Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

John Moore/Getty Images

MKPỌSA PỤRỤ ICHE

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ahụ́ Ike Anyị

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ahụ́ Ike Anyị

 N’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Mee afọ 2023, Dr. Tedros Adhanom Ghebreyesus, bụ́ onyeisi Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike, kwuru, sị:Ọ bụ eziokwu na ọrịa koronavaịrọs anaghịzi egbu ndị mmadụ ka ọkụkọ, ma ọ pụtaghị na ọ kwụsịla ịkpa ike n’ụwa. . . . O doro anya na ọrịa ọjọọ ọzọ ga-ebido ịkpa ike n’ọdịnihu, anyị kwesịkwara ịdị njikere maka ya.”

 Ọtụtụ ndị ka na-arịa ọrịa, ụbụrụ akpakọghịkwa ha ọnụ n’ihi nsogbu ndị ọrịa koronavaịrọs kpataara ha. Ndị ọchịchị na ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka ahụ́ ike hà ga-adịli njikere maka ọrịa ọzọ nwere ike ịkpa ụwa niile aka ọjọọ echi, ma ya fọzie inyere anyị aka n’ọrịa ndị na-echi anyị ọnụ n’ala?

 Baịbụl kwuru na e nwere otu ọchịchị ga-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla anyị na-arịa. Ọ sịrị na “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze. . . (ma ọ bụ ọchịchị) malite ịchị.” (Daniel 2:44) N’oge ahụ, “o nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ‘Ahụ́ adịghị m.’” (Aịzaya 33:24) Ahụ́ ga-adị mmadụ niile mma, ha agbasiekwa ike ka ụmụ okorobịa.​—Job 33:25.