Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ozi Ọma Matiu Dere

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Usoro ọmụmụ Jizọs Kraịst (1-17)

    • Mgbe a mụrụ Jizọs (18-25)

  • 2

    • Ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu gara leta nwa a mụrụ ọhụrụ (1-12)

    • Josef kpọ ezinụlọ ya gbaga Ijipt (13-15)

    • Herọd gburu ụmụ nwoke a mụrụ ọhụrụ (16-18)

    • Josef kpọ ezinụlọ ya lọta Nazaret (19-23)

  • 3

    • Jọn Onye Na-eme Baptizim na-ekwusa ozi ọma (1-12)

    • Mgbe Jizọs mere baptizim (13-17)

  • 4

    • Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa (1-11)

    • Jizọs bidoro ikwusa ozi ọma na Galili (12-17)

    • Jizọs kpọrọ ndị mbụ ga-eso ụzọ ya (18-22)

    • Jizọs kwusara ozi ọma, zie ndị mmadụ ihe, gwọọkwa ndị ọrịa (23-25)

  • 5

    • IHE JIZỌS NỌ N’ELU UGWU KỤZIE (1-48)

      • Jizọs bidoro izi ndị mmadụ ihe n’elu ugwu (1, 2)

      • Ihe itoolu na-eme ka e nwee obi ụtọ (3-12)

      • Nnu na ìhè (13-16)

      • Jizọs bịara imezu Iwu Mosis (17-20)

      • Ndụmọdụ gbasara iwe (21-26), ịkwa iko (27-30), ịgba alụkwaghịm (31, 32), ịṅụ iyi (33-37), imegwara ihe (38-42), mmadụ ịhụ ndị iro ya n’anya (43-48)

  • 6

    • IHE JIZỌS NỌ N’ELU UGWU KỤZIE (1-34)

      • Emela ezi omume ka ndị mmadụ hụ gị (1-4)

      • Otú e si ekpe ekpere (5-15)

        • Ekpere Nna anyị nke bi n’eluigwe (9-13)

      • Ibu ọnụ (16-18)

      • Akụ̀ ndị dị n’ụwa na ndị dị n’eluigwe (19-24)

      • Kwụsị ichegbu onwe gị (25-34)

        • Buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke (33)

  • 7

    • IHE JIZỌS NỌ N’ELU UGWU KỤZIE (1-27)

      • Kwụsị ikpe ikpe (1-6)

      • Na-arịọ, na-achọ, na-akụ aka n’ụzọ (7-11)

      • Na-emere ndị ọzọ ihe ị chọrọ ka e meere gị (12)

      • Ọnụ ụzọ ámá nke dị warara (13, 14)

      • E ji mkpụrụ ha amata ha (15-23)

      • Ụlọ a rụrụ n’elu oké nkume na ụlọ a rụrụ n’elu ájá (24-27)

    • Otú Jizọs si ezi ihe juru ìgwè mmadụ anya (28, 29)

  • 8

    • Jizọs gwọrọ onye ekpenta (1-4)

    • Onyeisi ndị agha nke nwere okwukwe (5-13)

    • Jizọs gwọrọ ọtụtụ ndị na Kapaniọm (14-17)

    • Otú e si eso ụzọ Jizọs (18-22)

    • Jizọs mere ka ebili mmiri dajụọ (23-27)

    • Jizọs gwara ndị mmụọ ọjọọ ka ha banye n’ime ìgwè ézì (28-34)

  • 9

    • Jizọs gwọrọ onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ (1-8)

    • Mgbe Jizọs kpọrọ Matiu (9-13)

    • Ajụjụ gbasara ibu ọnụ (14-17)

    • Ada Jaịrọs na otu nwaanyị nke bitụrụ uwe elu Jizọs aka (18-26)

    • Jizọs gwọrọ ndị ìsì na onye ogbi (27-34)

    • Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole (35-38)

  • 10

    • Ndịozi iri na abụọ (1-4)

    • Ntụziaka gbasara ikwusa ozi ọma (5-15)

    • A ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs (16-25)

    • Na-atụ Chineke egwu, atụla egwu mmadụ (26-31)

    • Iweta mma agha, ọ bụghị udo (32-39)

    • Ịnabata ndị na-eso ụzọ Jizọs (40-42)

  • 11

    • Jizọs toro Jọn Onye Na-eme Baptizim (1-15)

    • Jizọs kọchara ọgbọ na-egeghị ya ntị (16-24)

    • Jizọs toro Nna ya maka ịhọrọ ndị na-enweghị ihe ha bụ (25-27)

    • Yok Jizọs na-eme ka e nweta ume (28-30)

  • 12

    • Jizọs bụ “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike” (1-8)

    • Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ (9-14)

    • Ohu Chineke hụrụ n’anya (15-21)

    • Jizọs ji mmụọ nsọ chụpụ ndị mmụọ ọjọọ (22-30)

    • Mmehie nke a na-agaghị agbaghara (31, 32)

    • A na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla (33-37)

    • Ọrụ ebube a rụụrụ Jona (38-42)

    • Mgbe mmụọ ọjọọ lọghachiri ebe o si pụọ (43-45)

    • Nne na ụmụnne Jizọs (46-50)

  • 13

    • IHE ATỤ NDỊ GBASARA ALAEZE (1-52)

      • Ọgha mkpụrụ (1-9)

      • Ihe mere Jizọs ji eme ihe atụ (10-17)

      • A kọwara ihe atụ ọgha mkpụrụ (18-23)

      • Ọka wit na ata (24-30)

      • Mkpụrụ osisi mọstad na ihe iko achịcha (31-33)

      • Otú Jizọs si eji ihe atụ akụzi ihe mezuru amụma (34, 35)

      • A kọwara ihe atụ ọka wit na ata (36-43)

      • Akụ̀ e zoro n’ala na nkume pel mara mma (44-46)

      • Ụgbụ (47-50)

      • Akụ̀ ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie (51, 52)

    • Ndị obodo Jizọs anabataghị ya (53-58)

  • 14

    • E gbupụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim isi (1-12)

    • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke ise nri (13-21)

    • Jizọs jere ije n’elu mmiri (22-33)

    • Jizọs gwọrọ ndị ọrịa na Genesaret (34-36)

  • 15

    • Jizọs kwuru ihe dị njọ n’ọdịnala ndị Juu (1-9)

    • Ọ bụ ihe na-esi n’obi apụta na-emerụ mmadụ (10-20)

    • Nwaanyị Finishia nwere ezigbo okwukwe (21-28)

    • Jizọs gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa na ndị nwere nkwarụ (29-31)

    • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke anọ nri (32-39)

  • 16

    • Ụfọdụ gwara Jizọs ka o gosi ha ihe àmà (1-4)

    • Ihe iko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii (5-12)

    • Mkpịsị ugodi Alaeze eluigwe (13-20)

      • A rụrụ ọgbakọ n’elu oké nkume (18)

    • Jizọs kwuru na a ga-egbu ya (21-23)

    • Ihe e ji ama ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs (24-28)

  • 17

    • Jizọs nwoghara (1-13)

    • Okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad (14-21)

    • Jizọs kwukwara ọzọ na a ga-egbu ya (22, 23)

    • E ji mkpụrụ ego si n’ọnụ azụ̀ tụọ ụtụ isi (24-27)

  • 18

    • Onye kacha n’Alaeze eluigwe (1-6)

    • Ndị na-eme ka ndị ọzọ dapụ n’okwukwe (7-11)

    • Ihe atụ gbasara atụrụ kpafuru akpafu (12-14)

    • Otú mmadụ ga-esi rite nwanna ya n’uru (15-20)

    • Ihe atụ gbasara ohu na-agbagharaghị ohu ibe ya (21-35)

  • 19

    • Alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm (1-9)

    • Mmadụ ịhapụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye bụ onyinye (10-12)

    • Jizọs gọziri ụmụntakịrị (13-15)

    • Ajụjụ otu nwa okorobịa bara ọgaranya jụrụ (16-24)

    • Ịhapụ ihe ụfọdụ n’ihi Alaeze Chineke (25-30)

  • 20

    • A kwụrụ ndị rụrụ ọrụ n’ubi vaịn otu ihe (1-16)

    • Jizọs kwukwara ọzọ na a ga-egbu ya (17-19)

    • Nne ụmụ Zebedi rịọrọ Jizọs ka o nye ụmụ ya ọkwá n’Alaeze Chineke (20-28)

      • Jizọs nyere ndụ ya ka a gbapụta ọtụtụ mmadụ (28)

    • Jizọs gwọrọ ndị ìsì abụọ (29-34)

  • 21

    • Jizọs gbaara jakị banye Jeruselem ka eze (1-11)

    • Jizọs mere ka ụlọ nsọ dị ọcha (12-17)

    • Jizọs bụrụ osisi fig ọnụ (18-22)

    • A jụrụ Jizọs onye nyere ya ikike (23-27)

    • Ihe atụ gbasara ụmụ abụọ otu nwoke mụrụ (28-32)

    • Ihe atụ gbasara ndị ọrụ ubi gburu mmadụ (33-46)

      • Ndị mmadụ jụrụ nkume ji ụlọ (42)

  • 22

    • Ihe atụ gbasara oriri agbamakwụkwọ (1-14)

    • Chineke na Siza (15-22)

    • A jụrụ Jizọs ajụjụ gbasara mbilite n’ọnwụ (23-33)

    • Iwu abụọ kacha iwu niile (34-40)

    • Kraịst ọ̀ bụ nwa Devid? (41-46)

  • 23

    • Unu emela ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii (1-12)

    • Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ga-ata ahụhụ (13-36)

    • Jizọs beere Jeruselem ákwá arịrị (37-39)

  • 24

    • IHE ÀMÀ NKENỤNỌ KRAỊST (1-51)

      • Agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji (7)

      • A ga-ekwusa ozi ọma (14)

      • Oké mkpagbu (21, 22)

      • Ihe àmà Nwa nke mmadụ (30)

      • Osisi fig (32-34)

      • Otú ihe dị n’oge Noa ka ọ ga-adị (37-39)

      • Na-echenụ nche (42-44)

      • Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na ajọ ohu (45-51)

  • 25

    • IHE ÀMÀ NKENỤNỌ KRAỊST (1-46)

      • Ihe atụ gbasara ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke (1-13)

      • Ihe atụ gbasara talent (14-30)

      • Ewu na atụrụ (31-46)

  • 26

    • Ndị nchụàjà kpara nkata igbu Jizọs (1-5)

    • Otu nwaanyị wụrụ mmanụ na-esi ísì ọma n’isi Jizọs (6-13)

    • Ememme Ngabiga ikpeazụ na ịrara Jizọs nye (14-25)

    • Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị (26-30)

    • Jizọs kwuru na Pita ga-agọnahụ ya (31-35)

    • Jizọs kpere ekpere na Getsemeni (36-46)

    • Mgbe e jidere Jizọs (47-56)

    • Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe na Sanhedrin (57-68)

    • Pita gọnahụrụ Jizọs (69-75)

  • 27

    • E nyefere Jizọs n’aka Paịlet (1, 2)

    • Judas kwụgburu onwe ya (3-10)

    • Mgbe Jizọs guzo n’ihu Paịlet (11-26)

    • A kwara Jizọs emo n’ihu ọha (27-31)

    • A kpọgidere Jizọs n’osisi na Gọlgọta (32-44)

    • Mgbe Jizọs nwụrụ (45-56)

    • Mgbe e liri Jizọs (57-61)

    • E chesiri ili Jizọs nche ike (62-66)

  • 28

    • A kpọlitere Jizọs n’ọnwụ (1-10)

    • A kwụrụ ndị agha ụgwọ ka ha ghaa ụgha (11-15)

    • Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya (16-20)