Ozi Ọma Matiu Dere 4:1-25

  • Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa (1-11)

  • Jizọs bidoro ikwusa ozi ọma na Galili (12-17)

  • Jizọs kpọrọ ndị mbụ ga-eso ụzọ ya (18-22)

  • Jizọs kwusara ozi ọma, zie ndị mmadụ ihe, gwọọkwa ndị ọrịa (23-25)

4  Mmụọ nsọ wee duru Jizọs banye n’ala ịkpa ka Ekwensu+ nwaa ya ọnwụnwa.+  Mgbe o buchara ọnụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, agụụ gụwara ya.  Onye Ọnwụnwa+ ahụ bịakwara sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”  Ma ọ sịrị: “E dere, sị: ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova* pụta.’”+  Ekwensu wee kpọrọ ya banye n’obodo nsọ+ ma mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ+  wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda, n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume.’”+  Jizọs wee sị ya: “E dekwara, sị: ‘Anwala Jehova* bụ́ Chineke gị ọnwụnwa.’”+  Ekwensu kpọkwaara ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.+  O wee sị ya: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.”* 10  Jizọs wee sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ Jehova* bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe,+ ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.’”*+ 11  Ekwensu wee hapụ ya.+ Ma, ndị mmụọ ozi bịara malite ijere ya ozi.+ 12  Ma mgbe Jizọs nụrụ na e jidela Jọn,+ ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.+ 13  Mgbe ọ hapụkwara Nazaret, ọ gara biri na Kapaniọm+ n’akụkụ oké osimiri dị n’ógbè Zebulọn na Naftalaị, 14  ka amụma Aịzaya onye amụma buru wee mezuo. Ọ sịrị: 15  “Zebulọn na Naftalaị, ndị dị na Galili ndị mba ọzọ bi, n’ụzọ e si aga n’oké osimiri, n’ofe Osimiri Jọdan: 16  Ndị nọ n’ọchịchịrị hụrụ ezigbo ìhè, ìhè+ nwukwaara ndị nọ n’ebe ọnwụ dị ka ọchịchịrị nke kpuchiri ndị mmadụ.”+ 17  Malite n’oge ahụ, Jizọs bidoro ikwusa, sị: “Chegharịanụ, n’ihi na Alaeze eluigwe adịla nso.”+ 18  Ka ọ na-aga n’akụkụ Oké Osimiri Galili,* ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pita,+ na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ n’oké osimiri, n’ihi na ha bụ ndị na-akụ azụ̀.+ 19  O wee sị ha: “Soronụ m. M ga-eme ka unu bụrụ ndị na-akụta mmadụ.”+ 20  Ha hapụrụ ụgbụ ha ozugbo soro ya.+ 21  Mgbe o si ebe ahụ gakwuo n’ihu, ọ hụrụ mmadụ abụọ ọzọ bụ́ ụmụnne, Jems nwa Zebedi na Jọn nwanne ya.+ Ha na Zebedi nna ha nọ n’ụgbọ mmiri na-edozi ụgbụ ha, o wee kpọọ ha.+ 22  Ha hapụrụ ụgbọ mmiri ahụ na nna ha wee soro ya ozugbo. 23  O wee gazuo Galili niile,+ na-akụzi ihe n’ụlọ nzukọ ha,+ na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke, na-agwọkwa ndị mmadụ ụdị ọrịa ọ bụla ha na-arịa.+ 24  Akụkọ banyere ya gazuru Siria niile. Ha wee kpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa na ndị niile ihe dị iche iche na-emekpa ahụ́,+ ndị mmụọ ọjọọ ji,+ ndị akwụkwụ+ na ndị ahụ́ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, o wee gwọọ ha. 25  N’ihi ya, oké ìgwè mmadụ si na Galili na Dikapọlis* na Jeruselem na Judia na ofe Osimiri Jọdan soro ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “fee m otu ugboro.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ijere ozi dị nsọ.”
Ọ bụ ọdọ mmiri. Baịbụl kpọkwara ya Ọdọ Mmiri Genesaret na Oké Osimiri Taịbirias.
Ma ọ bụ “Obodo Nwere Obodo Nta Iri.”