Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Ka Nwoke Lụọ Karịa Otu Nwaanyị?

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Ka Nwoke Lụọ Karịa Otu Nwaanyị?

Ihe Baịbụl Kwuru

 O nwere mgbe Chineke hapụrụ ụmụ nwoke ka ha na-alụ karịa otu nwaanyị. (Jenesis 4:19; 16:1-4; 29:18-29) Ma, ọ bụghị Chineke gwara ha mewe otú ahụ. Mgbe Chineke kere Adam, ihe o nyere ya bụ naanị otu nwaanyị.

 Chineke nyere Jizọs Kraịst ikike ka o kwuo na ya ka chọrọ ka ụmụ nwoke na-alụ naanị otu nwaanyị. (Jọn 8:28) Mgbe ndị mmadụ jụrụ Jizọs gbasara ịgba alụkwaghịm, ọ sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’?”—Matiu 19:4, 5.

 Chineke mechara nye otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs ike mmụọ nsọ, ya edee, sị: “Ka nwoke ọ bụla nwee nwunye nke ya, ka nwaanyị ọ bụla nweekwa di nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 7:2) Baịbụl kwukwara na nwoke ọ bụla lụrụ nwaanyị kwesịrị ịbụ “di nke otu nwunye” ma ọ bụrụ na a ga-enye ya ọrụ pụrụ iche n’ọgbakọ Chineke.—1 Timoti 3:2, 12.