Abụ Ọma 36:1-12

  • Ịhụnanya Chineke enweghị atụ

    • Onye ajọ omume anaghị atụ egwu Chineke (1)

    • Ọ bụ Chineke na-enye ndụ (9)

    • “Ọ bụ ìhè gị na-enye anyị ìhè” (9)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid ohu Jehova. 36  Ọ bụ ihe ọjọọ na-achị obi onye ajọ omume. Ọ naghị atụ egwu Chineke.+   N’ihi na onwe ya na-ebu ya isiNke na ọ naghị achọpụta ihe ọjọọ ọ na-eme, ọ kpọghịkwa ya asị.+   Ihe ọ na-ekwu n’ọnụ ya na-agbawa obi, na-eduhiekwa mmadụ. Ọ maghịzi otú e si eme ihe ọma.   Ọ na-anọdị n’elu àkwà* ya akpa nkata ọjọọ. Ọ na-eso ụzọ na-adịghị mma. Ọ naghị ajụ ihe ọjọọ.   Jehova, ịhụnanya gị* na-eru n’eluigwe.+ Ihe ọma ị na-eme na-eru n’ígwé ojii.   Ezi omume gị dị ka nnukwu ugwu.*+ Ihe ndị ị na-ekpebi karịrị akarị. Ha dị omimi ka ogbu mmiri.+ Jehova, ị na-echebe* mmadụ na anụmanụ.+   Chineke, ịhụnanya gị* enweghị atụ.+ Ọ bụ n’okpuru nku gị ka ndị mmadụ na-agbaba ka e chebe ha.+   Ha na-eri ihe ọma* ndị juru n’ụlọ gị, rijuo afọ.+ Ị na-emekwa ka ha rie ihe ọma ndị na-asọ ka mmiri.+   Ọ bụ gị na-enye ndụ.+ Ọ bụ ìhè gị na-enye anyị ìhè.+ 10  Biko, akwụsịla ịhụ ndị ma gị n’anya,+Na-egosikwa ndị obi ha dị ọcha na ị bụ onye ezi omume.+ 11  Ekwela ka ndị dị mpako zọọ m ụkwụ,Ekwekwala ka ndị ajọ omume kwapụ m. 12  Lee, ndị na-eme ihe ọjọọ adaala. A kụtuola ha, ha enweghịkwa ike ibili.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “na-azọpụta.”
Na Hibru, “ugwu Chineke.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “abụba.”