọtakwu ihe a na-akụziri unu n’ụlọ akwụkwọ?”

Mgbe nsogbu bịara.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.”—Jems 4:14.

O nweghị onye ma otú ihe ga-adịrị ya echi. Onye bụ́ aka ji akụ̀ taa nwere ike ịda ogbenye echi. Onye ahụ́ dị taa nwere ịke ịda ọrịa echi. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, ọ bụghịkwa ndị dị ike na-emeri n’agha; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”—Ekliziastis 9:11.

O doro anya na ị na-agbalị ichebe nwa gị ka ọ ghara ịba ná nsogbu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị nsogbu niile ka ị ga-echebeli nwa gị na ya.

Ebe ọ bụ na nwa gị etorubeghị ịrụwa ọrụ, nsogbu ọ ga-enwe nwere ike ọ gaghị abụ na a chụrụ ya n’ọrụ ma ọ bụkwa na ụkọ ego ji ya n’olu. Ma, e nwere nsogbu ndị ọzọ i nwere ike inyere ya aka ka o die, dị ka, mgbe ya na enyi ya sere okwu, ma ọ bụ ọnwụ onye ezinụlọ unu. *

Mgbe e nyere nwa gị ndụmọdụ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Nụrụ ndụmọdụ . . . ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.”—Ilu 19:20.

Mmadụ nye nwa gị ndụmọdụ, ọ pụtaghị na ọ kpọrọ ya asị. Kama, ọ chọrọ inyere ya aka ka o mezie ihe ọ na-anaghị emeta.

Ị kụziere nwa gị ịnabata ndụmọdụ, ọ ga-abara gị na ya uru. Otu nwoke aha ya bụ John nke nwere ezinụlọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a na-ahapụ ụmụaka mgbe ọ bụla ha mejọrọ ihe, ha agaghị amụta ihe. Ha ga na-esi n’otu nsogbu abanye n’ọzọ. Ọrụ gị ga-abụkwa ịna-agbatara ha ọsọ enyemaka mgbe ọ bụla ha banyere ná nsogbu. Ihe a ga-eme ka ndụ ghara ịna-atọ nne na nna na nwa ha ụtọ.”

Olee otú ị ga-esi nyere nwa gị aka ịna-anabata ndụmọdụ? Mgbe ọ bụla e nyere nwa gị ndụmọdụ, ma ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ̀ bụ n’ebe ọzọ, ekwukwala na ndụmọdụ ahụ ezighị ezi. Kama ime otú ahụ, jụọ ya, sị:

  • “Olee ihe i chere mere e ji nye gị ndụmọdụ a?”

  • “Olee otú ị ga-esi mezikwuo ihe?”

  • “Olee ihe ị ga-eme mgbe ọzọ ụdị ihe a mere?”

Cheta na ndụmọdụ ga-abara nwa gị uru ugbu a nakwa ma o too.

^ par. 21 Gụọ isiokwu bụ́ “Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2008.