Gaa n'Isiokwu

Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?

Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?

Ì chere na . . .

  • ọ ga-adịgide otú a ọ dị?

  • ọ ga-aka njọ?

  • ọ ga-aka mma?

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile dị ụmụ mmadụ n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.’—Mkpughe 21:3, 4.

OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?

Ị ga na-arụ ọrụ ị na-agaghị atakwute ájá, ị ga-arụpụtakwa ihe bara uru.—Aịzaya 65:21-23.

Ị gaghịzi na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-ata ahụhụ.—Aịzaya 25:8; 33:24.

Obi ga-adị gị na ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị ụtọ, unu agaghịkwa anwụ anwụ.—Abụ Ọma 37:11, 29.

Ì KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?

Ee. Lee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Chineke ga-emezuli nkwa o kwere. Ọ bụ naanị Jehova ka Baịbụl kpọrọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 15:3) Ọ bụ ya mere obi ji sie anyị ike na ọ ga-emerịrị ka ụwa anyị a ka mma otú ahụ o kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe niile kwere Chineke omume.”—Matiu 19:26.

  • Ọ na-agụ Chineke agụụ imezu nkwa o kwere. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.—Job 14:14, 15.

    Baịbụl kwukwara na mgbe Ọkpara Chineke bịara n’ụwa, ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ chọrọ. (Mak 1:40, 41) Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. Otú ahụ ọ chọrọ inyere ndị ụwa na-ara ahụ́ aka ka Nna ya chọkwara.—Jọn 14:9.

    Ọ bụ ya mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova na Jizọs chọrọ ime ka ihe dịrị anyị mma n’ọdịnihu.—Abụ Ọma 72:12-14; 145:16; 2 Pita 3:9.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Olee otú Chineke ga-esi eme ka ụwa anyị a ka mma?

Ị gụọ MATIU 6:9, 10 na DANIEL 2:44, ị ga-amata azịza ya.