Abụ Ọma 146:1-10

  • Tụkwasị Chineke obi, atụkwasịla mmadụ obi

    • Mmadụ nwụọ, ọ na-akwụsị iche echiche (4)

    • Chineke na-ekulite ndị ike gwụrụ (8)

146  Toonụ Jaa!*+ Ka m jiri obi m niile too Jehova.+   M ga-eto Jehova ná ndụ m niile. M ga-abụku Chineke m abụ otuto n’oge niile m dị ndụ.   Unu atụkwasịla ndị isi* obi,Unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.+   Ọ kwụsị iku ume, ọ na-alaghachi n’ájá.+ N’ụbọchị ahụ, ọ na-akwụsị iche echiche.+   Onye Chineke Jekọb na-enyere aka na-enwe obi ụtọ,+Bụ́ onye nwere olileanya n’ebe Chineke ya bụ́ Jehova nọ,+   Onye kere eluigwe na ụwa,Oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha,+Onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile,+   Onye na-ekpechitere ndị a na-erigbu erigbu ọnụ ha,Onye na-enye ndị agụụ na-agụ ihe oriri.+ Jehova na-atọhapụ ndị mkpọrọ.*+   Jehova na-emeghe anya ndị ìsì.+ Jehova na-ekulite ndị ike gwụrụ.+ Jehova hụrụ ndị ezi omume n’anya.   Jehova na-echebe ndị mbịarambịa. Ọ na-enyere nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ aka,+Ma ọ na-aghasasị atụmatụ ndị ajọ omume.+ 10  Jehova ga-abụ Eze ruo mgbe ebighị ebi,+Zayọn, Chineke gị ga-abụ Eze n’ọgbọ niile. Toonụ Jaa!*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “ndị a ma ama.”
Na Hibru, “ndị e kere agbụ.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.