Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NKE 1

Uru Mmadụ Ijide Onwe Ya Bara

Uru Mmadụ Ijide Onwe Ya Bara

GỊNỊ BỤ MMADỤ IJIDE ONWE YA?

Lee ihe ndị so ná mmadụ ijide onwe ya:

  • ịhapụtụ ihe na-agụ ya agụụ

  • ịhapụ ime ihe ọ bụla batara ya isi

  • ịgbalị rụchaa ọrụ na-anaghị amasị ya

  • ibute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ

GỊNỊ MERE MMADỤ IJIDE ONWE YA JI DỊ MKPA?

Ọ na-adịrị ụmụaka ndị na-ejide onwe ha mfe imeri ọnwụnwa, ọ bụrụgodị na ime ihe ahụ ga-atọ ha ụtọ. Ma, ụmụaka ndị na-anaghị ejide onwe ha nwere ike

  • ịna-ewekarị iwe

  • ịna-ada mbà n’obi

  • ịna-aṅụ sịga, mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike

  • ịna-eri nri na-anaghị edozi ahụ́

Otu nchọpụta e mere gosiri na ụmụaka ndị na-ejide onwe ha anaghị arịakarị ọrịa ma ha too. Ha anaghị echegbukarị onwe ha n’ihi ego, ha anaghịkwa adakarị iwu obodo. Nchọpụta a mere ka Prọfesọ Angela Duckworth nke na-akụzi na mahadum a na-akpọ University of Pennsylvania kwuo, sị: “O nweghị mgbe mmadụ ijide onwe ya na-adị njọ.”

OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ IJIDE ONWE YA

Ị sị nwa gị mba, ka mba gị bụrụ mba.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e.”—Matiu 5:37.

Nwatakịrị nwere ike imewere nne na nna ya isi ike iji lee ma hà ga-agbanwe ihe ha kwuru. O nwedịrị ike ime ya n’ebe ndị mmadụ nọ. Ọ bụrụ na ha ejiri maka ihe a gbanwee ihe ha kwuru, nwa ahụ ga-ewere ya na ime isi ike ga-enyere ya aka ịna-enweta ihe ọ chọrọ.

Ma, ọ bụrụ na nne na nna akwụrụ n’okwu ha, nwa ahụ ga-amụta na ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ na-enweta ihe ọ chọrọ. Dr. David Walsh dere, sị: “Ụmụaka ndị mụtara ihe a na-aka eme nke ọma ma ha too. Ndị nne na nna ga-eme ụmụ ha ihe ọjọọ ma ha na-akụziri ha na ha ga na-enweta ihe ọ bụla ha chọrọ n’ụwa a.” *

Ọ bụrụ na ị naghị emere nwa gị ihe ọ bụla ọ chọrọ, ọ ga-enyere ya aka ịna-ejide onwe ya ma o too. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị ọzọ na-agwa ya ka ọ ṅụọ ọgwụ ike, kwaa iko, ma ọ bụ mee omume ọjọọ ọzọ, ọ ga-enwe ike ijide onwe ya.

Mee ka ụmụ gị ghọta uru dị n’ịkpa àgwà ọma na ọghọm dị n’ịkpa àgwà ọjọọ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.”—Ndị Galeshia 6:7.

I kwesịrị ime ka nwa gị ghọta na ihe ọ bụla o mere nwere ihe ọ ga-akpatara ya, nakwa na ọ bụrụ na ọ naghị ejide onwe ya, ọ ga-akpatara ya nsogbu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa gị na-ewekarị iwe ọkụ, o nwere ike ime ka ndị ọzọ na-agbara ya ọsọ. Ma, ọ bụrụ na ọ na-ejide onwe ya ma a kpasuo ya iwe, jirikwa ndidi na-ege ndị ọzọ ntị, ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-akpa ya nso. Nyere nwa gị aka ka ọ ghọta na ọ bụrụ na ọ na-ejide onwe ya, ọ ga-eme ka ihe gaziere ya.

Kụziere nwa gị otú ọ ga-esi na-amata ihe ndị ka mkpa.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.

Mmadụ ijide onwe ya apụtaghị naanị ịhapụ ime ihe ọjọọ, ọ pụtakwara mmadụ ime ihe o kwesịrị ime, ọ bụrụgodị na ime ihe ahụ anaghị amasịcha ya. Nwa gị kwesịrị ịna-amata ihe ndị ka mkpa ma na-eme ha. Nyere ya aka ibu ụzọ na-eme ihe ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, o kwesịrị ibu ụzọ mee ihe omume e nyere ha n’ụlọ akwụkwọ tupu ya agawa igwu egwu.

Na-eme ihe ndị ị na-akụziri nwa gị.

IHE BAỊBỤL KWURU: “M na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.”—Jọn 13:15.

Nwa gị ga-achọpụta otú i si eme ma a kpasuo gị iwe. Na-akpa àgwà ga-egosi na mmadụ ijide onwe ya na-aba uru. Dị ka ihe atụ, nwa gị mee ihe na-adịghị mma, ị̀ na-ebido wewe iwe ozugbo ka ị̀ na-ejide onwe gị?

^ par. 20 O si n’akwụkwọ bụ́ No: Why Kids—of All Ages—Need to Hear It and Ways Parents Can Say It.