Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Achọtara M Akụ̀ nke Bụ́ Ezigbo Ya

Achọtara M Akụ̀ nke Bụ́ Ezigbo Ya
  • A mụrụ m n’afọ: 1968

  • Abụ m onye: Amerịka

  • Ndụ m biri: Abụ m o ji ego achụ ego. Ekpere m ekpere ịbụ

    aka ji akụ̀

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 A mụrụ m na Rochester nke dị na Niu Yọk. Anyị bụ ndị Katọlik. Ndị mụrụ m gbasara mgbe m dị afọ asatọ. N’ihi ya, m na-anọ na nke mama m si na Mọnde ruo Fraịdee, n’ebe ndị ogbenye bi. O ruo na Satọdee na Sọnde, mụ agaa na nke papa m, n’ebe ndị ọgaranya bi. Mgbe m hụrụ otú mama m si na-ata ahụhụ na-azụ ụmụ isii, ekpebiri m na m ga-abụ ọgaranya ka m nwee ike nyere ndị ezinụlọ anyị aka.

 Papa m chọrọ ka m bụrụ aka ji akụ̀. N’ihi ya, ọ haziri ka m gaa hụ otu ụlọ akwụkwọ a ma ama na-akụzi otú e si elekọta họtel na ndị ọbịa. Ihe m hụrụ ebe ahụ masịrị m, mụ edeba aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Echere m na Chineke na-aza m ekpere ahụ m kpere ka m bụrụ ọgaranya ma nwee obi ụtọ. Eji m afọ ise mụọ otú e si elekọta họtel, gụọkwa ihe gbasara iwu na azụmahịa. N’otu oge ahụ, anọ m na-arụ ọrụ n’otu họtel ebe a na-agba chaa chaa, dị na Las Vegas, nke dị na Nevada.

Otu n’ime ihe m na-arụ bụ ilekọta ndị bụ aka ji akụ̀ ndị bịara ịgba chaa chaa

 Mgbe m dị afọ iri abụọ na abụọ, abụ m onye na-enyere osote onyeisi na-elekọta otu họtel ebe a na-agba chaa chaa aka. Ndị mmadụ na-ele m anya ka ọgaranya na onye ihe na-agaziri n’ihi na m na-eri ezigbo nri, na-aṅụkwa mmanya ndị dara ezigbo oké ọnụ. Ndị mụ na ha na-achụkọ nta ego na-asịkarị, “Lekwasị anya n’ihe kacha mkpa n’ụwa a, ya bụ, ego.” N’uche ha, ego bụ isi ihe na-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ.

 Otu n’ime ihe m na-arụ bụ ilekọta ndị bụ ezigbo aka ji akụ̀, ndị bịara Las Vegas ịgba chaa chaa. N’agbanyeghị ego niile ha nwere, ha anaghị eyi ndị obi dị ụtọ. Obi ụtọ bịakwara kọwa m. Nke bụ́ eziokwu bụ na ka m na-akpatakwu ego, ka m na-echegbukarị onwe m, nke na anaghị m ehi ụra nke ọma n’abalị. Ebidodịrị m chewe echiche igbu onwe m. Mgbe ike ụwa bịara gwụ m, ekpere m ekpere jụọ Chineke, sị, “Olee ebe m ga-esi nweta ezigbo obi ụtọ?”

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 Ihe dị ka n’oge a ka ụmụnne m nwaanyị abụọ ghọrọla Ndịàmà Jehova kwafetara Las Vegas. Ọ bụ eziokwu na ajụrụ m ịnara akwụkwọ ha, ekwetara m ka mụ na ha na-agụkọ Baịbụl m. Na Baịbụl m, e dere okwu niile Jizọs kwuru ka ọ na-acha ọbara ọbara. Mgbe ụmụnne m nwaanyị abụọ a chọpụtara na m na-ekweta ihe ọ bụla Jizọs kwuru, ha bidoro ịkọwakwuru m ihe ndị Jizọs kwuru. Anọkwa m na-agụ Baịbụl m n’onwe m.

 Ọtụtụ ihe ndị m na-agụta juru m anya. Dị ka ihe atụ, Jizọs sịrị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.” (Matiu 6:7) N’agbanyeghị ihe a Jizọs kwuru, otu ụkọchukwu nyere m foto ebe e sere Jizọs ma gwa m kpee Nna Anyị Bi n’Eluigwe ugboro iri nakwa Ekeele M Marịa ugboro iri n’ihu foto ahụ. O kwuru na ọ bụrụ na m ekpegara foto ahụ ekpere, Chineke ga-enye m ego ole ọ bụla m chọrọ. Ajụrụ m onwe m, sị, Ọ bụrụ na m ana-ekwughachi otu ekpere ugboro ugboro, ọ̀ bụghị ya bụ ihe a Jizọs sị anyị emela? Agụkwara m ihe Jizọs kwuru, sị: “Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ, Onye nke eluigwe.” (Matiu 23:9) Nke a mekwara ka m chewe, sị, ‘Gịnịzi mere mụ na ndị Katọlik ibe m ji akpọ ndị ụkọchukwu anyị “Fada”?’

 Ọ bụ mgbe m gụrụ Akwụkwọ Jems na Baịbụl ka otú m si achụ akụnụba nke ụwa bidoro mewe m obi abụọ. Na Jems isi anọ ebe ahụ sịrị: “Ùnu amaghị na ịbụ enyi ụwa bụ ịbụ onye iro Chineke? Ya mere, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.” (Jems 4:4) Nke kadị ruo m n’obi bụ ihe amaokwu nke iri na asaa kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ maara otú ọ ga-esi mee ihe ziri ezi ma o meghị ya, ọ bụụrụ ya mmehie.” Akpọrọ m ụmụnne m nwaanyị abụọ ahụ ma gwa ha na m chọrọ ịkwụsị ọrụ ahụ m na-arụ na họtel ebe a na-agba chaa chaa. N’ihi na ọ na-eme ka m na-etinye aka n’ihe ndị m mụtarala na ha adịghị mma, ma ịgba chaa chaa na anyaukwu.

“Ọ bụ mgbe m gụrụ Akwụkwọ Jems na Baịbụl ka otú m si achụ akụnụba nke ụwa bidoro mewe m obi abụọ”

 Achọrọ m ka mụ na Chineke dịwakwuo ná mma, chọọkwa ka mụ na ndị mụrụ m na ụmụnne m na-adịkwu ná mma. Ekpebiziri m na m ga-akwụsị ihe ụfọdụ m na-emebu ka m nwee ike na-enwekwu ohere. Ma ime ihe ndị a m kpebiri adịghị mfe. Dị ka ihe atụ, a kpọrọ m ka m bịa rụọ ọrụ ndị ọzọ gaara eme ka m gbagotekwuo n’ọrụ họtel na ịgba chaa chaa. A chọkwara ịkwụ m ihe karịrị ihe a na-akwụbu m okpukpu abụọ ma ọ bụ atọ. Ma mgbe m kpechara ekpere banyere ya, ekpebiri m na agaghịzi m ebi ụdị ndụ ahụ ọzọ. Akwụsịrị m ọrụ m, kwaga n’ebe mama m bi. Arụgharịrị m ebe mama m na-adọwa ụgbọala ma birizie ebe ahụ. Ebidoro m ịrụ otu obere ọrụ. M na-ebipụtara ndị na-ere nri akwụkwọ ha ji akọwara ndị ahịa ha nri ndị ha nwere.

 N’agbanyeghị na Baịbụl enyerela m aka ịma ihe ndị ka mkpa ná ndụ, ekweghị m aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ụmụnne m ndị nwaanyị ahụ jụrụ m ihe mere m ji agbara Ndịàmà Jehova ọsọ. Ihe m zara ha bụ: “Ọ bụ n’ihi na Chineke unu bụ́ Jehova na-ekewa ezinụlọ. Naanị mgbe m na-enwe ohere mụ na ndị ezinụlọ anyị ji anọrị bụ n’oge Krismas nakwa oge e ji echeta ụbọchị ọmụmụ mmadụ. Unu anaghị emekwanụ ihe ndị a.” Otu nwanne m nwaanyị malitere ibe ákwá ma jụọ m, sị: “Ebee ka ị nọ n’oge ndị ọzọ n’afọ? Anyị chọrọ ka anyị na-ahụ gị mgbe niile. Ma naanị mgbe ị chọrọ ka anyị na gị na-ahụ bụ mgbe e nwere ememme a na-eme. Ihe mekwaranụ i ji abịa mgbe ahụ bụ ka i mezuo iwu.” Ihe ahụ o kwuru ruru m n’obi, mụ esorokwa ya bewe ákwá.

 Ozugbo m ghọtara otú Ndịàmà Jehova si hụruo ndị ezinụlọ ha n’anya, ghọtakwa na amaghị m ihe m na-ekwu mgbe ahụ, ekpebiri m na m ga-aga ọmụmụ ihe ha n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè anyị. N’ebe ahụ ka m hụrụ Kevin, otu nwoke maara otú e si akụzi Baịbụl nke ọma, mụ na ya bidokwara ịmụ Baịbụl.

 Kevin na nwunye ya anaghị ebi ndụ gbalụ gbalụ, ha mere ka ndụ ha dị mfe ka ha nwee oge buru ibu ha ga-eji na-akụziri ndị ọzọ Baịbụl. Ha na-akpata ego na-ezuru ha ime ihe ndị dị ha mkpa ma nke ha na-eji aga Afrịka nakwa n’Ebe Ndịda Kọntinent Nọt Amerịka, ebe ndị ha na-enye aka na-arụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ha na-enwe nnọọ obi ụtọ mgbe niile, ha bụkwa di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya. Ihe m na-eche n’obi m bụ, ‘M ga-achọ ka ndụ m dị ka nke ndị a.’

 Kevin gosiri m otu vidio kọrọ gbasara obi ụtọ ndị gara ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ na-enwe. Nke a mekwara ka m kpebie ịga obodo ọzọ gaa kwusaa ozi ọma. N’afọ 1995, mgbe a mụụrụ m Baịbụl ruo ọnwa isii, e mere m baptizim iji gosi na mụ aghọọla Onyeàmà Jehova. Kama ịrịọ Chineke ka o mee ka m bụrụ ọgaranya, ebidoziri m ịrịọ ya, sị: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba.”​—Ilu 30:8.

URU NDỊ M RITERELA

 Abaala m ọgaranya nke ezigbo ya ugbu a. Ọ bụghị ọgaranya nke inwe akụnụba, kama abara m ọgaranya n’ime Chineke. Ahụrụ m ọmarịcha nwunye m bụ Nuria na Họnduras. Mụ na ya ekwusaakwala ozi ọma na Panama nakwa na Meksiko dị ka ndị ozi ala ọzọ. Ihe ahụ Baịbụl kwuru bụ nnọọ eziokwu: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya”!​—Ilu 10:22.