Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Aka Ịna-ebi n’Udo

Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Aka Ịna-ebi n’Udo

Ì CHERE na Baịbụl nwere ike ime ka udo dị n’ezinụlọ? Ndị na-ebipụta akwụkwọ a gbara ụfọdụ ndị ajụjụ ọnụ gbasara ihe ndị na-enyere ha aka ibi n’udo n’ezinụlọ ha. Na peeji na-esonụ, e dere ma ihe ndị ahụ kwuru ma ihe Baịbụl kwuru. Biko, jiri ihe ndị Baịbụl kwuru tụnyere ihe hanwa kwuru ka ị mata ihe ga-enyere unu aka ka unu hụkwuo onwe unu n’anya ma na-ebi n’udo n’ezinụlọ unu.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA ỊNA-ADỊ N’UDO

NA-ELE DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ ANYA ỌMA.

‘Emela ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.’Ndị Filipaị 2:3, 4.

Otu nwaanyị lụrụla di kemgbe afọ iri na itoolu kwuru na ọ dị mma mmadụ iwere na di ya ma ọ bụ nwunye ya ka ma yanwa ma ndị ọzọ.

GEE YA NTỊ NKE ỌMA MA Ọ NA-EKWU OBI YA.

“Nọgide na-echetara ha . . . ka ha ghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ, ka ha nwee ezi uche, na-adị nwayọọ n’ụzọ zuru ezu n’ebe mmadụ niile nọ.”Taịtọs 3:1, 2.

Otu nwaanyị lụrụla di afọ iri abụọ kwuru na mmadụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya agaghị na-esekarị okwu ma ọ bụrụ na ọ naghị eji iwe agwa ya okwu. O kwukwara na ihe ọzọ ga-enye aka bụ mmadụ ige di ya ma ọ bụ nwunye ya ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwu uche ya ma chebara ihe o kwuru echiche, ọ bụrụgodị na ọ chọghị ka ha mee ihe ahụ o kwuru.

JIRI NWAYỌỌ NA-EMESO YA IHE, NWEKWAARA YA NDIDI.

“Ndidi ka a na-eji akpali ọchịagha ime ihe, ire dị nro pụkwara ịgbaji ọkpụkpụ.”Ilu 25:15.

Nwaanyị ọzọ lụrụla di afọ iri abụọ na asaa kwuru na di na nwunye nwere ike inwe nghọtahie, ma ihe ga-enyere ha aka bụ àgwà ha na-akpa n’oge ahụ. Ọ sịkwara na di na nwunye kwesịrị ịna-enwere ibe ha ndidi n’ihi na ọ ga-eme ka ha kpezie.

AGWALA YA OKWU ỌJỌỌ, ETIKWALA YA IHE.

“Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.”Ndị Kọlọsi 3:8.

Otu nwaanyị lụrụla di afọ iri abụọ kwuru gbasara di ya, sị: “Otú di m si ejide onwe ya na-eme m obi ụtọ. Ọ naghị eji olu ike agwa m okwu, ọ naghịkwa agwa m okwu ọjọọ.”

NA-EKPEZI NGHỌTAHIE OZUGBO, NA-AGBAGHAKWARA YA.

“Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”Ndị Kọlọsi 3:13.

Otu nwaanyị lụrụla di afọ iri atọ na anọ kwuru na mmadụ nwere ike ime ihe na-adịghị mma ma ọ bụ gwa di ya ma ọ bụ nwunye ya okwu ọjọọ ma iwe na-ewe ya. O kwukwara na ihe dịrị otú a, onye nke ahụ a gwara okwu ọjọọ kwesịrị ịgbaghara n’ihi na o nweghị di na nwunye ga na-ebi n’udo ma ọ bụrụ na ha anaghị agbaghara ibe ha.

ADỊLA AKA NTAGIDE.

“Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. . . . N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.”Luk 6:38.

Otu nwaanyị lụrụla di afọ iri anọ na anọ kwuru, sị: “Di m ma ihe ndị na-amasị m, ọ na-enyekwa m ha. Mụnwa na-enyekwa ya ihe ndị na-eme ya obi ụtọ. Otú a anyị si enye ibe anyị ihe emeela ka anyị na-enwe obi ụtọ.”

NỌGIDE NA-EME IHE UDO GA-EJI DỊ N’EZINỤLỌ GỊ

E wezụga ndị a e dere ihe ha kwuru n’isiokwu a, e nwekwara nde kwuru nde ndị ọzọ Baịbụl nyeerela aka ịmụta ịkpa àgwà ndị na-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ. * Ụdị ndị a na-agba mbọ na-eme ihe udo ga-eji dị n’ezinụlọ ha a sịgodị na di ha ma ọ bụ nwunye ha anaghị eme ihe ha kwesịrị ime. Ha na-eme ihe a niile n’ihi na Baịbụl kwuru na ndị “udo na-aṅụrị ọṅụ.”—Ilu 12:20.

^ para. 23 Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ga-eme ka udo na-adị n’ezinụlọ, gụọ isi iri na anọ n’akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Akwụkwọ a dịkwa na www.pr418.com/ig. Ị gaakwa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI na jw.org/ig pịa ebe e dere IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA, ị ga-ahụ isiokwu ndị ọzọ ga-enyere gị aka.