Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NKE 2

Kụziere Nwa Gị Ịdị Umeala n’Obi

Kụziere Nwa Gị Ịdị Umeala n’Obi

GỊNỊ BỤ ỊDỊ UMEALA N’OBI?

Onye dị umeala n’obi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ọ naghị adị mpako ma ọ bụ na-atụ anya ka ndị ọzọ were ya ka onye pụrụ iche. Kama, onye dị umeala n’obi na-achọ ịma banyere ndị ọzọ, dịkwa njikere ịmụta ihe n’aka ha.

Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eche na onye dị umeala n’obi esighị ike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịdị umeala n’obi na-eme ka mmadụ mara ebe ọ na-anaghị emeta na ihe ọ na-agaghị emeli.

GỊNỊ MERE ỊDỊ UMEALA N’OBI JI DỊ MKPA?

  • Ọ na-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Narcissism Epidemic kwuru, sị: “Ọ na-aka adịrị ndị dị umeala n’obi mfe imeta ndị enyi.” O kwukwara na ọ na-aka adịrị ha “mfe iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe.”

  • Ịdị umeala n’obi ga-abara nwa gị uru n’ọdịnihu. Nwa gị mụta ịdị umeala n’obi, ọ ga-abara ya uru ma ugbu a ma n’ọdịnihu, dị ka ihe atụ, ma ọ chọwa ọrụ. Dr. Leonard Sax kwuru, sị: “Ọ ga-esi ike onye na-eto eto onwe ya na-ebu isi ime nke ọma ma ọ gaa ịchọ ọrụ. Ma, onye ọ ga-aka adịrị mfe inweta ọrụ bụ onye nke na-ege onye na-ewe ya n’ọrụ ntị.” *

OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊDỊ UMEALA N’OBI

Nyere nwa gị aka ka ọ ghara ịna-eche na ya ka ndị ọzọ mma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi ya.”—Ndị Galeshia 6:3.

  • Agwala nwa gị na ọ ga-emeli ihe niile. Ọ bụrụ na ị na-agwa nwa gị, sị: “Ị ga-enweta ihe niile ị chọrọ ná ndụ,” nakwa “Ị ga-abụli ihe ọ bụla ị chọrọ ịbụ” ma ọ bụ ihe yiri ha, o nwere ike ime ka ọ na-agba mbọ. Ma ọtụtụ mgbe, ihe anaghị agacha otú ahụ. Ihe ga-aka agaziri ha ma ha na-agba mbọ, na-achọkwa ihe aka ha ga-eru.

  • Na-agwa nwa gị ihe mere i ji jaa ya mma. Naanị ịgwa nwa gị na ọ na-agbalị agaghị eme ka ọ dị umeala n’obi. Gwa ya ihe mere i ji jaa ya mma.

  • Ekwela ka nwa gị na-anọ n’Ịntanet akparịta ụka mgbe niile. Ndị mmadụ na-anọkarị n’ebe ahụ eto onwe ha, ekwu gbasara nkà ndị ha nwere na ihe ndị ha merela. Ihe ndị a anaghị eme ka mmadụ dị umeala n’obi.

  • Gbaa nwa gị ume ka ọ na-arịọ mgbaghara ozugbo o mejọrọ. Nwa gị mejọọ ihe, nyere ya aka ịmata ebe o mejọrọ na ikweta na o mejọrọ.

Kụziere nwa gị ikele ndị meere ya ihe ọma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.”—Ndị Kọlọsi 3:15.

  • Ikele Chineke maka ihe ndị o kere. Ụmụaka kwesịrị ịmụta ịna-ekele Chineke maka ihe niile o kere nakwa na ihe ndị ahụ mere ka anyị dị ndụ. Ikuku, mmiri na ihe oriri dị anyị mkpa. Jiri ihe ndị a kụziere ha ka ha na-enwe obi ụtọ ma na-ekele Chineke maka ihe ndị dị ịtụnanya o kere.

  • Iji ndị ọzọ akpọrọ ihe. Mee ka nwa gị ghọta na e nwere ihe ndị ọzọ ji kara ya mma, nakwa na o kwesịghị imewere ha anyaụfụ, kama, na o nwere ike isi n’aka ha mụta ihe.

  • Ikele ndị ọzọ. Kụziere nwa gị ịna-asị “i meela.” Ọ bụghị naanị ikwu ya ekwu, kama ka o gosi na o si ya n’obi. Ikele ndị ọzọ na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi.

Kụziere ụmụ gị na imere ndị ọzọ ihe ọma na-aba uru.

IHE BAỊBỤL KWURU: “N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.

  • Kenye nwa gị ihe ọ ga na-arụ n’ụlọ. Ọ bụrụ na o nweghị ihe i kenyere nwa gị ka ọ na-arụ n’ụlọ, ọ ga-eme ka o chewe na ya dị ezigbo mkpa nke na ya ekwesịghị ịrụ ọrụ dị n’ụlọ. Mee ka ọ mata na o kwesịrị ibu ụzọ rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ tupu ya agawa igwu egwu. Gwa ya uru ọrụ ndị ahụ na-abara ndị ọzọ, nakwa na ndị ọzọ ga-eji ya kpọrọ ihe n’ihi na ọ na-arụ ọrụ ya.

  • Mee ka nwa gị ghọta na ọ dị mma imere ndị ọzọ ihe. Ọ bụ ya ga-akacha eme ka nwatakịrị na-akpa àgwà ọma ma o too. N’ihi ya, gbaa ya ume ka ọ na-achọpụta ndị e kwesịrị inyere aka. Gị na ya kparịta ihe o nwere ike imere ha. Nwa gị meere mmadụ ihe, jaa ya mma ma na-akwado ya.

^ par. 8 O si n’akwụkwọ bụ́ The Collapse of Parenting.