Ekliziastis 9:1-18

  • Otu ihe na-eme mmadụ niile (1-3)

  • Kporie ndụ n’agbanyeghị na mmadụ na-anwụ anwụ (4-12)

    • Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla (5)

    • E nweghị ihe mmadụ nwere ike ime n’ili (10)

    • Oge ọjọọ na ihe ndị a na-atụghị anya ha (11)

  • A naghị eji amamihe akpọrọ ihe mgbe niile (13-18)

9  M chebaara ihe a niile echiche wee kwuo na ndị ezi omume na ndị ma ihe nakwa ọrụ ha na-arụ dị n’aka ezi Chineke.+ Ndị mmadụ amaghị otú ndị dịrị ndụ tupu hanwa hụruru ibe ha n’anya nakwa otú ha kpọruru ibe ha asị.  Ọ bụ otu ihe na-eme* mmadụ niile,+ ma onye ezi omume ma onye ajọ omume,+ ma ezigbo mmadụ ma onye dị nsọ ma onye na-adịghị nsọ, ma ndị na-achụ àjà ma ndị na-anaghị achụ àjà. Otú ọ dị ezigbo mmadụ ka ọ dị onye mmehie. Otú ọ dị onye na-aṅụ iyi ka ọ dịkwa onye na-anaghị achọ ịṅụ iyi.  Ihe a bụ ihe na-agbawa obi nke na-eme n’ụwa:* Ebe ọ bụ otu ihe na-eme* mmadụ niile,+ ihe juru n’obi ndị mmadụ bụ ihe ọjọọ. Ihe dị ha n’obi n’oge ha dị ndụ bụ nzuzu, ha na-emechakwa nwụọ.  Onye ọ bụla dị ndụ nwere olileanya, n’ihi na nkịta dị ndụ ka ọdụm nwụrụ anwụ mma.+  N’ihi na ndị dị ndụ ma na ha ga-anwụ,+ ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.+ E nweghị ụgwọ ọrụ ọzọ ha nwere, n’ihi na e chefuola ihe niile banyere ha.+  Ha enweghịkwa ike ịhụ mmadụ n’anya ma ọ bụ ịkpọ mmadụ asị ma ọ bụ imere mmadụ anyaụfụ. E nweghịzi ihe a na-eme n’ụwa* ha so eme.+  Gaa jiri obi ụtọ rie nri gị, jirikwa obi ụtọ ṅụọ mmanya gị,+ maka na ọrụ gị dị ezi Chineke mma.+  Ka uwe gị na-enwu gbaa* mgbe niile, ka mmanụ gharakwa ịkọ n’isi gị.+  Ka gị na nwunye gị ị hụrụ n’anya+ kporie ndụ n’ụbọchị niile na-enweghị isi Chineke mere ka ị dị ndụ n’ụwa,* bụ́ ụbọchị niile na-enweghị isi ị dị ndụ, n’ihi na ọ bụ ihe i ketara ná ndụ, bụrụkwa ụgwọ ọrụ gị maka ọrụ ị na-arụsi ike n’ụwa.*+ 10  Ihe ọ bụla i nwere ike ime, jiri ike gị niile mee ya, n’ihi na i nweghị ike ịrụ ọrụ ma ọ bụ ime atụmatụ ma ọ bụ ịmụta ihe ma ọ bụ ịma ihe n’ili,*+ bụ́ ebe ị na-aga. 11  Ihe ọzọ m hụrụ nke na-eme n’ụwa* bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị dike na-emeri n’agha.+ Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ma ihe na-enweta ihe oriri. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ na-akpata akụnụba.+ Ọ bụghịkwa ndị mụtara ihe ka ihe na-agaziri mgbe niile,+ n’ihi na ọdachi* na-abịara ha niile n’oge a na-atụghị anya ya. 12  N’ihi na mmadụ amaghị oge ihe ọjọọ ga-abịara ya.+ Otú ahụ ụgbụ si ejide azụ̀, ọnyà ana-amakwa nnụnụ, ka mmadụ si abanye ná nsogbu n’oge ọdachi dakwasịrị ya, mgbe ọ dakwasịrị ya na mberede. 13  E nwekwara ihe m hụrụ n’ụwa* gbasara amamihe. Ihe a masịrị m: 14  E nwere otu obere obodo mmadụ ole na ole bi na ya. Otu eze siri ike bịara iluso obodo a ọgụ. Ọ gbara ya gburugburu ma rụọ mgbidi dị elu ọ ga-eji nọchibido ya. 15  E nwere otu nwoke ma ihe bi n’obodo a, ma ọ bụ ogbenye. O ji amamihe o nwere napụta obodo a. Ma e nweghị onye chetara ogbenye a.+ 16  M gwaziri onwe m, sị: ‘Mmadụ ịma ihe dị mma karịa mmadụ isi ike.+ Ma a naghị eji amamihe ogbenye akpọrọ ihe, a naghịkwa eme ihe o kwuru.’+ 17  Ọ ka mma mmadụ ime ihe onye ma ihe weturu obi kwuo kama ime ihe onye na-achị ndị nzuzu tiri ná mkpu. 18  Amamihe ka ngwá agha mma, ma naanị otu onye mmehie nwere ike imebi ọtụtụ ihe ọma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-adabara.”
Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
Ma ọ bụ “na-adabara.”
Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
Ya bụ, uwe chapụrụ achapụ nke na-egosi na obi dị onye yi ya ụtọ, ọ bụghị uwe e ji eru uju.
Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ihe mberede.”
Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”