Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE BAỊBỤL KWURU

Di na Nwunye

Di na Nwunye

Alụmdi na nwunye ọ̀ bụ naanị mmadụ abụọ ikweta na ha ga-ebi?

“Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:6.

IHE BAỊBỤL KWURU

N’anya Chineke, alụmdi na nwunye abụghị naanị mmadụ abụọ ikweta na ha ga-ebi. Kama, alụmdi na nwunye bụ ihe si n’aka Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Malite n’oge e kere ihe, ‘[Chineke] kere ha nwoke na nwaanyị. N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́’ . . . Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” *Mak 10:6-9; Jenesis 2:24.

“Ihe Chineke kekọtara” e kwuru n’ebe a apụtaghị na Chineke na-edere onye ọ bụla onye ọ ga-alụ. Kama, ihe ọ pụtara bụ na ebe ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye, anyị ekwesịghị iji ya na-egwu egwu. Ọ bụrụ na di na nwunye aghọta na alụmdi na nwunye si n’aka Chineke, ha ga na-agba mbọ ka ihe ọ bụla ghara itisa ha. Obi ga na-adịkwa ha ụtọ ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ha na-eme ihe Baịbụl gwara ha ka ha na-eme n’ezinụlọ.

 Gịnị bụ ọrụ nwoke n’ezinụlọ?

“Di bụ isi nke nwunye ya.”—Ndị Efesọs 5:23.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ka ihe wee na-aga aga n’ezinụlọ, e kwesịrị inwe onye ga-abụ onyeisi ya. Baịbụl kwuru na ọ bụ di bụ onyeisi ezinụlọ. Ma, ọ pụtaghị na ọ ga-abụ eze onye agwala m. O kwesịghịkwa ileghara ọrụ ya anya. Ime otú ahụ ga-eme ka nwunye ya na-arụgbu onwe ya n’ọrụ, meekwa ka ọ ghara ịna-asọpụrụ ya. Kama ileghara ọrụ ya anya, Chineke chọrọ ka ọ na-arụsi ọrụ ike ka o nwee ike ịna-elekọta nwunye ya ma na-akwanyere ya ùgwù. (1 Timoti 5:8; 1 Pita 3:7) Ndị Efesọs 5:28 kwuru, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.”

Obi ga na-adị di ụtọ n’ihe nwunye ma eme ma ọ bụrụ na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ ga na-egekwa ya ntị ma ọ na-atụ aro ihe ha nwere ike ime n’ezinụlọ ha. Di ekwesịghị isi ọnwụ na a ga-eme ihe o kwuru n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ. Mgbe Ebreham jụrụ ime ihe Sera gwara ya, Jehova Chineke gwara ya, sị: “Gee ntị n’olu ya.” (Jenesis 21:9-12) Ebreham gere nwunye ya ntị. Ntị ahụ o gere ya mere ka ezinụlọ ha dịrị n’udo, Chineke agọziekwa ha.

Gịnị bụ ọrụ nwaanyị n’ezinụlọ?

“Ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu.”—1 Pita 3:1.

IHE BAỊBỤL KWURU

Tupu Chineke ekee nwunye Adam, o kwuru, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” (Jenesis 2:18) N’ihi ya, Chineke kere nwaanyị ahụ ka ọ na-enyere di ya aka, ọ bụghị ka ya na ya na-adọ onye ga-abụ onyeisi ezinụlọ. Ha abụọ ga-enwezi ike ime ihe Chineke gwara ha, ya bụ, “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa.”—Jenesis 1:28.

Chineke kere nwaanyị ahụ otú ọ ga-enwe ike ịrụ ọrụ ya n’ezinụlọ. Ọ bụrụ na ọ na-arụ ọrụ ya nke ọma, ọ ga-enye aka mee ka ihe na-aga aga n’ezinụlọ, obi ga-erukwa di ya ala. Chineke chọrọ ka a na-aja nwaanyị ọ bụla na-arụ ọrụ ya nke ọma mma. *Ilu 31:28, 31.

^ para. 5 Baịbụl kwuru na naanị ihe nwere ike ime ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm bụ ịkwa iko.—Matiu 19:9.

^ para. 14 Isiokwu a na-akpọ “Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka” na-agbakarị na Teta! Ọ bụrụ na di na nwunye na-agụ isiokwu ahụ, ha ga-ahụ ihe ndị ga-enyere ha aka n’ezinụlọ ha.