Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ

Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ

IHE MERE O JI ESI IKE

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Amaka * kwuru, sị: “Mgbe mmadụ na-enye gị ndụmọdụ, ọ pụtara na onye ahụ na-agwa gị na ihe ị na-eme adịghị mma. Ahụtụbeghịkwa m onye sịrị na obi na-adị ya mma ma a gwa ya na ihe ọ na-eme adịghị mma.”

Onye na-ajụ ndụmọdụ e nyere ya dị ka ọkwọ ụgbọelu na-eleghara ntụziaka a na-enye ya anya. Ị manụ na o nwere ike ịba na nsogbu.

Obi ọ̀ na-ajọ gị njọ ma mama gị na papa gị ma ọ bụ ndị nkụzi unu ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ baara gị mba? Ọ bụrụ na ọ na-ewe gị iwe ma a baara gị mba, isiokwu a ga-enyere gị aka.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

E nweghị onye a na-ekwesịghị ịdụ ọdụ.

“Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.”—Jems 3:2.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nnenna kwuru, sị: “Mmadụ ekwesịghị imewe ihere ma a baara ya mba mgbe o mere ihe na-adịghị mma.”

A dọọ gị aka ná ntị, ọ pụtaghị na ị bụ ajọ mmadụ.

“Onye Jehova * hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba, ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.”—Ilu 3:12.

Nwa agbọghọ aha ya bụ Chidịmma sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ dụọ m ọdụ, ihe m na-eche bụ na ihe mere onye ahụ ji kata obi gwa m ihe ahụ bụ na ọ hụrụ m n’anya.”

Ịnara ndụmọdụ ga-eme ka ị kpawa ezigbo àgwà.

‘Nụrụ ịdọ aka ná ntị wee mara ihe.’—Ilu 8:33.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Urunwa kwuru, sị: “Ndụmọdụ so n’ihe na-enyere onye na-eto eto aka ịghọ mmadụ. Ọ na-enyere onye na-eto eto aka ịmata otú ndị ọzọ si ele ya anya, nyekwara ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ọ na-amaghị na ya akpawala.”

 IHE I NWERE IKE IME

Ewela iwe. E nwere ike obi agaghị adị gị mma ma a dụwa gị ọdụ, ma gbalịa ka ị ghara iwe iwe. Gịnị ga-enyere gị aka? Were ya na ị na-adụ nwanne gị nke obere ọdụ. Ì chere na ihe ị na-agwa ya ga-abara ya uru? Ugbu a, ọ bụ gị ka a na-adụ ọdụ. Ihe onye ahụ gwara gị ga-abara gị uru.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 7:9.

Nwa agbọghọ aha ya bụ Ogechi sịrị: “Oge ụfọdụ, iwe nwere ike iwe gị ma a gwa gị na ihe i mere adịghị mma. Ọ ga-emezi ka i chefuo na onye ahụ achọghị ịkpasu gị iwe kama ọ chọrọ ka ị kpawa ezigbo àgwà.”

Dị umeala n’obi. Ekwela ka nganga mee ka ị jụ ndụmọdụ e nyere gị. Ma, adala mbà n’ihi na a gwara gị na e nwere ihe ị na-emetaghị. Ị ga-egosi na ị dịghị mpako ma ọ bụrụ na ị jụghị ndụmọdụ ahụ ma ọ bụkwanụ daa mbà. Cheta na mba a baara gị, ya ewee gị ezigbo iwe nwere ike ịbụ ya ga-aka abara gị uru. Ọ bụrụ na ị jụ ya, o nwere ike ịbụ na ị jụrụ ihe ga-enyere gị aka ịghọ mmadụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 16:18.

Mba a baara gị, ya ewee gị ezigbo iwe nwere ike ịbụ ya ga-aka abara gị uru

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ugomma kwuru, sị: “Onye chọrọ ịghọ mmadụ ekwesịghị ịna-ajụ ndụmọdụ. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, anyị agaghị erite uru. Anyị nwedịrị ike ime ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara.”

Kelee onye dụrụ gị ọdụ. Ọ sọgodị ya ya bụrụ na ihe onye ahụ gwara gị were gị iwe, kelee ya. O doro anya na onye ahụ buuru gị ihe ọma n’obi, chọọkwa inyere gị aka.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Abụ Ọma 141:5.

Nwa agbọghọ aha ya bụ Chizọba kwuru, sị: “Ọ bụghị ihe ọjọọ ma i kelee onye baara gị mba, karịchaa ma ọ gwa gị ihe ga-abara gị uru. Ọ bụrụgodị na ihe o kwuru agbasaghị gị, kelee ya maka na ọ katara obi bịa gwa gị ihe ahụ.”

^ para. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 11 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.