Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Abụ Ọma 23:4​—“Asị na Ejem Ije na Ndagwurugwu Onyinyo Ọnwụ”

Abụ Ọma 23:4​—“Asị na Ejem Ije na Ndagwurugwu Onyinyo Ọnwụ”

 “Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị, agaghị m atụ egwu na ihe ọ bụla ga-eme m, n’ihi na ị nọnyeere m. Mkpara gị na mkpanaka gị na-eme ka obi sie m ike.”​—Abụ Ọma 23:​4, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Ọzọ, asị na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m’gagh-atụ egwu ihe ọjọ ọ bụla; n’ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n’aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.”​—Abụ Ọma 23:​4, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Abụ Ọma 23:4 a Pụtara

 Chineke na-echebe ma na-elekọta ndị na-efe ya, ma mgbe ihe siiri ha ike. N’amaokwu a, e ji otú onye na-azụ atụrụ si elekọta atụrụ ya tụnyere otú Chineke si elekọta ndị na-efe ya. b Ha anaghị eche na ọ bụ naanị ha nọ mgbe nsogbu bịaara ha. Ihe a kpọrọ nsogbu ndị ahụ n’amaokwu a bụ ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị, ya bụ, ihe nwere ike ịkpatara mmadụ ọnwụ. Ahụ́ na-eru ha ala, ya adị ha ka ọ̀ bụ ha na Chineke nọ mgbe ahụ.

 N’oge Baịbụl, onye na-azụ atụrụ na-eji mkpara ma ọ bụ okpiri echebe atụrụ ya ka anụ ọjọọ ghara ịdọgbu ha. Ọ na-ejikwa ogologo okpiri nwere nko edu atụrụ ya, na-ejikwa ya ekopụta nke ọ bụla chọrọ ịbanye ná nsogbu. Ọ bụkwa otú ahụ ka Jehova Chineke bụ́ Onye hụrụ ndị na-efe ya n’anya na-azụ ha ka atụrụ, na-echebe ha ma na edu ha. Ọ na-echebe ha n’ụzọ dị iche iche ọbụnadị mgbe o yiri ka nke ha na-eme ọ̀ gwụla.

Ihe Ndị Gbara Abụ Ọma 23:4 Gburugburu

 Ọ bụ Devid dere Abụ Ọma nke 23. Mgbe Devid bụ okorọbịa, ọ na-azụ atụrụ. O mechakwara bụrụ eze chịrị ndị Izrel n’oge ochie. (1 Samuel 17:​34, 35; 2 Samuel 7:8) Ihe o ji bido Abụ Ọma a bụ iji Jehova tụnyere onye na-azụ atụrụ. Ọ sịrị na Jehova na-edu ndị na-efe ya, na-elekọta ha ma na-eme ka ha nweta ume. Ọ bụkwa ihe ndị a ka onye na-azụ atụrụ na-eme.​—Abụ Ọma 23:​1-3.

 Mgbe Devid na-akọwa otú Jehova si echebe ndị ya n’Abụ Ọma 23:​4, ọ kwụsịrị ịsị (ya), ka ọ ghara ịdị ka ọ̀ bụ onye ọzọ ka ọ na-ekwu gbasara ya. Ọ sịwaziri (gị), nke mere ka ọ dị ka ọ̀ na-agwa Jehova okwu ihu na ihu. Ihe a na-egosi otú Devid na Jehova dịruru ná mma. Devid ma nnọọ nke ọma na Chineke na-eche gbasara ya, marakwa nsogbu ndị na-abịara ya. Ihe a mere ka ụjọ ghara ịna-atụ Devid.

 Devid gbanweziri ụkwụ egwú n’Abụ Ọma nke 23 amaokwu 5 na 6. Ọ kwụsịrị ikwu gbasara onye na-azụ atụrụ na atụrụ ya ma kwuwezie gbasara onye nwe ụlọ na ọbịa ya. Ebe ọ bụ na Jehova ma otú e si ele ọbịa nke ọma, o lekọtara Devid ka ọbịa pụrụ iche. Ndị iro Devid enweghịdị ike ime ka Chineke ghara ịna-elekọta ya. Okwu ndị Devid ji mechie Abụ Ọma a gosiri na obi siri ya ike na Chineke ga na-elekọta ya, hụkwa ya n’anya ná ndụ ya niile.

 Otú a Devid si jiri Jehova tụnyere onye na-azụ atụrụ na onye nwe ụlọ ma ele ọbịa nke ọma n’Abụ Ọma nke 23 na-egosi otú Chineke si elekọta ndị na-efe ya mgbe niile.​—1 Pita 2:25.

a N’ụfọdụ Baịbụl, e dere amaokwu a Abụ Ọma nke 22. Ọ bụ eziokwu na Abụ Ọma dị 150, ma otú e si dee nọmba ha abụghị otu na Baịbụl dị iche iche. Ụfọdụ ndị nsụgharị Baịbụl dere nọmba ha otú e si dee ha na Baịbụl Hibru ndị Masoret dere, ndị ọzọ ede ha otú e si dee ha na Baịbụl a na-akpọ Septuagint Grik. E dechara Baịbụl a na narị afọ abụọ Tupu Oge Ndị Kraịst.

b Na Baịbụl, a na-ejikarị Chineke, onye aha ya bụ Jehova, atụnyere ezigbo onye na-azụ atụrụ. A na-ejikwa ndi na-efe ya atụnyere atụrụ, n’ihi na ha na-atụkwasị ya obi na ọ ga na-echebe ha ma na-akwado ha.​—Abụ Ọma 100:3; Aịzaya 40:​10, 11; Jeremaya 31:10; Ezikiel 34:​11-16.