Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Kagburu Mmadụ Ịlụ Onye Agbụrụ Ọzọ?

Baịbụl Ọ̀ Kagburu Mmadụ Ịlụ Onye Agbụrụ Ọzọ?

Ihe Baịbụl kwuru

 O nweghị agbụrụ Chineke weere na ọ ka ibe ya. N’ihi ya, Chineke kwadoro mmadụ ịlụ onye agbụrụ ọzọ. Baịbụl sịrị na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya . . . bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

 Lee ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru iji gosi na agbụrụ niile hà otu, nakwa ihe o kwuru ga-enyere onye chọrọ ịlụ onye agbụrụ ọzọ aka.

Agbụrụ niile si n’otu ezinụlọ

 Mmadụ niile si na nwoke mbụ bụ́ Adam, na nwunye ya bụ́ Iv. Baịbụl kpọrọ Iv “nne nke onye ọ bụla dị ndụ.” (Jenesis 3:20) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na Chineke ‘sitere n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ.’ (Ọrụ Ndịozi 17:26) N’agbanyeghị agbụrụ onye si, mmadụ niile si n’otu ezinụlọ. Oleekwanụ ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị bi n’ebe i bi na-akpa okè agbụrụ ma na-ewere na ụfọdụ ndị ka ibe ha?

Ndị maara ihe “na-agba izu”

 Ọ bụ eziokwu na Chineke kwadoro mmadụ ịlụ onye agbụrụ ọzọ, ma e nwere ndị kpọrọ ịlụ onye agbụrụ ọzọ asị. (Aịzaya 55:8, 9) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ onye agbụrụ ọzọ, gị na onye ahụ kwurịta ihe ndị a dị n’okpuru ebe a:

  •   Olee ihe unu ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị obodo unu enyewe unu nsogbu?

  •   Olee otú unu ga-esi nyere ụmụ unu aka ịma ihe ha ga-eme ma ndị ọzọ kpasowa ha àgwà ọjọọ n’ihi agbụrụ ha si?

 Isi otú a ‘gbaa izu’ ga-enyere unu aka ka unu biri n’udo ma unu lụọ.—Ilu 13:10; 21:5.