Abụ Ọma 127:1-5

  • E wepụ Chineke, ihe niile bụ n’efu

    • “Ọ bụrụ na Jehova arụghị ụlọ” (1)

    • Ụmụ bụ ụgwọ ọrụ Chineke na-akwụ (3)

Abụ Mgbago. Abụ Solomọn. 127  Ọ bụrụ na Jehova arụghị ụlọ,Ọ bụ n’efu ka ndị na-arụ ya na-arụsi ọrụ ike.+ Ọ bụrụ na Jehova echeghị obodo,+Ọ bụ n’efu ka onye nche na-amụ anya.   Ọ bụ n’efu ka unu na-ebili n’isi ụtụtụ. Ọ bụ n’efu ka unu na-amụ anya abalị. Ọ bụkwa n’efu ka unu na-arụgbu onwe unu n’ọrụ ka unu nweta ihe unu ga-eri,Ebe ọ bụ na ọ na-egboro ndị ọ hụrụ n’anya mkpa ha, na-emekwa ka ha hie ụra nke ọma.+   Lee, ụmụ* bụ onyinye si n’aka Jehova.+ Mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ Chineke na-akwụ.+   Ụmụ mmadụ mụrụ mgbe ọ bụ okorobịa+Dị ka akụ́ dike chị n’aka.   Onye ji ha kpojuo akpa akụ́ ya na-enwe obi ụtọ.+ A gaghị emenye ha* ihereN’ihi na ha* na ndị iro ha ga na-ekwurịta okwu n’ọnụ ụzọ ámá obodo.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụmụ nwoke.”
Ọ ga-abụ nna ha ka a na-ekwu.
Ọ ga-abụ ụmụ ha ka a na-ekwu.