Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uru Ịmata na Chineke Hụrụ Gị n’Anya Ga-abara Gị

Uru Ịmata na Chineke Hụrụ Gị n’Anya Ga-abara Gị

Chineke kere ahụ́ anyị otú ọ ga-abụ anyị merụọ ahụ́, ya alaa. Otu ụlọ ọrụ a na-akpọ Johns Hopkins Medicine kwuru ihe na-eme mmadụ ma o merụọ ahụ́. Ọ sịrị: “Ahụ́ onye ahụ na-amalite ime ka ihe ahụ laa, ma ò buru ibu ma ọ̀ dị obere.” Mmadụ merụọ ahụ́, ahụ́ ya na-amalite ozugbo ime ka ọ kwụsị ịgba ọbara, mee ka ihu ọnyá kpọọ, ka ahụ́ ya ruchie, ọnyá ahụ alaakwa.

CHEGODỊ IHE A: Ebe ọ bụ na Chineke kere anyị otú ọ ga-abụ anyị merụọ ahụ́, ahụ́ anyị emee ka ọ laa, obi ó kwesịghị isi anyị ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere inyere anyị aka ichefu ihe ọ bụla na-egbu anyị mgbu n’obi? “Ọ na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” (Abụ Ọma 147:3) Ma, ọ bụrụ na o nwere ihe mere gị ugbu a ma ọ bụ n’oge gara aga ka na-ewute gị, gịnị ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ma ugbu a ma n’ọdịnihu?

BAỊBỤL NA-AKỤZI NA CHINEKE HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

Chineke kwere anyị nkwa, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.” (Aịzaya 41:10) Mmadụ mara na ihe banyere ya na-emetụ Jehova n’obi, obi na-eru ya ala, ọ na-enwekwa ume iji die nsogbu ndị na-abịara ya. Pọl onyeozi kpọrọ ụdị obi iru ala a “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” O kwukwara, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:4-7, 9, 13.

Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na nkwa ndị Jehova kwere na ọ ga-eme n’ọdịnihu ga-emezu. Dị ka ihe atụ, Mkpughe 21:4, 5 gwara anyị ihe ọ ga-eme na ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ọ ga-eme ya:

  • ‘Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile’ n’anya ụmụ mmadụ. Jehova ga-eme ka ahụhụ na nchegbu anyị niile kwụsị, ma ndị nke ndị ọzọ chere na o nweghị ihe ha bụ.

  • Eze Pụrụ Ime Ihe Niile, onye “nọ ọdụ n’ocheeze ahụ” dị ebube ga-eji ike ya mee ka ahụhụ niile kwụsị ma nyere anyị aka.

  • Jehova mesiri anyị obi ike na nkwa ndị o kwere “kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-emezu nkwa ya iji gosi na ọ bụ ya bụ ezi Chineke.

“‘Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.’ Onye ahụ nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ wee sị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” Ọ sịkwara: ‘Dee ha ede, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.’”—Mkpughe 21:4, 5.

Ihe ndị Chineke kere eke na ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị mata ụdị onye Nna anyị nke eluigwe bụ. Chineke chọrọ ka anyị si n’ihe ndị o kere eke mata ụdị onye ọ bụ, ma bụrụ enyi ya. O sikwa na Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ọrụ Ndịozi 17:27 kwuru, sị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”

Ka ị na-amatakwu onye Chineke bụ, ọ ga-edokwu gị anya na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Olee uru obi isi gị ike otú a ga-abara gị?

Legodị ihe mere otu nwoke onye Japan aha ya bụ Toru. Mama ya na-efe Jehova. Ma, Toru bara n’otu òtù ọjọọ a na-akpọ yakuza. Toru kwuru, sị: “Echere m na Chineke kpọrọ m asị, nakwa na ọ na-eji ọnwụ onye ọ bụla m ma, karịchaa nke ndị m hụrụ n’anya, ata m ahụhụ.” Toru kwuru na ihe a o chere na òtù a ọ nọ na ya mere ka “ya bụrụ onye obi tara mmiri.” O kwuru ihe o bubụ n’obi ime. Ọ sịrị: “M chọburu igbu onye a na-anụ aha ya karịa nke m, si otú a mee ka aha m dewe ude. M gbuchaa ya, mụ anwụọ.”

Ma, mgbe Toru na Hannah nwunye ya mụrụ Baịbụl, ọ gbanwere ụdị ndụ ọ na-ebi, gbanweekwa otú o si ele ihe anya. Nwunye ya kwuru, sị: “M hụrụ nnọọ otú di m si gbanwee.” Ugbu a, o doola Toru anya na Chineke akpọghị ya asị. O kwuru, sị: “E nwere Chineke, onye ihe banyere anyị na-emetụ n’obi n’eziokwu. Ọ chọghị ka onye ọ bụla nwụọ, ọ dịkwa njikere ịgbaghara onye ọ bụla ji obi ya niile chegharịa ná mmehie ya. Ọ na-ege anyị ntị ma anyị gwawa ya ihe anyị na-agaghị achọ ịgwa onye ọzọ, nakwa ihe ọ́ na-enweghị onye ọzọ ga-aghọta ya. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ nsogbu, ahụhụ, na ihe mgbu niile. Ọ na-enyedịrị anyị aka ugbu a n’ụzọ anyị na-atụghị anya ya. Ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi, ọ na-enyekwara anyị aka mgbe nsogbu bịaara anyị.”—Abụ Ọma 136:23.

Akụkọ Toru gosiri na ịmara na Chineke ga-emeli ka ahụhụ niile kwụsị, na ọ ga-eme ya n’oge na-adịghị anya, nakwa na ọ ga-ehicha anyị anya mmiri niile na-eme ka obi sie anyị ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ ga-emekwa ka anyị na-ebi ndụ dị mma ugbu a. N’eziokwu, Chineke ga na-enyere gị aka ma na-elekọta gị, ma n’ụwa a ahụhụ juru, n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya.