Ozi Ọma Jọn Dere 20:1-31

  • Ili Jizọs gheere oghe (1-10)

  • Jizọs pụtara n’ihu Meri Magdalin (11-18)

  • Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya (19-23)

  • Tọmọs rụrụ ụka, mechaa kweta (24-29)

  • Ihe mere e ji dee akwụkwọ mpịakọta a (30, 31)

20  N’ụbọchị mbụ n’izu, Meri Magdalin bịara n’ili* ahụ n’isi ụtụtụ+ mgbe ọchịchịrị ka gbara. O wee hụ na a kwapụla nkume e ji dọchie ili* ahụ.+  Ọ gbaara ọsọ bịakwute Saịmọn Pita na onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye Jizọs hụrụ n’anya.+ O wee sị ha: “Ha ebupụla Onyenwe anyị n’ili,+ anyị amaghịkwa ebe ha dọsara ya.”  Pita na onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs wee gawa n’ili ahụ.  Ha abụọ malitere ịgba ọsọ. Ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs gbanahụrụ Pita wee buru ụzọ rute n’ili ahụ.  O hulatara lee anya n’ili ahụ ma hụ ákwà linin ndị ahụ ka ha wụsa n’ebe ahụ.+ Ma ọ banyeghị.  Saịmọn Pita, onye so ya n’azụ, rutekwara. O wee banye n’ili ahụ hụ ákwà linin ndị ahụ ka ha wụsa n’ebe ahụ.  Ákwà e kere Jizọs n’isi adịghị n’ebe ákwà ndị nke ọzọ dị, kama a fụkọtara ya dosa naanị ya iche.  Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye bu ụzọ rute n’ili ahụ, banyeziri. O wee hụ ma kwere.  Ma ha aghọtabeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke kwuru na Jizọs ga-esi n’ọnwụ bilie.+ 10  Ndị a na-eso ụzọ ya wee laghachi n’ụlọ ha. 11  Ma Meri guzo n’èzí n’akụkụ ili ahụ na-ebe ákwá. Ka ọ nọ na-ebe ákwá, o hulatara nyoba anya n’ili ahụ. 12  O wee hụ mmụọ ozi abụọ+ yi uwe ọcha ka ha nọ ọdụ n’ebe ozu Jizọs dịbu. Otu nọ n’ebe isi ya dịbu, otu anọrọ n’ebe ụkwụ ya dịbu. 13  Ha sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-ebe ákwá?” O wee sị ha: “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghịkwa m ebe ha dọsara ya.” 14  Mgbe o kwuchara ihe a, ọ tụgharịrị hụ Jizọs ka o guzo n’ebe ahụ, ma ọ mataghị na ọ bụ Jizọs.+ 15  Jizọs sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-ebe ákwá? Ònye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ubi ahụ, ọ sịrị ya: “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe ị dọsara ya ka m gaa buru ya.” 16  Jizọs sịrị ya: “Meri.” Nwaanyị ahụ tụgharịrị sị ya n’asụsụ Hibru: “Rabonaị!” (nke pụtara “Onye Ozizi!”) 17  Jizọs wee sị ya: “Ejidezila m n’ihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m,+ sị ha, ‘Ana m alakwuru Nna m+ na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.’”+ 18  Meri Magdalin bịara kọọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, sị: “Ahụrụ m Onyenwe anyị.” Ọ gwakwara ha ihe Jizọs gwara ya.+ 19  Mgbe chi jiwere n’ụbọchị ahụ, bụ́ ụbọchị mbụ n’izu, ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtara n’otu ụlọ ma kpọchie ọnụ ụzọ ya akpọchie n’ihi na ha na-atụ ndị Juu egwu. Ma, Jizọs bịara guzoro n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị unu.”+ 20  Mgbe o kwuchara ihe a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya.+ Ndị na-eso ụzọ ya wee ṅụrịa ọṅụ na ha hụrụ Onyenwe anyị.+ 21  Jizọs wee sị ha ọzọ: “Udo dịrị unu.+ Otú Nna m zitere m+ ka m na-ezigakwa unu.”+ 22  Mgbe o kwuchara ihe a, ọ fụrụ ha ikuku, sị ha: “Natanụ mmụọ nsọ.+ 23  Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharala ya. Ọ bụrụ na unu agbagharaghị onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharabeghị ya.” 24  Ma Tọmọs,+ otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, bụ́ onye a na-akpọ Ejima, esoghị ha nọrọ mgbe Jizọs bịara. 25  Ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs wee sị ya: “Anyị hụrụ Onyenwe anyị.” Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na ahụghị m apa ntu n’aka ya, rụnyekwa mkpịsị aka m n’apa ntu ndị ahụ nakwa n’akụkụ ya,+ agaghị m ekweta.” 26  Mgbe ụbọchị asatọ gachara, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ n’ime ụlọ, Tọmọs sokwa ha nọrọ. N’agbanyeghị na a kpọchichara ụzọ akpọchi, Jizọs bịara ma guzoro n’etiti ha, sị: “Udo dịrị unu.”+ 27  Ọ sịziri Tọmọs: “Rụnye mkpịsị aka gị n’aka m, werekwa aka gị tinye n’akụkụ m. Kwụsị ịrụ ụka,* kama kweta.” 28  Tọmọs wee sị ya: “Onyenwe m na Chineke m.” 29  Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ bụ maka na ị hụrụ m mere i ji ekweta? Ndị na-ahụghị ma kweta na-enwe obi ụtọ.” 30  N’eziokwu, Jizọs rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube* ndị ọzọ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị a na-edeghị n’akwụkwọ mpịakọta a.+ 31  Ma e dere ihe ndị a ka unu wee kwere na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, nakwa ka unu si n’aha ya nweta ndụ maka na unu kweere.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Na Grik, “Abụla onye na-anaghị ekweta ekweta.”
Na Grik, “mekwara ọtụtụ ihe àmà.”