Ozi Ọma Matiu Dere 22:1-46

  • Ihe atụ gbasara oriri agbamakwụkwọ (1-14)

  • Chineke na Siza (15-22)

  • A jụrụ Jizọs ajụjụ gbasara mbilite n’ọnwụ (23-33)

  • Iwu abụọ kacha iwu niile (34-40)

  • Kraịst ọ̀ bụ nwa Devid? (41-46)

22  Jizọs meere ha ihe atụ ọzọ, sị:  “E nwere ike iji Alaeze eluigwe tụnyere otu eze nke meere nwa ya nwoke oriri agbamakwụkwọ.+  O wee zie ndị ohu ya ka ha gaa kpọọ ndị ọ kpọrọ òkù ịbịa oriri agbamakwụkwọ ahụ, ma ha ekweghị abịa.+  O zikwara ndị ohu ya ndị ọzọ, sị ha, ‘Gwanụ ndị ahụ a kpọrọ òkù, sị: “Akwadebela m nri. E gbuola oké ehi na anụ ndị gbara agba. A kwadebekwala ihe niile. Bịanụ oriri agbamakwụkwọ a.”’  Ma ha leghaara ya anya wee gawa mkpa ha, otu onye n’ubi ya, onye ọzọ n’ahịa ya.+  Ma ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbuo ha.  “Ma eze ahụ were iwe, ziga ndị agha ya, ha egbuo ndị ahụ gburu ndị ohu ya, gbaakwa obodo ha ọkụ.+  O wee sị ndị ohu ya, ‘A kwadebela oriri agbamakwụkwọ a. Ma, ndị a kpọrọ òkù erughị eru ịbịa ya.+  N’ihi ya, gaanụ n’okporo ụzọ ndị e si apụ n’obodo, kpọọkwanụ onye ọ bụla unu hụrụ ka ọ bịa oriri agbamakwụkwọ a.’+ 10  N’ihi ya, ndị ohu ahụ gara n’okporo ụzọ wee kpọkọọ ndị niile ha hụrụ, ma ndị ọjọọ ma ndị ọma. Ọnụ ụlọ a nọ na-eme ememme agbamakwụkwọ ahụ wee jupụta ná ndị nọ na-eri ihe. 11  “Mgbe eze ahụ batara inyocha ndị ọbịa ahụ, ọ hụrụ otu nwoke na-eyighị uwe agbamakwụkwọ. 12  O wee sị ya, ‘Enyi, olee otú i si bata ebe a n’eyighị uwe agbamakwụkwọ?’ Ma, okwu ekweghị ya okwukwu. 13  Eze ahụ gwaziri ndị na-ejere ya ozi, sị, ‘Keenụ ya agbụ ụkwụ na aka ma tụpụ ya n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.’ 14  “N’ihi na ndị a kpọrọ òkù dị ọtụtụ, ma ole na ole ka a họọrọ.” 15  Ndị Farisii gaziri gbaa izu ka ha jiri ihe ọ ga-ekwu mata ya n’ọnyà.+ 16  Ha wee zigara ya ndị na-eso ụzọ ha, tinyere ndị òtù Herọd,+ wee sị ya: “Onye Ozizi, anyị ma na ị na-ekwu eziokwu. Ihe ị na-akụzi banyere Chineke bụkwa eziokwu. Ị naghịkwa asọ onye ọ bụla anya n’ihi na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu. 17  Gwazie anyị, gịnị ka i chere? È kwesịrị ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na e kwesịghị?” 18  Ma ebe Jizọs ma nkata ọjọọ ha na-akpa, ọ sịrị ha: “Ndị ihu abụọ, gịnị mere unu ji anwa m? 19  Gosinụ m mkpụrụ ego e ji atụ ụtụ isi.” Ha wee wetara ya otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 20  O wee sị ha: “Isi ònye na aha ònye dị n’ego a?” 21  Ha asị ya: “Ọ bụ nke Siza.” Ya asịzie ha: “N’ihi ya, kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ 22  Mgbe ha nụrụ ya, ọ tụrụ ha n’anya, ha ahapụ ya pụọ. 23  N’ụbọchị ahụ, ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị,+ bịara jụọ ya, sị:+ 24  “Onye Ozizi, Mosis sịrị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’amụtaghị ụmụ, nwanne ya nwoke ga-alụwa nwunye ya wee mụtara nwanne ya nwoke nwa.’+ 25  Ma, e nwere ụmụnne asaa. Nke mbụ lụrụ nwaanyị ma nwụọ n’amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke alụwazie nwunye ya. 26  Otu ihe ahụ mere onye nke abụọ, meekwa onye nke atọ, ruo mgbe o mechara mmadụ asaa ahụ niile. 27  N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụkwara. 28  N’ihi ya, a kpọlite ha n’ọnwụ, ònye n’ime mmadụ asaa ahụ ka ọ ga-abụ nwunye ya, ebe ọ bụ na ha niile lụchara ya?” 29  Jizọs wee sị ha: “Unu furu ụzọ, n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa otú ike Chineke si arụ ọrụ.+ 30  N’ihi na mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ụmụ nwoke agaghị alụ nwaanyị, a gaghịkwa eke ụmụ nwaanyị di, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.+ 31  Ọ̀ bụ na unu agụbeghị ihe Chineke gwara unu gbasara ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? Ọ sịrị: 32  ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+ Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.”+ 33  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nụrụ ya, otú o si ezi ihe eju ha anya.+ 34  Mgbe ndị Farisii nụrụ na o mechiela ndị Sadusii ọnụ, ha niile bịakwutere ya. 35  Otu n’ime ha ma Iwu* nke ọma jụrụ ya ajụjụ iji nwaa ya. Ọ jụrụ ya, sị: 36  “Onye Ozizi, olee iwu kacha iwu niile n’Iwu Mosis?”+ 37  O wee sị ya: “‘Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na uche gị niile hụ Jehova* bụ́ Chineke gị n’anya.’+ 38  Ọ bụ ya bụ iwu kacha iwu niile, bụrụkwa nke mbụ. 39  Nke abụọ, dị ka ya, bụ: ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’+ 40  Ọ bụ n’iwu abụọ a ka Iwu ahụ niile na Akwụkwọ Ndị Amụma hiwere isi.”+ 41  Mgbe ndị Farisii zukọtara, Jizọs jụrụ ha, sị:+ 42  “Gịnị ka unu chere banyere Kraịst? Nwa ònye ka ọ bụ?” Ha asị ya: “Nwa Devid.”+ 43  Ọ jụziri ha, sị: “Oleezi otú o si bụrụ na Devid si n’ike mmụọ nsọ+ kpọọ ya Onyenwe m, sị, 44  ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị nọrọ n’okpuru ụkwụ gị”’?+ 45  Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya Onyenwe m, oleezi otú o si bụrụ nwa ya?”+ 46  Ọ dịghị onye nwere ike ịza ya ihe ọ bụla. Malitekwa n’ụbọchị ahụ gawa, ọ dịghị onye nwara ịjụ ya ajụjụ ọzọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B14.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Gụọ A5.
Gụọ A5.