Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Jizọs?

Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Jizọs?

 Ee. Anyị kweere na Jizọs. Jizọs sịrị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Anyị kweere na Jizọs si n’eluigwe bịa n’ụwa, were ndụ ya zuru okè chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Matiu 20:28) Ọ bụ n’ihi àjà a Jizọs chụrụ nakwa n’ihi na a kpọlitere ya n’ọnwụ mere ndị nwere okwukwe na ya ga-eji nweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Anyị kwekwaara na Jizọs bụ Eze nke Alaeze Chineke ugbu a n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọchịchị ya ga-emekwa ka udo dịrị n’ụwa niile. (Mkpughe 11:15) Ma anyị kwetara ihe Jizọs kwuru na Jọn 14:28, bụ́ ebe ọ sịrị: “Nna m ka m ukwuu.” Ọ bụ ya mere anyị anaghị efe Jizọs n’ihi na anyị ma na ọ bụghị ya bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.