Ozi Ọma Matiu Dere 23:1-39

  • Unu emela ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii (1-12)

  • Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ga-ata ahụhụ (13-36)

  • Jizọs beere Jeruselem ákwá arịrị (37-39)

23  Jizọs gwaziri ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya, sị:  “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii agaala nọrọ n’oche Mosis.  N’ihi ya, ihe niile ha na-agwa unu, meenụ ha. Ma unu emela ihe ha na-eme, n’ihi na ha na-ekwu ma ha anaghị eme ihe ha na-ekwu.+  Ha na-ekekọta ibu dị arọ dọkwasị n’ubu ndị mmadụ,+ ma hanwa anaghị achọ ịrụtụ ha mkpịsị aka ha.+  Ha na-achọ ka ndị mmadụ hụ ihe niile ha na-eme,+ n’ihi na ha na-eme ka mkpọ̀* ha na-ekekwasị n’egedege ihu ha na n’aka ekpe ha+ bukwuo ibu, na-emekwa ka ọnụ ọnụ uwe ha dịkwuo ogologo.+  Ọ na-atọ ha ụtọ ịnọ n’isi oche ná nri anyasị nakwa n’oche ihu* n’ụlọ nzukọ+  nakwa ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, ka ndị mmadụ na-akpọkwa ha Onye Ozizi.*  Ma unu ekwela ka a na-akpọ unu Onye Ozizi,*+ n’ihi na otu onye bụ Onye Ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna.  Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu,+ Onye bi n’eluigwe. 10  Unu ekwekwala ka a na-akpọ unu ndị ndú, n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst. 11  Ma onye kacha ukwuu n’etiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 12  Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala.+ Onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.+ 13  “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ, unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-emechi ụzọ Alaeze eluigwe n’ihu ndị mmadụ. Unu anaghị abanye, unu anaghịkwa ekwe ka ndị chọrọ ịbanye banye.+ 14 * —— 15  “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ,+ unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-agafe oké osimiri, na-agakwa ebe niile iji tọghata otu onye. Mgbe unu tọghatara ya, unu na-eme ka ọ bụrụ onye a ga-atụba na Gehena* okpukpu abụọ karịa unu. 16  “Ndị ndú kpuru ìsì,+ unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla nke ji ụlọ nsọ ṅụọ iyi emeghị ihe ọjọọ, ma onye ọ bụla nke ji ọlaedo dị n’ụlọ nsọ ṅụọ iyi adaala iwu.’+ 17  Ndị nzuzu na ndị ìsì! Oleedị nke ka ibe ya? Ọ̀ bụ ọlaedo, ka ọ̀ bụ ụlọ nsọ nke mere ka ọlaedo ahụ dị nsọ? 18  Unu na-asịkwa, ‘Onye ọ bụla nke ji ebe ịchụàjà ṅụọ iyi emeghị ihe ọjọọ, ma onye ọ bụla nke ji onyinye dị n’elu ya ṅụọ iyi adaala iwu.’ 19  Ndị ìsì! Oleedị nke ka ibe ya? Ọ̀ bụ onyinye, ka ọ̀ bụ ebe ịchụàjà nke mere ka onyinye ahụ dị nsọ? 20  N’ihi ya, onye ọ bụla ji ebe ịchụàjà ṅụọ iyi ji ya na ihe niile dị n’elu ya ṅụọ iyi. 21  Onye ọ bụla ji ụlọ nsọ ṅụọ iyi jikwa Onye bi na ya ṅụọ iyi.+ 22  Onye jikwa eluigwe ṅụọ iyi ji ocheeze Chineke na Onye nọ na ya ṅụọ iyi. 23  “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ. Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint nakwa mkpá akwụkwọ dil nakwa mkpụrụ kọmin,+ ma unu na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu* anya, ya bụ, ikpe ziri ezi+ na ebere+ na ikwesị ntụkwasị obi. Unu kwesịrị ịna-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị ahụ, ma unu ekwesịghị ileghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu anya.+ 24  Ndị ndú kpuru ìsì,+ unu na-azapụ anwụnta+ ma na-eloda kamel.+ 25  “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ. Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu dị ka iko na efere azụ ha dị ọcha,+ ma ime ha ruru unyi. Ihe juru unu n’obi bụ anyaukwu+ na ime ihe na-amasị unu.+ 26  Ndị Farisii kpuru ìsì, burunụ ụzọ mee ka ime iko na ime efere dị ọcha, ka azụ ha wee dịkwa ọcha. 27  “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ.+ Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu yiri ili e tere nzu,+ nke na-eyi ihe mara mma n’elu ma ime ya ejupụta n’ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ nakwa n’ụdị adịghị ọcha ọ bụla. 28  Otú ahụkwa ka unu na-eyi ndị ezi omume n’anya ndị mmadụ, ma ihe juru n’ime unu bụ ihu abụọ na mmebi iwu.+ 29  “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ.+ Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-arụ ili ndị amụma ma na-achọ ili* ndị ezi omume mma.+ 30  Unu na-asịkwa, ‘Ọ bụrụ na anyị nọ n’oge nna nna anyị hà, anyị agaraghị eso ha gbuo* ndị amụma.’ 31  N’ihi ya, unu na-agba akaebe na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma.+ 32  Ebe ọ dị otú ahụ, rụchaanụ ọrụ nna nna unu hà bidoro.* 33  “Unu agwọ, ụmụ ajụala,+ olee otú unu ga-esi ghara iso ná ndị a ga-ekpe ikpe tụba na Gehena?*+ 34  N’ihi ya, m na-ezitere unu ndị amụma+ na ndị ma ihe na ndị na-ezi ihe n’ihu ọha.+ Unu ga-egbu ụfọdụ n’ime ha,+ kpọgidekwa ha n’osisi, unu ga-apịakwa ụfọdụ n’ime ha ihe+ n’ụlọ nzukọ unu, kpagbuokwa ha+ si n’obodo ruo n’obodo, 35  ka ọbara ndị ezi omume niile e gburu* n’ụwa wee dị n’isi unu, malite n’ọbara Ebel onye ezi omume+ ruo n’ọbara Zekaraya nwa Barakaya, onye unu gburu n’agbata ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà.+ 36  N’eziokwu, ana m asị unu, a ga-ata ọgbọ a ahụhụ maka ihe ndị a niile. 37  “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,+ achọọla m ịchịkọta ụmụ gị ọtụtụ ugboro dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya, ma ị chọghị ya.+ 38  A hapụrụla unu ụlọ unu.*+ 39  N’ihi na ana m asị unu, unu agaghị ahụ m malite ugbu a ruo mgbe unu ga-asị, ‘Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi.”’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

A na-etinye amaokwu Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ná mkpọ̀ a. Ndị Juu na-eji ya emere ọtụmọkpọ na-echebe ha.
Ma ọ bụ “n’ebe kacha mma.”
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A3.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Na Grik, “wụfuo ọbara.”
Na Grik, “meenụ ka ihe nna nna unu hà ji atụ̀ ihe ju eju.”
Na Grik, “a wụfuru.”
O nwere ike ịbụ, “A hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nkịtị.”
Gụọ A5.