Abụ Ọma 115:1-18

  • Naanị Chineke ka e kwesịrị ito

    • Arụsị adịghị ndụ (4-8)

    • E nyere ndị mmadụ ụwa (16)

    • “Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Jaa” (17)

115  Jehova, ọ bụghị anyị ka e kwesịrị ito, ọ bụghị anyị,*Kama ọ bụ aha gị ka e kwesịrị ịna-eto+N’ihi ịhụnanya gị* nakwa n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+   Gịnị mere ị ga-eji kwe ka mba dị iche iche sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+   Chineke anyị nọ n’eluigwe. Ọ na-eme ihe ọ bụla dị ya mma.   E ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ arụsị ha na-efe. Ọ bụ mmadụ kpụrụ ha.+   Ha nwere ọnụ, ma ha anaghị ekwu okwu.+ Ha nwere anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ.   Ha nwere ntị, ma ha anaghị anụ ihe. Ha nwere imi, ma ha anaghị anụ ísì.   Ha nwere aka, ma ha anaghị emetụ ihe aka. Ha nwere ụkwụ, ma ha anaghị aga ije.+ Ha anaghị eji akpịrị ha eme mkpọtụ ọ bụla.+   Ndị na-akpụ ha ga-adị nnọọ ka ha,+Ndị niile tụkwasịrị ha obi ga-adịkwa ka ha.+   Unu ndị Izrel, tụkwasịnụ Jehova obi.+ Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.+ 10  Ezinụlọ Erọn,+ tụkwasịnụ Jehova obi. Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu. 11  Unu ndị na-atụ egwu Jehova, tụkwasịnụ Jehova obi.+ Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.+ 12  Jehova na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị. Ọ ga-agọzi ezinụlọ Izrel.+ Ọ ga-agọzi ezinụlọ Erọn. 13  Ọ ga-agọzi ndị na-atụ egwu Jehova,Ma ndị ukwu ma ndị nta. 14  Jehova ga-eme ka unu dị ọtụtụ,Ma unu ma ụmụ unu.+ 15  Ka Jehova, Onye kere eluigwe na ụwa,Gọzie unu.+ 16  Ọ bụ Jehova nwe eluigwe,+Ma, o nyere ndị mmadụ ụwa.+ 17  Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Jaa.+ Onye ọ bụla nke na-agbada n’ili* anaghịkwa eto ya.+ 18  Ma anyị ga na-eto JaaMalite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonụ Jaa!*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “E nweghị ihe ruuru anyị, Jehova, e nweghị ihe ruuru anyị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “n’ebe a na-anọ duu.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.