Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Eze nke Alaeze Chineke?

Ònye Bụ Eze nke Alaeze Chineke?

Chineke mere ka ọtụtụ ndị so dee Baịbụl dee ọtụtụ ihe a ga-eji amata onye ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke. Eze a ga-abụ

  • Onye Chineke họọrọ. ‘Echiela m onye m họpụtara eze. M ga-enye gị mba dị iche iche ka ha bụrụ ihe i ketara, nyekwa gị ebe niile ụwa sọtụrụ ka ha bụrụ nke gị.’​—Abụ Ọma 2:6, 8.

  • Onye si n’agbụrụ Eze Devid. “A mụụrụ anyị otu nwa, e nyere anyị otu nwa nwoke. . . . Ọchịchị ya ga-eru ebe niile. Udo agaghịkwa akwụsị ịdị n’ocheeze Devid nakwa n’alaeze ya. A ga-eme ka alaeze ya sie ike.”​—Aịzaya 9:6, 7.

  • Onye a mụrụ na Betlehem. ‘Betlehem, ọ bụ na gị ka onye m ga-eme eze Izrel ga-esi pụta. Ọ ga-abụ onye ukwu n’ebe niile n’ụwa.’​—Maịka 5:2, 4.

  • Onye ndị mmadụ jụrụ ma gbuo. “Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya. . . . A mara ya ube n’ihi mmehie anyị. E chiri ya ọnụ n’ala n’ihi ihe anyị mejọrọ.”​—Aịzaya 53:3, 5.

  • Onye a kpọlitere n’ọnwụ, ya anọrọ n’aka nri Chineke. “Ị gaghị ahapụ m n’ili. Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike nọrọ n’ili. . . . Onye nọ n’aka nri gị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 16:10, 11.

Jizọs Kraịst Ruru Eru Ịchị Ụmụ Mmadụ

Kemgbe ụmụ mmadụ dịwara ndụ n’ụwa a, ọ bụ naanị otu onye ka ihe niile ahụ e kwuru e ji ama ezigbo Onye ọchịchị dabara nnọọ adaba n’ebe ọ nọ. Onye ahụ bụ Jizọs Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na otu mmụọ ozi gwara Meri nne Jizọs, sị: “Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid. . . . Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.”​—Luk 1:31-33.

Jizọs abụghị onye ọchịchị mgbe ọ nọ n’ụwa. Kama, ebe ọ bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga-anọ n’eluigwe na-achị ụmụ mmadụ. Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ ezigbo Onye ọchịchị? Ka anyị tụlee ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’ụwa.

  • Ihe gbasara ndị mmadụ metụrụ Jizọs n’obi. Jizọs nyeere ndị mmadụ aka, ma ụmụaka ma ndị agadi, ma ọgaranya ma ogbenye, n’agbanyeghị ebe ha si. (Matiu 9:36; Mak 10:16) Mgbe otu onye ekpenta rịọrọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha,” Jizọs meteere ya ebere ma gwọọ ya.​—Mak 1:40-42.

  • Jizọs kụziiri anyị otú anyị ga-esi na-eme uche Chineke. O kwuru, sị: “Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” O kwuru na anyị kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ ihe otú anyị chọrọ ka ha si na-emeso anyị. Jizọs gosikwara na ọ bụghị naanị na Chineke nwere mmasị n’ihe anyị na-eme, kama na o nwekwara mmasị n’otú anyị si eche echiche na otú obi na-adị anyị. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eme uche Chineke, anyị ga-agbalị ghara ịna-eche ihe ọjọọ n’obi anyị. (Matiu 5:28; 6:24; 7:12) Jizọs kwukwara na ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ anyị ịmụta ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme ma na-eme ha.​—Luk 11:28.

  • Jizọs kụziiri anyị ihe ịhụ ndị ọzọ n’anya pụtara. Ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere kpara ezigbo ike n’ahụ́ ndị ọ kụziiri ihe, ruokwa ha n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya, n’ihi na ọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike.” (Matiu 7:28, 29) Ọ kụzikwaara ha, sị: “Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya.” O kpedịrị ekpere gbasara ụfọdụ ndị so gbuo ya, sị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”​—Matiu 5:44; Luk 23:34.

Jizọs ruru eru ịbụ ezigbo Onye ọchịchị ga-achị ụwa n’ihi na ọ na-enyere ndị mmadụ aka ma na-emere ha ebere. Ma, olee mgbe ọ ga-amalite ịchị?